Ada Palm Palm oil: Adapalm, ogige ọrụ ubi nwere osisi nkwụ karịrị 640,000

AdaPalm bụ aha ịchafụ nke ezigbo aha ya bụ 'Agricultural Development Authority Palm'.
Ọ bụ ogige buru nnukwu ibu ebe a na-emepụta mmanụ nri.
Osisi nkwụ a kụrụ n'ogige a karịrị puku narị isii na iri anọ na ụma.
Ọ bụrụ na ogige a na-arụ ọrụ etu o kwesịrị, ndịọrụ ya ga-eru ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ.
Mana kedu etu ọnọdụ AdaPalm dị ugbua?
Lee ihe BBC Igbo chọpụtara oge anyị gara ebe ahụ.
Ndị mere akụkọ a bụ Ikechukwu Kalu, Nnamdi Agbanelo na Adline Okere.





