Anambra Airport, ọrụ Ngozi Okonjo-Iweala na ihe ọma ndị ọzọ meere ndị Igbo n'afọ 2021

Ngozi Okonjo-Iweala na Ọdọụgbọelu Anambra steeti

Ebe foto si, Getty Images/BBC

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

2021 bụ afọ dị ime, kwọrọ ọtụtụ umu, dịka emume nọ na-eme ebe niile i lere anya.

Dịka a na-achụ afọ taa bụ 31 Disemba, lee ụfọdụ ihe ọma meere ndị Igbo n'afọ a, n'etiti akụkọ ọjọọ nọ na-arị ibe ya elu.

Mgbape ọdọụgbọelụ n'Anambara steeti:

Aha onyonyo, Anambra State Airport: N'Aba ka e si nweta ngwa ọrụ e ji rụọ ọdọụgbọelu a

Mgbape 'Anambra International Cargo Airport' bụ akụkọ ọṅụ ya ndị Anambara na ndị Igbo niile dịka nke a pụtara na ndị mmadụ nwereike isi Anambara steeti mee njem ụgbọelu.

Nke a ga-akwalite azụmahịa, ime njem na akụnaụba ndị mmadụ n'ala Igbo dịka ihe bụ ihe e ji mara ndị Igbo.

Dịka gọọmentị steeti ahụ si kwuo, mgbape ọdọụgbọelu Anambra a ga-enye ọtụtụ ndị mmadụ ọrụ dịka ya bụ ụlọọrụ buru ibu ma nwee ọtụtụ ngalaba.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ndebanye aha Anambara steeti dịka steeti ebe a na-egwupụta mmanụ agbịdị:

Mmanụ agbịdị bụ ọnatarachi ala Naijịrịa ji eme ọnụ na mbaụwa.

Anambara steeti natara ikike isonye na steeti ebe a na-egwupụta mmanụ agbịdị na Naijịrịa n'ọnwa Sepụtemba nke afọ 2021.

Ugbua, Anambara steeti ga na-erite pasentị 13 bụ uru ahịa mmanụ agbịdị e gwupụtara na steeti ahụ.

Atụmatụ a ga-akwalite mmepe obodo, akụnụba na ọganihu ndị mmadụ n'Anambra steeti nakwa ala Igbo niile.

Ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti:

Mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti
Nkọwa foto, Anambra Election Inec Result Update: APGA emeriwala na 4 n'ime okpuruọchịchị 21 n'Anambra

Ka ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti si gaa bụ ihe ịtụnaya nye ọha dịka steetị ahụ so n'ebe oke ogbugbu mmadụ na ọtụtụ ọgbaghara na mwakpo mere n'afọ a.

Ntuliaka a gara n'udo dịka Gọọmenti Etiti na nke steeti ahụ jịkọrọ aka ọnụ, foro ntutu taa dịka ha hiwere usoro nchekwa ma kwalite mmụọ ndị mmadụ ka ha pụta tuo vootu ha.

Cheta na otu 'Indigenous People of Biafra (Ipob) tiburu iwu ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ ma hapụ ịpụta mee ntuliaka.

Na-agbanyeghi na ha mechara kagbuo ya bụ iwu, ụjọ ya bụ iwu na mwakpo nwere ike iso ya dajụrụ mmụọ ụfọdụ ndị mmadụ ịpụta tụọ vootu.

Cheta na ọtụtụ mwakpo so iwu ịnọ n'ụlọ nke otu a tiri ma kagbuo, nke a na-eme n'ala Igbo niile kwa Mọnde n'izu.

Mwakpo a gụnyere mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii, mwakpo ụlọọrụ ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Inec n'ịchafụ, mwakpo ụlọ na ntọrọ ndị Eze odinala, mwakpo ndị mmadụ na ụlọahịa ha wdgz.

Mmachi ịch ehi n'wụwa Anyanwụ:

ọchị ehị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E gbuola ọtụtụ mmadụ n'ọgụ dị n'etti ndị ọchị ehị na ndị ọrụ ugbo

Ịchị ehi n'akụkọ ala Naijịrịa dị iche iche na-akpalite ọtụtụ esemokwu na ọgbaghara n'etiti ndị obodo na ndị ọchịehi dịka kwa mgbe, kwa mgbe, ehi a na-achị na-atabisi ma kwapịasịa ugbo ndị mmadụ n'obodo.

Otu gọvanọ ndịda Naijirịa niile jịkọrọ aka ọnụ machie ịchị ehi agagharị na mpaghara ha, nke ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ niile so binye aka.

Mmachi a nyere ọtụtụ ndị Igbo ọṅụ dịka nke a pụtara ọgbaghara na nsogbu niile na-eso ịchi ehi n'Ọwụwa Anyanwụ ga-ebelata nke ukwu.

Bido n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Sepụtemba 2021, gọvanọ Ọwụwa Anyawụ dị iche iche mmachiri atụmatụ iche ehi maka ọdịmma ndị Igbo.

Ihe ọma mere ụfọdụ ndị Igbo a ma ama n'afọ a:

Nhọpụta Ngozi Okonjo-Iweala dịka onyeisi ụlọọrụ World Trade Organisation (WTO):

Ngozi Okonjo-Iweala

Ebe foto si, Getty Images

N'ọnwa Maachị nke afọ a, a họpụtara nwaada Igbo bụ Ngozi Okonjo-Iweala dịka onyeisi ụlọọrụ World Trade Organisation (WTO).

Nzọta oche a mere Okonjo-Iweala nwaanyị mbụ nakwa onye Afrịka mbụ na-azọta ya bụ oche.

Akụkọ a bụ ihe ọṅụ bụrụkwa ihe ndị Igbo jiri mee ọnụ dịka nwaada Okonjo-Iweala nyere ala Igbo ezi aha n'ihu mbaụwa.

MbịaghachP-square:

P-Square

Ebe foto si, Psquare-Instagram

Ndị otiegwu abụọ a bụ ụmụ Igbo e ji eme ọnụ na mbaụwa niile.

O teela aka ndị mmadụ na-atụ anya na ụmụejima otiegwu a ma ama bụ Paul na Peter Okoye ga-abịaghachi azụ ọzọ dịka ha seburu okwu ma kewaa.

Olileanya ndị mmadụ bịara na mmezu n'ọnwa Nọvemba 2021, dịka ụmụnne abụọ a kwere ijikọ aka tiputewe egwu ka ọ dị na mbụ.

Akụkọ a bụ ihe ọṅụ nye ọha na-eso egwu ha, ọkachasi ndị Igbo dịka mbịaghachi a ga-aga n'ihu nye ndị Igbo aha ọma n'ihu ọha. Psquare gara n'ihu rịọ ọha mgbaghara maka etu ha si see okwu ma mechuo aha ezinaụlọ ha na soshal midia n'oge gara aga, n'emume ha mere n'ọnwa Disemba. Amaghị ụbọchị o mere kpọmkwem mana ihe onyonyo gosiri ebe ha na-amakụ onwe ha malitere ifesa n'ọnwa Nọvemba, 2021.

Mmeri Whitemoney n'asọmpi Big Brother Nigeria Season 6:

Aha onyonyo, Whitemoney Interview: Ya bụrụ na nna m agbapụghị hapụ anyị, agaghị abụ ihe m bụ taa

Asọmpi Big Brother Nigeria so n'otu n'ime ejije akacha elele na Naijịrịa nakwa n'ọtụtụ mba Afrịka dị iche iche.

Whitemoney nke ezigbo aha ya bụ Hazel Oyeye Onou, meriri n'ọnwa Ọktoba 2021, mmeri ya nyere ọtụtụ ndị Igbo ọṅụ dịka ya bụ nwaamadị kwalitere ezi aha nakwa omenala ndị Igbo mgbe ọ nọ n'ụlọ ya bụ asọmpi.

Whitemoney ritere ego ruru nde iri itoolu, ụgbọala nakwa onyinye na ihe nrite ndị ọzọ mgbe o meriri.