Anambra state Airport: Gọọmentị etiti enyela ọdọugboelụ Anambra ikike ife ụgbọelu ukwu nke Boeing 737-700

Nke mere taa bụ Tuzde ụbọchị iri abụọ na anọ nke Jenuwari bụ na gọọmenti etiti site n'aka ụlọọrụ Nigerian Civil Aviation Authority (NCAA) enyela ọdoụgbọelu Anambra steeti ikike ife ụgbọelu Boeing 737- 700 ebe maọbụ nke nyiri ya ebe ahụ.
Ndị ọrụ a zigaara Gọvanọ steeti ahụ bụ Willie Obiano ozi a site na-akwụkwọ ha degara ya taa bụ 24 nke ọnwa Jenụwarị, 2022.
Nke sitere na nnyocha ndị ọrụ NCAA mere n'ụbọchị iri abụọ na otu ọnwa Jenụwarị bụ ebe ha hụrụ na ya bụ ọdọụgbọelu tozuru ibugo site na ogogo nke Cat 5 ruo nke Cat 6.
Nke a ga-emezi ka nnuukwu ụgbọelụ na-adazị na ya bụ ọdọụgbọelu.
Gịnị bụ Boeing 737?
Boeing 737 bụ ọrụaka ndụ Boeing na-enwe mpịampịa ahụ na-adịkwa ogologo.
Ebe a rụrụ ya bụ n'Ụlọọrụ ndị Boeing dị na Renton na Washington.
Ugboelu a bụ nke tọrọ 727 a rụrụ ya ha ọ na-efe ebe eteghịaka.
Mgbe mbụ e chetere echiche ya bụ n'afọ 1964.

Ebe foto si, Reuters
Mgbe mbụ o fere bụ n'afọ 1967, malite ọrụ na Lufthansa na Febuwarị 1968.
Ọ nwere ụdị anọ nke gosiri mmadụ ole ọ ga-ebuli, site na mmadụ 85 ruo 215.
Nke ọ tọrọ bụ nke a kpọrọ 737 Max
Ruo na ọnwa Disemba 2021, a kwụọla ụkwọ Boeing 737 dị 15,015.
Boeing 737 dị 10,877 e ruola ndị kwụrụ ọgwọ ha aka.
Ọ bụ ya bụ ụgbọelụ kacha ere ahịa ewezụga Airbus A320 na ndị otu ya.
Lee foto ndị gosiri etu ime ọdọụgbọelu Anambra dị
BBC Igbo gara n'ime ọdọụgbọelu Anambra steeti a rụrụ ọhụrụ iji sete foto ọnọdụ ya ugbua.
Foto ndị ahụ gosiri na a rụchaala ọtụtụ mpaghara n'ime ya bụ ọdọụgbọelu.
Ụfọdụ ndị mmadụ bịakwara isi ebe ahụ eme njem n'ụbọchị 30 nke ọnwa Ọktoba, mana ndị na-ahụ maka nhazi njem na Naịjiria enyeghi ikike ka a malite njem ebe ahụ ụbọchị ahụ.
Lee foto ndị gosiri ime ya bụ ọdọụgbọelu:





Ihe mere ụgbọelu agaghị efetu n'ọdọụgbọelu Anambra taa

Ngalaba na-elekọta ọdọụgbọelu bụ Federal Airports Authority of Nigeria (Faan) nakwa nke na-ahazị njem ụgbọelụ bụ National Emergency Management Agency (Nema) akagbuola mmalite njem ụgbọelu n'ọdọụgbọelu Anambra steeti taa.
Nkọwa ha nyere ha ji mee nke a bụ okwu nchekwa nke ọnọdụ ya na-akawanye njọ n'Anambra steeti.
Otu onye ọrụ AirPeace gwara onye ntaakụọ anyị nọ ebe ahụ na ọ bụ kemgbe ụtụtụ ka ha na-eche ikike ịfepụ Legọs nakwa Abuja n'aka ngalaba FAAN na NEMA.
Ha sị na Gọvanọ Anambra bụ Willie Obiano kwere ha nkwa na ọ ga-agba mbọ nye aka nweta ikike ahụ mana ọ bịaghizi na mmezu.

Nke a pụtara na ụgbọelu abụọ bu ndị njem dị na Legọs na Abuja agaghị efepụ bịa Anambra ma burukwa ndị njem nọ n'Anambra laghachi.
Gọvanọ Willie Obiano n'onwe ya kwesiri iji ụgbọelu nke ya bata n'ọdọụgbọelu ahụ mana nke ahụ agaghị eme dịka FAAN enyeghị ikike ụgbọelụ ọbụla ịfetu n'Anambra.









