Peter and Paul Okoye: Ihe Anita Okoye sị na ya mụtara n'esemokwu nakwa mkpezi ụmụ ejima a

Anita Okoye

Ebe foto si, Instagram/ Anita Okoye

Nkọwa foto, Peter, Paul na Anita Okoye
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dika ọtụtụ mmadụ ka na-enwe aṅụrị maka etu Paul na Peter Okoye nke otu egwuregwu Psquare siri kpezie esemokwu ha sere ruo afo isi, nwunye Paul bu Anita Okoye etinyela ọnụ na ya bụ okwu.

Anita Okoye, site n'ihe o dere n'akara Instagram ya, siri n'obi dị ya aṅụrị site n'etu di ya na ejima ya siri kpesie.

Ọ sị na ya na-ekele ha site n'etu ha "ejighi mee ya ka ọ họrọ onye ọbụla" dịka esemokokwu a na-aga n'ihu.

Mana, okwu ọkpụrụkpụ o kwuur ndi mmadụ na-asi kacha nke bụ ndụmọdụ o nyere bu ihe ọ sị na ndị mmadụ kwesiri ịmụta site n'ihe mere n'eteti ụmụ ejima a.

Ọ sị: "Anwakana anwa tinye onweghi na nsogbu agbasaghị gị."

Ọ gakwara n'ihu kwuo si: "E kwekwala ka soshal midia na echiche ndị onweghị ihe ha pụtara gị bụrụ ihe na-ekwu ọnọdu gị!"

Nkwuchapụ okwu ya bụ "ka Chukwu duo gị"

Paul na Peter Okoye

Ebe foto si, Instagram/Paul and Peter Okoye

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị 17 nke ọnwa Nọvemba ka onyonyo pụtara gosiri na ọ dị ka ofe dị ọkụ ejuola oyi n'ezinụlọ ndị be Okoye.

Onyonyo a gosiri Peter na Paul Okoye, ụmụ ejima mezuru otu egwu e ji 'Psquare' mara, ka a nọ na-amako onwe ha dịka ndị mmadụ na-akụ aka na-akwa enwe aṅụrị.

Onyonyo ahụ gosikwara nwanne ha nwoke bụ Jude Okoye nakwa wụnye Peter bụ Lola Okoye.

Ihe mere na be ndị otu egwu a bụ ihe ịtụ n'anya dịka ahụbeghị ha abụọ ka nọkọ dịka nwanne kemgbe ọgụ na mgba batara n'etiti ha n'afọ 2017.

Ọ na-egozi na bụ eziokwu na edozila esemokwu ha gbarala ihe ruru afọ anọ ugbua?

Ihe onyonyo a gosiri ka ha kwere onwe ha n'aka ma bie onwe ha ọma, ndị nọ ebe ahụ gosiri obi ụtọ ha maka nke a, nke gụnyere nwanne nwoke bụ Jude Okoye. Ọṅụ na anụrị juru mmadụ niile nọ n'ihe onyonye ahụ ọnụ.

Tupu ihe onyonyo a apụta, e nwere ihe ndị ọzọ ruturu aka na ha abụọ nwela ike ikpezi esemokwu ha.

Aha onyonyo, Ego adịghị mgbe anyị na-eto- Paul Okoye

N'izu gara aga, a hụrụ na ha abụọ sochiri onwe ha azu n'akara soshal midia ha, nwụnye Paul bụ Anita kesara ihe onyonye gosiri Peter ebe o dugara ụmụ Paul (nwanne ya) ụlọahịa.

Paul n'onwe ya kelekwara Peter na Lola dika ha na-eme ncheta agbamnkwụ ha.

Nke a turu ọha n'anya dịka kemgbe afọ 2017 ha abụọ kwụsiri isi otu ụzọ.

Cheta na esemokwu ha bụ ihe dara ụda n'oge ahụ dịka kwa mgbe kwa mgbe ha si n'ụzọ soshal midia ha kọọ onwe ha ọnụ ma gba ihe bụ iwe ha nye ibe ha n'anwụ.

Nke gụnyere ihe onyonyo gosiri ebe ha abụọ nọ n'ụlọ otu ọkaiwu ha na-akọ ọnụ ma na-akụ ọkpọ.

Ihe onyonyo a pụtara na soshal midia n'ụbọchị Wenzde pụrụiche dịka ọ zara ajụjụ niile ndị mmadụ n'ajụ kemgbe Anita kesara ihe onyonyo nke ya n'izu gara aga ma "agha ebiela n'etiti Peter na Paul nwanne ya?"

Oti egwu a ma ama bụ J Martins pụtakwara n'onyonyo were gụọ ọfọ maka etu ụmụnne abụọ a jiri tufuo esemokwu dị n'etiti ha.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Mkpezie a n'abịa dịka ụmụ ejima gbara afọ 40 taa bụ ụbọchị iri na asato nke ọnwa Nọvemba 2021.