Mmọnwụ Ijele: Ihe mere e ji akpọ ya nnukwu mmọnwụ
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
N'ala Igbo, ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụ mmọnwụ Ijele dịka mmọnwụ kachasị ibe ya. A na-ahụ ya dịka nke nwere ugwu ebe ndị ọzọ na-ahụ ya dịka nnukwu mmọnwụ.
Ijele abụrụla otu mmọnwụ e ji maara ndị Igbo ma bụrụkwa mmọnwụ a ma ama na-ewu ewu na Naịjirịa.
Mana n'ime akụkọ a anyị ga-entinye anya n'ihe dị iche iche ndị mmadụ na-amaghị maka Ijele, nke ndị na-eso mmọnwụ a maara.
Otu nwoke na-eso mmọnwụ Ijele bụ Anayochukwu George Agboko gwara BBC Igbo na e nwere ọtụtụ uru ha na-erite n'iso mmọnwụ Ijele dịka ndị na-etipụta ya.
Ijele bụ mmọnwụ ka ibe ya n'ala Igbo - Agboko

Ebe foto si, Enugu state tourism board / facebook
Anayochukwu George Agboko kwuru na ihe mere mmọnwụ ijele ji kara ibe ya ndị ọzọ gụnyere etu ọ ha n'ukwuu nakwa ụdịrị agwa dị iche iche e ji etipụta ya.
N'okwu ya "i lee anya ị ga-ahụ na ijele ka mmọnwụ ndị ọzọ"
"Ijele pụta n'ọgbọ ị ga-ahụ na ụdịrị egwu ọ na-agba na-adị iche".
Ọ kwuru na ebe ọbụla Ijele gara mara na ọ bụ nnukwu mmọnwụ gara ebe ahụ.

Ebe foto si, Enugu state government house
kedụ obodo mbụ tipụtara mmọnwụ Ijele?
Agboko kwuru na ọ bụrụ na a chọwa obodo mbụ tipụtara mmọnwụ Ijele n'ala Igbo na anya kwesịrị ịgawa n'ebe Aguleri maọbụ Umuleri dị n'Anambra steeti.
Ọ sị na ọ bụ na mpaghara ahụ ka ọ maara dịka ndị na-eti mmọnwụ Ijele tupuu o ruo Enugwu.
"Ọ bụ ndị Anambra na Enugwu ka e ji mmọnwụ Ijele mara".
Uru m na-enweta n'iso mmọnwụ Ijele
Anayochukwu George Agboko gụpụtara uru dị iche iche ha na-erita n'iso mmọnwụ Ijele dịka ndị na-etipụta ya.
Uru ndị ahụ gunyere:
- Iso mmọnwụ ijele na-enye anyị obi aṅụrị
- Ijele na-eme ka anyị hụụ ụzọ maọbụ mara ndị mmadụ
- Ijele na-adata ego (anyị bụ ndị na-eso ya na-eji ego Ijele datara na-eri nri ma na-egbo mkpa anyị)
Ihe ndị ọzọ gbasara mmọnwụ Ijele
Anayochukwu George Agboko kwuru na ndị mmadụ kwesịrị ịma na "Ijele bụ mmụọ ndị nnanna oche nwụrụ anwụ".
Ijele abụghị mmọnwụ nkịtị, ọ bụ mmụọ ndị ochie"
Ọ bụghị mmadụ niile na-ahụ mmọnwụ ijele tupuu etipụta ya (ya bụ ị hụụ ya n'ọtọ).
"Igwe mmadụ na-ahụ Ijele na ọ kwadocha pụta mana o nwere ndị na-ahụ ya tupuu etipụta n'ọgbọ"
"Ọ bụrụ na mmadụ etozughi ihe e ji nwoke eme, ọ gaghị abanye ebe Ijele nọ"
Agboko gara n'ihu kwuo na e nwere ihe mmadụ ga-eme tupuu o nweike ịhụ mmọnwụ Ijele tupuu etipụta ya n'ọgbọ.
Ọ sị na ihe ndị ahụ gụnyere mmadụ ịba n'otu ọgbọ n'obodo ya nakwa na onye ahụ ga-eru afọ iri abụọ ma baa mmọnwụ oge ndị ọgbọ ya na-aba mmọnwụ".
"Onye na-abanyeghi na mmọnwụ agaghị abanye n'ebe a na-etipụta mmọnwụ Ijele".



