Ihe anyị hụrụ n'ebe ọkụ gbara n'ahịa Alaba International

Ihe anyị hụrụ n'ebe ọkụ gbara n'Alaba International Market
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Dịka ọkụ gbachara ụlọahịa ndị mmadụ n'Alaba International Market, BBC Igbo gara hụta etu ọnọdụ ndị ọ metụtara si dị.

N'oge anyị ruru ebe ahụ ka anyị chọpụtara na Gọọmenti Legọs steeti amachiela mpaghara ahịa gbara ọkụ, ma gwa ndị niile na-ere ahịa ebe ahụ ka ha kwapụ.

BBC Igbo chọpụtara na ụlọahịa ahụ ọkụ gbara dị ogogo abụọ mana ọkụ gbara naanị ndị nke nọ n'elu.

Ọzọ bụ na ọkụ emetụtaghị ụlọahịa ndị nọ n'ala nakwa n'ogogo nke mbụ.

N'agbanyeghị na ọ bụ naanị ndị nọ n'elu ụlọ ahụ ka ọkụ gbara ụlọahịa ha, gọọmenti gwara onye ọbụla kwara pụọ.

Ọzọ bụ na ndị niile jiri ụlọ ahụ mere ọdọahịa maọbụ ebe ha na-echekwa ngwaahịa akwapụla ebe ahụ ugbua.

Mbọ niile anyị gbara ka ndị ọkụ gbara ụlọ ahịa ha kwuo okwu tupu akụkọ a apụta amịtaghị ezi mkpụrụ.

Cheta na ọ bụ n'abalị Tuzde 21 Ọktoba 2025 ka ọkụ gbara ụfọdụ mpaghara ahịa Alaba International Market a maara nke ọma maka ngwaahịa eletrọnik, oche na ihe ndị e ji ewu ụlọ.

Ihe anyị ma gbasara ọkụ gbara n'ahịa Alaba International dị na Legọs

Oge ọkụ na-agba n'ụfọdụ mpaghara ahịa Alaba International dị na Legọs steeti

Ebe foto si, Screenshot

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọkụ agbaala ụfọdụ mpaghara ahịa a ma ama na Legọs steeti bụ Alaba International Market.

Onyonyoo fesara na soshal midịa gosiri ka nnukwu anwụrụ ọkụ na ire ọkụ si na mpaghara ndị na-ere oche dị n'akụkụ isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị Ojo na-apụta.

Dịka mmadụ a nụrụ olu ya n'otu ihe onyonyoo ahụ siri kwuo, ọkụ ọgbụgba ahụ malitere "n'obere ire ọkụ sitere na nsogbu ọkụ latrik" tupu o fesaa ngwangwa n'ụlọahịa ndị e nwere na mpaghara ahụ.

N'onyonyoo ahụ, a hụrụ ka ọtụtụ ndị na-azụ ahịa na-akwa arịrị dịka ọkụ na-erepịa ngwaahịa ha, ebe ndị ọzọ gbara mbọ etu ike kwere ha iji bupụta ngwaahịa ha ndị nke aka ha ruru.

O dobeghị anya ma ndị ọrụ mgbanyụọkụ Lagos State Fire and Rescue Service na ndị ọrụ gbatagbata ndị ọzọ ha rutere ngwangwa iji menyụọ ọkụ ahụ.

A nụkwara ka ndị hụrụ oge ọkụ ahụ na-agba na-akpọ oku enyemaka, ma na-ebokwa ndị nchekwa ahịa ebubo iji umengwụ arụ ọrụ.

Ahịa Alaba International dị n'okporoụzọ si Legọs gawa Badagry, bụ otu n'ime ahịa ndị kachasị ibu na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

Ọ bụ nnukwu ahịa a na-ere ngwa eletrọnik, oche na ihe ndị e ji ewu ụlọ, tinyekwara ọtụtụ ndị na-azụ ahịa si gburugburu Naịjirịa na mba ndị ọzọ.

Ka o sina dị, o nwebeghị ihe anyị nụrụ site n'ụlọọrụ Lagos State Fire and Rescue Service oge anyị na-ede akụkọ a.

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Tuzde 16 Septemba, 2025 ka ọkụ gbariri ọtụtụ ọnụụlọahịa n'ahịa Mandilas nakwa Afriland Towers dị n'ime Lagos Island na Legọs steeti.