Ihe anyị ma maka ebubo na emegburu ndị Igbo na ntuliaka okpuru ọchịchị Legọs

E mere ntuliaka n'okpuru ọchịchị iri abụọ na kansụl ime obodo iri atọ na asaa dị na Legọs

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Kemgbe emechara ntuliaka okpuru ọchịchị na Legọs n'ụbọchị Satọde 12 Julaị ka akụkọ malitere na-efegharị n'ụlọ mgbasa ozi nke mpaghara Naịjirịa ma na-ebo ebubo na emegburu ndị igbo na Legọs site na enyeghị ha ohere ka ha zọọ ọkwa ọchịchị dị ka ibe ha ruo na-ekweghị ka ọtụtụ ndị Igbo sonye na-ịtụ vootu na ntuliaka ahụ.

Ebubo a, nke e kwuru na Onye bụbu onyeisi Ọhaneze na Legọs kwupụtara maka ya, katọrọ ihe ọ kpọrọ ịga n'ihu na-emegbu ndị igbo na Legọs.

Dịka akụkọ ahụ siri kwuo, Maazị Solomon Ogbonna Aguene kwuru na emegburu ụmụ Igbo na ntuliaka okpuru ọchịchị na Legọs nke e mere n'ụbọchị Satọde 12 Julaị 2025.

Akụkọ kwuru na Aguene kwuputara nwute ya maka ịga n'ihu na-ewepụ ndị igbo n'usoro ndọrọndọrọ ọchịchị nke Legọs steeti.

E kwuru na Ogbonna boro ebubo na a napụrụ ọtụtụ ndị Igbo ikike ịtụ vootu ma kpachaara anya mechibido ha ụzọ ka ha ghara itinye aka na ntuliaka ahụ.

O kwukwara na usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị Legọs steeti na-egbochi ndị Igbo ịzọ ọkwa dị mkpa dịka onyeisi oche na onye otu kansụl n'agbanyeghị oke enyeaka ha na mmepe steeti ahụ.

Otu n'ime ndị ndu pati APC na Legọs kwuru na ha emeela nnyocha n'aka ndị haziri ntuliaka ahụ, mana ọ dịghị ebe ihe ahụ mere

Ebe foto si, Getty Images

Ihe otu Ọhaneze na Legọs kwuru

Mgbe BBC News Igbo kpọtụrụ otu onyeisi Ọhaneze na Legọs iji chọpụta ma ebubo ahụ a bụ eziokwu, ọ gwara anyị na Maazị Solomon Ogbonna abụzighị onyeisi Ọhaneze na Legọs.

Ọ gara n'ihu gwa onye ntaakụkọ anyị na ya ga-akpọghachi ya azụ n'ihi na ya nọ ebe mkpọtụ na-eme nke ukwuu.

Ihe Joe Igbokwe kwuru maka ntuliaka ahụ

Na nzaghachi, otu onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị All Progressive Congress (APC) a ma ama na Legọs bụ Joe Igbokwe kwuru na ya sonyere na ntuliaka okpuru ọchịchị ahụ mana enweghị ihe dị otu ahụ mere n'Itire Ikate Surulere ebe ya tụrụ vootu.

Igbokwe bụ otu n'ime ndị ndu pati APC na Legọs, kwupụtara n'akara soshal midịa ya na ha emeela nnyocha n'aka ndị haziri ntuliaka ahụ n'okpuru ọchịchị iri abụọ na kansụl ime obodo iri atọ na asaa dị na Legọs, na ihe dịka ebubo ahụ emeghị ebe ọbụla.

Ọ gara n'ihu gwa Maazị Solomon Ogbonna ka o wepụta ihe akaebe iji gosipụta na emegburu ụmụ Igbo na ntuliaka ahụ.