Ọkụ repịara ngwaahịa m niile - Onye na-ere akwa na Mandilas Market, Legọs

Ọkụ repịara ngwaahịa m niile - Onye na-ere akwa na Mandilas Market, Lagos
Nkọwa foto, Ụlọahịa ndị gbara ọkụ n'ahịa Mandilas Market dị na Legọs steeti
    • Onye dere ya, Chinonso Ugorji
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu onye na-ere akwa ụmụnwoke n'ahịa Mandilas Market dị n'ime Lagos Island na Legọs steeti akọwaala ka ọkụ ọgbụgba siri laa ụlọahịa ya nakwa ngwaahịa ya niile n'iyi.

Maazị Uchenna Ernest gwara anyị na ya emechiela ahịa ma laa n'ụlọ ya tupu ya anata ozi na ụlọahịa ya na-agba ọkụ.

"Esi m Surulere gbaghachi Lagos Island, mana tupu m rute, ụlọahịa m erekpọọla. Ewepụtaghị m otu mkpụrụ akwa n'ụlọahịa m, ọ bụnadị otu mkpịsị".

"Ọkụ ya fesara ngwangwa ka ihe a gbara kemikal," ka nwaafọ Anambra steeti ahụ kọọrọ anyị.

O kwuru na ka ọ dị ugbua, o nwebeghị onye ma ihe kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ, ma kwuo na gọọmenti na ndị ọrụ nchekwa ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ọdachi ahụ dakwasịrị ha.

Etu ọkụ siri gbaa n'ahịa Mandilas dị na Legọs steeti

Etu ọkụ siri gbaa n'ahịa Mandilas dị na Legọs steeti

Ọkụ gbariri ọtụtụ ọnụụlọahịa n'ahịa Mandilas dị n'ime Lagos Island na Legọs steeti n'ụbọchị Tuzde 16 Septemba, 2025.

Ahịa Mandila bụ otu n'ime ahịa ndị a ma ama na Legọs steeti, ma bụrụkwa ebe a na-ere akwa, uwe, akpụkpọụkwụ na ihe dum e ji achọ mma n'ụdị ha dị iche iche.

Ozi anyị nwetara kwuru na ọ bụ n'ọgbara ụlọahịa Emab Plaza dị n'azụ ahịa Mandilas, nke bụ ụlọelu nwere ogogo anọ ka ọkụ ọgbụgba ahụ siri malite.

Oge onye ntaakụkọ BBC Igbo garuru n'ahịa Mandilas n'ụtụtụ Wenezde 17 Septemba 2025, otu onye gwara ya okwu na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọkụ ahụ malitere ịgba mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere asatọ nke abalị, oge ha hụchara anwụrụ ọkụ n'ogogo anọ nke Emab Plaza.

Ọ sịrị na ha kpọrọ ndị ọrụ mgbanyụọkụ na ndị nchekwa ozugbo ma gbaakwa mbọ n'onwe ha iji hụ na a kwụsịrị ọkụ ahụ.

Site n'ihe anyị hụrụ n'ogige ahịa Mandilas, ọkụ ọgbụgba ahụ lara ọtụtụ ụlọahịa na ngwongwo n'iyi.

Anyị hụrụ ka ọtụtụ mmadụ nupụtara n'igwe iji were anya ha hụ mbibi ọkụ ọgbụgba ahụ butere n'ime ahịa Mandilas.

Ụfọdụ ndị nwere ụlọahịa n'akụkụ ụlọahịa ndị nke gbara ọkụ ka anyị hụkwara ka ha na-akwapụta ngwongwo ndị ha nwere n'ụlọahịa ha iji gbochie ihe ọghọm ọbụla pụrụ ịdapụta.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị nchekwa jupụtara ebe niile, dịka ha ji eriri machie mpaghara ahịa Mandilas gbara ọkụ, iji gbochie ndị mmadụ ịbanye ebe ahụ.

Anyị hụkwara ndị ọrụ nkesa ọkụ latrik si n'ụlọọrụ Eko Electricity Distribution Company (EKEDC) ka ha na-agagharị n'ime ahịa ahụ iji gbochie ọkụ ọgbụgba ahụ itiwapụ ọzọ.

Ọ bụ eziokwu na ndị ọrụ mgbanyụọkụ Legọs steeti akwụsịla ọkụ ọgbụgba ahụ, mana anyị hụkwara ebe ụfọdụ ọkụ ka na-agba, nakwa ụfọdụ ọnụụlọahịa anwụrụ ọkụ si n'ime ha apụta.

O nwebeghị ihe ọbụla gọọmenti maọbụ ndị ọrụ nchekwa kwurula bụ ihe butere ọkụ ọgbụgba ahụ, mana ụfọdụ ndị gwara anyị okwu na nzuzo kwuru na o nwereike ịbụ nsogbu ọkụ latrik kpatara ya.

Ka o sina dị, o nwebeghị mmadụ ọbụla e kwuru na ọ nwụrụ maọbụ merụọ ahụ site n'ọdachi ahụ.

Cheta na nke a abụghị ọkụ ọgbụgba nke mbụ a hụtara na Lagos Island n'ụbọchị Tuzde 16 Septemba, 2025.

Ọkụ nke mbụ gbara ụlọelu nwere ogogo isii na mpaghara Marina mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere abụọ nke ehihie n'ụbọchị Tuzde ahụ.