Legọs Mandilas: Etu ego ọsọ ahịa siri bute ọnwụ mmadụ na ọgbaaghara n'ime ahịa

Ọgbaaghara n'ahịa Mandilas dị na Legos

Ebe foto si, Screenshot/Lagos State Police Command/X

Nkọwa foto, Ọgbaaghara n'ahịa Mandilas dị na Legos
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Kemgbe abalị gara aga ka ịntanet na-akpọtụ maka ọgbaaghara mere n'ọdọ ahịa Mandilas dị na Legọs steeti.

Mandilas bụ ebe a na-ere uwe dị iche iche na akpụkpọ ụkwụ ma bụrụkwa ebe ndị si mba ofesi ebubata akwa jiri mere isi ahịa.

Mana n'ụbọchị Wenezde, Ọgọst 27, 2025 ọnọdụ udo e jiri mara ahịa ahụ gbanwere maka ọgbaaghara bidoro n'etiti mmadụ abụọ ndị ọsọ ahịa tupuu ọ metụta ndị na-amaghị ihe ọbụla banyere ya.

BBC News gbo
Nkọwa foto, BBC News Igbo Pịa aka ebe ka ị banye na Whatsapp Chanelụ anyị

Etu ọgbaaghara si malite n'ahịa Mandilas

Otu nwoke na-achọghị ka a kpọọ aha ya ma bụrụkwa nnukwu mmadụ n'ahịa Mandilas kọwara BBC Igbo ihe mere ma kwuo na ọ bụ nsogbu dị n'etiti ndị ọsọ ahịa abụọ butere ọnọdụ ahụ.

N'okwu ya "ndị ọsọ ahịa abụọ, zụchara ahịa nweta uru puku naịra abụọ (N2000), mana ha bidoro webe esemokwu mgbe ha chọrọ ike ego ahụ".

"Otu n'ime ha wepụtara mma (dagger) mmaa ya onye nke ọzọ mana onye ahụ napụrụ ya mma ahụ jiri ya makasịa ya ahụ".

"A nụrụ m na onye ahụ bu ụzọ maa nwa nne ya mma nwụrụ nke mere ndị obododo ya nọ nso jiri jịkọọ aka ọnụ na-eti onye gburu ya ihe tupuu onye nke ahụ emee ka ọ nwụọla".

"Ọsọ dara n'ime ahịa mgbe onye nke abụọ ahụ mere ka ọ nwụọla. N'oge ahụ, ọ dịka okwu ebiela maka mmmadụ abụọ bidoro okwu ahụ dịka ha anwụọla."

Ihe mere ọgbaaghara ahụ jiri gbasaa

N'okwu nwoke ahụ anyị gbara ajụjụ ọnụ, "ọgbaaghara ahu gbasara ebe niile mgbe ndị a chọpụtara na onye nke abụọ ahụ dị ndụ maka na mgbe ndị uweojii bịara ka ọ si n'ala kulie banye n'ụgbọala ndị uweojii".

"Ha chọpụtara na onye nke abụọ ahụ jiri awụwọ mee ka ọnwụọla nke mere e jiri kwụsị iti ya ihe".

"Ọ bụ oge ahụ ka ọgbaaghara gbasara ebe niile".

Gịnị ka ndị uweojii kwuru?

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bụ Benjamin Hundeyin azabeghị ajụjụ BBC News Igbo jụrụ ya banyere ihe mere na Mandịlas nakwa etu ọnọdụ si dị ugbua.

Mana anyị chọpụtara ọsịsa o nyere otu onye n'akara X soshal mịdịa ya bụ ebe ọ kọwara na "ọ bụghị eziokwu na ndị omekome were ọnọdụ n'ahịa ahụ".

Dịka o si kwuo, "DPO Lion Building na nke Ebute-Ero gara n'ebe ahụ ihe mere ma na-eme ka udo chịa ọzọ".

O kwukwara na "e jidela otu onye aka ya dị n'ihe mere bụ onye ga-enyereaka na nnyocha a ga-eme".

Ọzọ bụ na ndị uweojii na Legọs wepụtara ozi na X soshal midịa ha ebe ha nọ kwuo na "ha ejidela otu nwoke aha ya bụ Ebuka Adindu bụ onye Abia steeti maka iji mma mmagbuo Sodiq Ibrahim bụ onye Kogi steeti".

Ndị uweojii sị na "Ebuka mmagbuchara Sodiq ma makwaa onwe ya mma".

Etu ọnọdụ si dị ugbua na Mandilas

Nwoke ahụ achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC News Igbo na ndị isi ahịa machiri ndị ọsọ ahịa niile na Mandilas ma kwụsị ha ire ahịa n'ebe ahụ ugbua.

Ha kwuru na enweghị ihe dịka ọgbaaghara na-eme ebe ahụ mana ndị mmadụ ka nọkwa n'ụjọ.