Balogun market fire: Etu ọkụ siri gbapịa ngwaahịa ụmụ mmadụ n'ahịa Balogun, Lagos

Ọdọahịa Balogun

Ọtụtụ ndị ahịa nọ n'ahịa Balogun dị na Lagos Island n'akwa na anyammiri dịka ọkụ a mabeghị ihe butere ya gbara ọdọahịa ndị mmadụ n'abalị foro ụbọchị Tọzde.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ndị nwe ọdọahịa pụtara ụtụtụ n'obi ọcha ịba kpọbe ọdọahịa ha maka ahịa Ekeresimesi nwere hụ n'ebe nile bụzị ntụ na unyi.

O nweghị onye ma ihe butere ọkụ ahụ nke metụtara ọdụ ebe a na-ere akwa na akpa aka.

Ọdọahịa Balogun

Oge BBC Igbo gara ebe ahụ, arịrịọ obi ekweghị ụfọdụ ndị ọ metụtara ekwu okwu.

Ọdọahịa Balogun

Otu nwaanyị kwuru na ha chara ahịa maka Ekeresimesi na afọ ọhụrụ kwajuo ọdọahịa bụ ihe ndị ọkụ ahụ lara n'iyi.

Ndị gbakọrọ ele ihe ọkụ mebiri n'ahịa Balogun

Ndị agboro wakporo ndị ntaakụkọ gụnyere ndị ntaakụkọ BBC Igbo na ndị Channels TV bịara ebe ahụ i chọpụta ihe mere ma jụ inye ha ohere ịrụ ọrụ ha.

Ha napụrụ ndị ntaakụkọ anyị igwe ha ji arụ ọrụ ma wepụchaa ihe onyonyo ha setere, ma nyehachi ha ngwaọrụ ha.

Aha onyonyo, 'Ọ nweghị ihe gọọmenti Anambra mere maka ozu ndị nke anyị ọkụ gbara'

O doghị anya ihe mere na ndị agboro achọghị ka ntị nụ ihe mere n'ahịa ahụ dịka ha ekwughị ihe kparatar agwa ha kpasara ndị ntaakụkọ maọbụ onye zunyere ha.

Cheta na n'ọnwa Jenụwarị afọ 2020, ọkụ gbara na Balogun mebie ahịa ọtụtụ ndị mmadụ.

Ọkụ gbakwara n'ahịa ahụ na Novemba afọ 2019.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: