Port Harcourt Fire Incident: Ọkụ ọzọ agbaala n'ebe ahụ

Ọkụ agbaala ihe karịrị nnukwu ụgbọmmiri karịrị asatọ ma gbuo mmadụ ole ma ole a na-amabeghị ole ha dị na Bonny Jetty dị na Nembe Waterside, Port Harcourt.
Anya hụrụnụ kwuru na ya bụ ọkụ malitere n'elekere iri nke ụtụtụ mgbe otu nwa amadi banyere ụgbọmmiri bu mmadụ agbịdị nakwa ngwa ndị ọzọ e ji mmanụ agbịdị mepụta ma mụnye Siga.
Nke a mere ka nnukwu ọkụ tasuru na ụgbọmmiri nille dị n'akụkụ nke ahụ nwaamdị ahụ banyere n'ime ya.
Otu ụgbọmmiri gbara ọkụ bu ụmụnwaanyị na ụmụnwoke si ahia erute ọdọụgbọmmiri mgbe ọdachị a mere.
Naanị ụfọdu mmadụ gbapụnwụrụ ọsọ.

Ebe foto si, BBC
Ndị na-ere ahịa n'akụkụ ọdọ ụgbọmmiri ahụ gbapụkwuru ọsọ mgbe ha hụrụ ọkụ ahụ na-erute ha nso mana mgbe ha laghachitere mgbe ọkụ belatara, ngwa ahịa niile erepiala.
Onye ọzọ na-ere ahịa n'akụkụ ebe ahụ kwuru na mgbe ndị na-emenyu ọkụ rutere ebe ihe a mere, ndị ntoroọbịa chụrụ ha ọsọ makana ha kwuru na ha abiaghị n'oge bia menyụọ ọkụ.
Etu ihe si kwụrụ ụgbụa, anụbeghị n'ọnụ ndị gbata gbata etu ọkụ a si malite maọbụ mmadụ ole ihe a metụtara kpọmkwem.

Ọkụ gbara na 'D Line' nakwa Rumuokoro na Port Harcourt alaala ọtụtụ akụnụba n'iyi

Ihe mberede ọkụ ọgbụgba abụọ mere n'ime otu ụbọchị na Port Harcourt, isi obodo Rivers Steeti n'ụbọchị Sọnde a.
Nke mbụ bụ ọkụ gbariri ahịa a na-akpọ 'fruit garden', na mpaghara D-Line.
Ọkụ nke abụọ bụ nke gbara na mpaghara Rumuokoro, n'akụkụ ụlọụka Katọlik a kpọrọ St Jude Catholic Church.

Ya bụ ọkụ gbariri otu ụlọ ogogo atọ arụchabeghị arụcha.
Onye ntaakụkọ anyị hụrụ na e nwere ọtụtụ udu mmanụ dịcha n'ụlọ ahụ, nke gosiri na ọ dịka ebe a na-adọkọ mmanụ.
Onyeisioche okpuru ọchịchị Obio-Akpo na Rivers steeti bụ Goerge Ariolu, gwara onye ntaakụkọ anyị na ọ bụ aka orụ ndị na-emepụta mmanụ ụgbọala nke adigboroja kpatara ya bụ ọkụ.
Ariolu kwuru na ya bụ ihe jọgburu onwe ya, ma kwukwaa na ngalaba gọọmentị ọ gbasara ga-ama ihe e mere maka ya.

Mana ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ, ma ndị nke Rivers steeti, ma ndị nke gọọmentị etiti, gbatara n'oge wee malite ịgbanyụ ya bụ ọkụ.
N'agbanyeghị na ha agbanyụnwughị ọkụ ahụ kpọmkwem, ọbịbịa ha bịara n'oge mere ka ọkụ ahụ ghara ịgbasa banye n'ụlọ ndị ọzọ dị n'okirikiri ahụ.
E nwere ụlọakụ abụọ, otu ụlọ oriri na nkwari, nakwa otu ụlọụka n'akụkụ ebe ọkụ ahụ gbara.
Ka ọ dị ugbua, ya bụ ọkụ jizi nwayọ agba, dịka onyentaakụkọ anyị si hụ.

Ọkụ gbariri ngwa ahịa nde kwuru nde n'ahịa 'Fruit Garden'

Ọkụ abalị agbariela ngwa ahịa karịrị nde kwuru nde na Pọtakọt n'abalị ụbọchị Satọde.
Ọkụ ahụ mere n'ebe ndị ahịa na-adọwa ngwa ahịa ha, a kpọrọ 'Fruit Garden', dị na Pọtakọt.
Ebe ahụ bụkwa ọdọ ebe a na-edebe gaasị n'oge mbụ.

Ndị ọrụ mmenyụọkụ na steeti ahụ pụtara n'abalị nyere aka gbaa ọkụ ahụ mgba dịka ndị BBC Igbo hụrụ ebe ahụ si kwuo.
Ndị uweojii kwuru na o nweghi onye nwụrụ n'ọdachi ahụ n'ihi na ndị ahịa niile alaala mgbe ọkụ ahụ malitere.

Ha kwukwara na ha na-eme nyocha banyere ihe kpatara ọkụ ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Omondi kwuru na mgbe nnyocha ha gwụrụ ha ga-agwa ọha naeze ihe ha chọpụtara.









