Port-Harcourt Kingship Tussle: Etu ụmụnne abụọ si zọ oche Eze Pọtakọt

Mmemme pụrụiche na egwu ọṅụ ka Ọkaiwu Uche Isaiah Elikwu jiri nata mkpara ikike ya taa, dịka Eze ọdịnala na-achị alaeze Rebisi, nke gụnyere obodo Pọtakọt, isi obodo, Rivas Steeti.
Nke a na-abịa dịka ụlọikpe dị na Pọtakọt kpebiri ikpe gbasara oche eze ahụ n'ụbọchị Mọnde, abalị iri na ise nke ọnwa Nọvemba afọ 2021.
Akụkọ kwuru na ikpe gbasara oche Eze Rebisi adịla n'ụlọikpe ihe ruru afọ iri.
Onye ma maka akụkọ a kwuru na oche eze ahụ na-akpagharị n'etiti obodo asaa mebere alaeze ahụ a kpọrọ 'Alaeze Rebisi'.
Oge eze nke ikpeazụ lara mmụọ, ọ bụ ezinaụlọ ndị be Oduwanyeoma ka o rutere iwepụta eze ọhụrụ.
Mana esemokwu dapụtara n'etiti ụmụnne abụọ si n'ezinaụlọ ahụ: Uche Elikwu na Victor Wuluchem, dịka ha abụọ na-azọ onye a ga-echi eze.

Nke a kpatara alaeze Rebisi ji nwee eze abụọ n'ihi na mmadụ abụọ a na-azọ eze ekweghị ekwenyere ibe ha.
Ya bụ okwu mechara pụọ n'ụlọikpe ebe a nọrọ nye iwu ka ha abụọ kwụsị ịkpọ onwe ha eze ruo mgbe a ga-ekpebi ya bụ ikpe.

Ikpe a mechara bie abalị abụọ gara aga dịka ụlọikpe kwuru na ọ bụ ọkaiwu Uche Elikwu bụ eze alaeze Rebisi kpọmkwem.
Mana kepukepu na-ekwu na Victor Wuluchem ga-ebupụ ikpe ahụ n'ụlọikpe mkpesa.














