Nnewi Timber Market Fire: Ndị ahịa na ndị uweojii na-arụ ụka maka ọkụ gbara n'ọgbọ osisi na Nnewi

Ebe foto si, Twitter/Nnewi City
Ndị na-azụ ahịa n'ọgbọ osisi dị na Nnewi nọ na nnukwu ihe iru uju ugbua n'ihi ọkụ gbapịara ụlọahịa ha.
Ya bụ ọkụ malitere na mgbede ụbọchị Wenezde gbagide ime abalị niile ruo ụtụtụ ụbọchị Tọzde a.
Dịka otu akara a kpọrọ 'Nnewi City' na Twitter siri dee, ọ bụ ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ Anambara steeti bịara gbanyụọ ya bụ ọkụ.
Ndị mmadụ boro ebubo na ọ bụ ndị uweojii kpatara ọkụ ahụ ebe ha na-achụ ndị na-ese anwụrụ ike na ya bụ ahịa.
Mana ndị uweojii kwuru na ọ bụ ndị ahụ na-ere anwụrụ ike tinyere ọkụ iji gbochie aka ndị uweojii ịkpata ha.
Ngwaahịa ndị mmadị ruru nde kwuru nde naịra lara n'iyi n'ọkụ ahụ.
Oge BBC Igbo kpọrọ onye nọ n'ahịa ahụ n'elekere iri na otu na ọkara nke ụtụtụ Tọzde, Febrụwarị 18, o kwuru na ọkụ ahụ ka na-agbakwa.
Ihe kpatara ọkụ ahụ - Onye nọ n'ahịa ọgbọ osisi

Ebe foto si, Nnewi City
Otu onye ahịa na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọkụ ahụ malitere n'ehihie ụbọchị Wenezde, Febrụwarị 17, 2021.
O kwuru sị: "Anyị hụrụ ka ndị uweojii na'agbada na ndagwurugwu dị nso n'ahịa ahụ, ebe ha na-ekwu na ndị mmadụ na-anọ ese anwụrụ ike."
"Mana ndị ahụ ha na-achụ agbakpuola n'ime ime nke mere ndị uweojii jiri were 'lighter' mụnye ọkụ n'ahịhịa dị ebe ahụ."
"Uche ha bụ na anwụrụ ọkụ ga-eme ka ndị ahụ gbapụta ka ha nwuchie ha, mana ndị ahụ si ụzọ ọzọ gbafuo."

Ebe foto si, Nnewi City
"Ọkụ ahụ ndị uweojii munyere banyere n'ime 'saw dust' sizie ebe ahụ malite ịgba n'ahịa niile."
"Oge ndị uweojii hụrụ nke a, ha ji ụjọ gbafuo ka ndị mmadụ ghara iji iwe merụọ ha ahụ."
Nwa amadi ahụ gwara anyị okwu kwukwara na ndị ahịa ji iwe mebie otu ụgbọala ndị uweojii bụ nke ha hapụrụ gbaa ọsọ.
Ọ bụ ndị ekperima tinyere ahịa ahụ ọkụ - Ndị uweojii Anambra steeti

Ebe foto si, Youtube screengrab
Haruna Mohammed, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti gwara BBC na ebubo ndị ahịa boro ndị uweojii abụghị eziokwu.
Mohammed kọwara na ọ bụ ndị otu nzuzo na ndị na-ere anwụrụ ike na-alụ ọgụ nke mere ka ndị uweojii gaa ebe ahụ wee nwụchie mmadụ anọ n'ime ha.
Oge ndị uweojii ahụ chọrọ ịpụ, ndị ekperima ahụ nọchiri ụzọ ma mụnye taya moto ọkụ iji gbochie ndị uweojii ịkpụrụ ndị otu ha.
Ọ bụ ọkụ taya ahụ banyere na 'sawdust' wee si ebe ahụ banye n'ọgbọ ahịa ahụ.
Mohammed jụrụ ajụjụ sị: "Ihe e ji amụnye ọkụ o so na ngwaọrụ ndị uweojii?"
"N'ime ndị uweojii na ndị na-ese anwụrụ ike, onye ga-eji 'lighter' maọbụ 'matches' iji tinye ọkụ?"
Haruna Mohammed gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị ekperima ahụ wakporo ndị uweojii ma kurie otu ụgbọala ha.
Mana ndị uweojii gbara mbọ nwụchie ihe karịrị mmadụ iri atọ na ise n'ime ndị butere ọgbaaghara ahụ.
"Nnyocha ka na-aga n'ihu ugbua," Haruna na-ekwu.











