Stress: Ị ma na ịrụ oke ọrụ na-ezughi ike nwereike igbu gị?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chris Sanctus Okereke
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
Ụfọdụ ọrụ anaghị enye ohere ezumike nke bụ na ndị na-arụ ya bụ ọrụ anaghị enwekarị ohere inweta onwe ha, afọ kwuru afọ.
Ọrụ ndị a gụnyere ọrụ ndị uweojii, ndị agha, ndị ọrụ ụgbọelụ na-eme njem, ọrụ ntaakụkọ, ndị ọrụ ahụike, ndị na-azụ ahịa, ndị ọrụ ụgbọala, ndị na-ere nri, ndị ọgbatumtum na-eme njem na ọrụ ndị ọzọ.
E nweghi ezumike zuru oke n'ọrụ na-ebute ọtụtụ ihe dị iche iche n'ahụ mmadụ.
Ọ bụghịkwa naanị ọrụ na-ebute mgbakasị ahụ bụ nke Bekee na-akpọ 'stress', mkpa ezinaụlọ, etu i si eri nri nakwa ọnọdụ ahụike gị nwekara ike itinye aka ụfọdụ oge.
Ihe enweghi ezumike na-ebute
Ọ na-ebutenwu ọbara mgbalielu, ọ na-emekwa ka shuga dị n'ọbara mmadụ rịa elu, ọ na-emekwa obi ịkụ kpum kpum.
Ọ nwekwara ike ime ka mmadụ na-eri oke nri ọkachasị nke bu oke shuga, na-ese anwụrụ nakwa na-aṅụ oke mmanya, nke nwereike ime ka mmadụ buo oke ibu.
Mgbe ụfọdụ ọ na-ebutekwa mgbakasị ahụ; ịma atụ, onye nkuzi na-enweghị ezumike zuru oke nwereike ị na-enwe ahụmgbakasị ebe ụmụakwụkwọ ya nọ.
Dọkịnta na-awa ahụ na-enweghị ezumike zuru oke nwereike ichefu ngwaọrụ dị iche iche n'ime ahụ onye ọ wara ahụ, ebe nke na-adụ ntụtụ nwereike ịdụhie ya n'ihi ọma jijiji.

Ebe foto si, Reuters
Ọzọ bụ na n'ihe dị ka oge a na-agba Ekeresimesi maọbụ na-eme ụfọdụ emume ndị ọzọ, ndị ọkwọụgbọala anaghị enwekarị ohere izu ike n'ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka ha na-akacha akpata ego.
Ụfọdụ n'ime ha na-agba ugboro ugboro ka ha nwee ike ịkpata nnukwu ego.
Ụdịrị agwa ahụ na-ebutere ọtụtụ mbere okporoụzọ n'oge ahụ, n'ihi na ụfọdụ na-arahụ ụra ka ha na-akwọ ụgbọala.

Ihe ndị ọrụ ahụike na-ekwu maka ezumike
Nwaanyị riri amusu n'ihe gbasara ahụike ụbụrụisi bụ Pamela Udọka kwuru na enweghi ezumike zuru ezu nwereike ibute agwa ọjọọ dị iche iche.
Ọ sị na ọ na-ebute ahụ mgbakasị n'ezinaụlọ, ụlọọrụ nakwa n'ọha.
Udọka sị na "ọ bụ ya mere e ji enye ụmụakwụkwọ na ndị ọrụ oyibo ezumike ma a gụrụ gụrụ".
Ọ sị na enweghi ezumike zuru oke nwekwara ike ibute ọrịa ụbụrụisi dị iche iche.

Ebe foto si, PAMELA UDOKA
O kwukwara na mgbe ụfọdụ, mmadụ nwekwara ike ịmerụ onwe ya ahụ maọbụ merụọ ndị ọzọ ahụ maka ọrịa ụbụrụisi so na ihe enweghi ezumike na-ebute.
Udọka dụrụ ọdụ ka onye ọbụla gbaa mbọ wepụta oge maka ezumike n'ọrụ.
O kwukwara na ịrahụ ụra zuru oke bụ ihe kacha mkpa n'ezumike.
Ndị ọkammụta kwuru na ịrahụ ụra ihe ruru awa asaa n'ụbọchị dị oke mkpa.

Ha kwukwara na onye ọbụla chọrọ ezumike kwesịrị inwe oge ha ga-eji wetuo ekwentị ya n'akụkụ, ọkachasị mgbe ọ chọrọ ịrahụ ụra.
Onye ahụ kwesịrị ịkpọ ya mkpa ịhụ na o wepụtara oge ọ ga-eji na-alaba ụra kwa ụbọchị; ọ bụ n'ụtụtụ o, maọbụ n'abalị.
O kwukwara na ụlọọrụ ọbụla na-anaghị enye ndị ọrụ ha oge ezumike bụ nke Bekee kpọrọ 'leave', na-agba onwe ha egbe n'ụkwụ.
Ihe nkiri a ga-amasị gị:
Akụkọ ga-amasị gị:










