Nigerian Army: Ha ekwuola ihe mere ha ji enyocha otu onye n'ime ha gburu mmadụ anọ

Onye agha

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndịagha Naịjirịa ekwuola na ha na-eme nnyocha iji mata ihe mere otu onye n'ime ha ji gbuo mmadụ anọ ndị ọzọ were gbuo onwe ya.

Sagir Musa bụ ọnụ na-ekwuchitere ndịagha Naịjiria kwukwara na mmadụ abụọ ọzọ merụrụ ahụ na ya bụ mwakpo na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ndịagha dị na Maiduguri.

Ndị ụlọmkpọrọ Naịjirịa ekeela nkwụcha:

Olisa Metuh

Ebe foto si, Channelstv

Nkọwa foto, Metuh na-agọ na aka ya adịghị na mpụ na aghụghọ

Ja'afaru Ahmed bụ onyeisi ụlọmkpọrọ na Naịjirịa ekwuola na ha ekeela ezigbo nkwụcha n'ụlọmkpọrọ Kuje dị n'Abuja, nke bụ ebe a tụrụ ndị nwere agba dịka Olisa Metuh, Orji Uzor Kalu, Joshua Dariye na ndị ọzọ, mkpọrọ.

Chọpụta ihe mere e ji tụọ Metuh mkpọrọ ebe a: Ụlọikpe atụọla Olisa Metuh nga afọ asaa maka nrụrụaka

Ojiegbe egbuola mmadụ ise n'Amerịka

Ndị uweojii

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, A kwara mgbọ ahụ n'isi ụlọorụ ndị Molson Coors

Mmadụ ise anwụọla ka otu oji egbe kwawara mgbọ n'ụlọọrụ ebe a na-arụpụta mmanya dị n'obodo Milwaukee dị na mba Amerịka.

Ndị uweojii steeti ahụ kwuru na ojiegbe ahụ nwụkwara site n'ahụ o merụrụ onwe ya, gbawara egbe ahụ mgbe ọtụtụ ndị ọrụ ka nọ n'ọrụ.

Europa League,

Ndị Arsenal na Olympiakos ga-ama ihe ekwe na-akụ mgbe ha ga-ezute n'Emirates ịgba asọmpi Europa League taa.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ebe Man Utd ga-anabata Club Brugges n'Old Trafford ebe ha ga-agba egwu onye ike ga-agwụ n'otu asọmpi ahụ.

Ndị Saudi Arabia amachiela ndị njem n'ihi coronavirus

Ndị alakaụba na-ekpe ekpere

Ebe foto si, Reuters

Mba Saụdi Arebia amachiela ndị si esi ịbata obodo ha maka njem ofufe gụnyere ịtụ ụkwụ n'ọgbakọ nsọ ha bụ Mecca nakwa Medina n'ihi ụjọ ọrịa Coronavirus.

N'agbanyeghị na enwebeghi onye a hụrụ bu ọrịa a na mba ahụ, ha amachiela ndị mmadụ si na mba ebe ọrịa a na-akpa ike ugbua a ịbata mba ha.

Ka ọ dị ugbua, amabeghi ma mmachi a ọ ka ga-adị n'ọnwa Julaị mgbe Hajj kwesịrị ibido.

'Nsogbu nchekwa esighi Buhari n'aka'

Ụkọchukwu Ejike Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry/ Getty Images

Fada Ejike Mbaka ekwuola sị na ọ bụghị Onyeisiala Muhammadu Buhari ka nsogbu enweghi ezi nchekwa na Naịjirịa si n'aka.

N'olu ya o kwuru na ọ bụ Goodluck Jonathan kpunyere ajọ nchekwa okpu ma rụọrọ oche eze.

Coronavirus anọghị na Naịjirịa

Ndị ọrụ ahụike bu igbe ka ha si ụlọọgwụ Jinyintan ebe a na-elekọta ndị a chọtara ọrịa coronavirus, apụta

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ihe ruru mmadụ iri na ise bụ ndị ọrụ ahụike ebutela ọrịa n'obodo Wuhan

Ị nụrụ kepu kepu na-efegharị nke kwuru na ọrịa Coronavirus batara Legọs? Nwanne kutuo ume makana ọ bụghị eziokwu.

Ngalaba na-ahụ maka nchekwa maka ụdịrị ọrịa ahụ bụ Nigeria Centre for Disease Control kwuru na ha enyochaala mmadụ iri na otu a na-enyobu ma ha ebu ya, mana ha chọpụtara na ha ebughi ya.

Gụọ ihe ndị ha kwuru n'uju ebe a: 'Coronavirus abataghị Naịjirịa' - NCDC

N'egwuregwu,

Manchester City ji mgbachara ndị mmụọ pịawaa Real Madrid azụ ka ha ji goolu abụọ a satara otu merie ha n'azụ ụlọ ha.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ebe Lyon ji otu goolu a na-asaghị asa merie Juventus bụ ebe ototo Cristiano Ronaldo na-agba.

Gụọ maka etu Madrid si takwute ya aja n'aka Man City n'uju ebe a: Manchester City apịala Real Madrid mgbachara ndị mmụọ

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ash Wednesday: 'Onye ọbụla chọrọ gị okwu maka uwe ojii i yi, gwa anyị'- Bishop Martins