Olisa Metuh: Atụọla Olisa Metuh nga afọ asaa maka nrụrụaka N400m

Olisa Metuh

Ebe foto si, Channelstv

Nkọwa foto, Metuh na-agọ na aka ya adịghị na mpụ na aghụghọ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja amala Olisa Metuh ikpe na o zuru narị nde naịra anọ ma tụọ ya nga afọ asaa.

Ọkaikpe Okon Abang nyere mkpebi a n'ụbọchị Tuzde wee kwuo na ebubo asaa niile gọọmentị boro Metu bụcha eziokwu.

Metuh jibu ọkwa odeakwụkwọ mgbasaozi nke ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' (PDP).

Ọbụ gọọmentị etiti gbara Olisa Metuh akwụkwọ na-ebo ya ebubo na ọ natara narị nde naịra anọ n'aka Sambo Dasuki bụ onye jibu ọkwa 'National Security Adviser' oge onyeisiala Goodluck Jonathan nọ n'ọchịchị.

Dasuki n'onwe ya na-azakwa ajụjụ gbasara ebubo na o zuru ijeri dọla abụọ bụ nke e kwesịrị iji gote ngwa agha nke ndịagha Naịjirịa ji ebuso Boko Haram agha.

Mana Olisa Metuh kwuru na onweghị ego o zuru.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọ kọwara na ọ bụ onyeisiala Jonathan kwadoro ka Sambo Dasuki nye ya ego ahụ iji gbagharịa maka mgbasa ozi oge a na-akwado maka ntuliaka nke afọ 2015.

Mana gọọmentị etiti kwuru na Metuh kwesịrị ịma na ego ahụ abụghị ego Jonathan nke ọ na-abụ ego Dasuki ka ọ bụ ego Naịjirịa.

Ikpe Olisa Metuh

Olisa Metuh n'elu akwa ọrịa

Ebe foto si, Twitter/APC Nigeria

Nkọwa foto, N'otu oge, e bu Olisa Metuh n'akwa ọrịa bata ụlọikpe

Ikpe Olisa Metuh malitere kamgbe afọ 2015.

Metuh rịọrọ ka e nye iwu ka onyeisiala Jonathan bịa n'ụlọikpe gbaa ekebe, mana ọkaikpe ekweghị.

Oteghị aka ikpe ahụ malitere, Metuh kwuru na ya na-arịa ọrịa, ma rịọ ụlọikpa ka ha hapụ ya ka ọ gaa mba ofesi ga gwọọ onwe ya.

Mana ọkaikpe Okon Abang ekweghị. Ọ bụnadị oge ndị ọkaiwu na-anọchite anya Metuh wetara akwụkwọ si ụlọọgwụ dị na London iji rịọ ka a hapụ ya, ọkaikpe Abang jụwara isi.

Otu mgbe, ndị mmadụ bu Metuh n'elu akwa ọrịa si n'ụlọgwụ dị n'Abuja bịa n'ụlọikpe iji gosi ọkaikpe na ahụ adịghị ya n'ezie, mana nke ahụ emeghị ka Abang kweta hapụ Metuh ka ọ gaa mba ofesi.

Orji Kalu
Nkọwa foto, Ụlọikpe dị na Legọs tụrụ Orji Uzor Kalu mkpọrọ afọ 12 n'ihi nrụrụaka.

Olisa Metuh esonyerela Orji Uzor Kalu, Joshua Dariye, na Jolly Nyame dịka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama bụ ndị a mara ikpe maka nrụrụaka ma tụọ ha nga.

Kalu chịburu dịka gọvanọ Abịa steeti, Dariye chịburu steeti Plateau, ebe Nyame chịrị steeti Benue.

Ha atọ nọcha ụlọ mkpọrọ ugbua na-ezu ike.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nke a

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Okwu gbasara ikpe Olisa Metuh na-ewuzi na soshal midia ugbua.

Ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ nnọọ ihe aṅụrị, ebe ndị ọzọ na-arịọ gọọmentị ka ha gbalịa nwudechaa ndị nrụrụaka niile.

@Ayemojubar na @King Henry kwuru na ihe ruru Metuh akak ga-erukwa ndị ọzọ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Skip X post, 4

End of X post, 4

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ọgba mbọ: E ji m asambodo mahadum m mana a na ma-azụ ezi'