Ndị kpuru isi n'Imo steeti na-egosi iwe ha na ha enweghi ọrụ

Ndị kpuru isi

Ebe foto si, Getty Images

Ọtụtụ ndị kpuru isi n'Imo steeti wuchiri ụlọ gọọmenti ha n'Owere wee gbochie ụzọ na-aba ya iji gosi iwe ha n'etu e si emekpa ha ahụ.

Ndị isi ahụ n'okpuru otu ha kpọrọ Nigerian Association of the Blind (NAB) na Bekee boro gọọmenti Rochas Okorocha ebubo na ha na-akpaso ha agwa ka ha abụ ndị ọbịa n'ala nke ha.

Ha bere nwịị na gọọmenti ahụ ugboro ugboro achọghị ige ha ntị maọbụ leba anya n'ihe ha na-agabiga.

Dịka akwụkwọ mgbasaozi Vanguard siri dee, onyeisi otu NAB nke Imo steeti bụ Christopher Kalu kwuru na ụdị omume gọọmenti na-emeso ha na-agbawa ha obi ma na-ewuta ha nke ukwuu maka na ọtụtụ nsogbu ha buru bịakwute ya ụfọdụ afọ gara aga enweghi ihe e mere maka ya.

Agbanyeghi ọrụ ndị isi ahụ na-achọ, ha chọkwara ka gọọmenti wepụtara ha ego gbata gbata kwesiri iru ndị isi ụmụakwụkwọ na ndị ọzọ nke ruorola afọ asaa.

N'okwu ya; Kalu kwuru "Anyị na-achọ ego ruru nde naịra 4.5 nakwa ka e nye ndị otu anyị gụchara mahadum ọrụ na steeti. Anyị achọghị ihe karịrị akarị."

Akụkọ na-ekwu na a kpọrọ Kalu ka ya na gọvanọ nwee ọgbakọ n'ime ụlọ gọọmenti, oge ọ pụtara, ọ gwara ndị otu ya na obi dị ya ụtọ n'ihe ya na gọọmenti kpara.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ