Biafra News: 'Enweghi ezinaụlọ Igbo ọbụla na-enweghi onye a tufuru n'ihi agha Biafra'
Taa ka o mere afọ 53 kamgbe agha Biafra kwụsịrị.
Ọ bụ n'ụbọchị 15 nke ọnwa Jenụwarị 1970 ka e kwupụtara na ọgụ dị n'etiti ndị agha Naịjirịa na ndị agha Biafra abịala na njedebe.
Ụbọchị olemole tupu agha a akwụsị, onyeisiala Biafra bụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu gbara ọsọ ndụ gbaga mba Cote D'Ivoire.
Ọ bụ osote ya bụ Philip Effiong gakwuru onyeisiala Naịjirịa n'oge ahụ, bụ Yakubu Gowon, ma kwuo na Bịafra achịliela aka elu.
N'ụbọchị 14 nke ọnwa Jenụwarị 1970 ka ndị isi agha abụọ a bụ Gowon na Effiong binyere aka n'akwụkwọ maka ịkwụsị ọgụ, ma kpọpụta ya n'ụbọchị 15 nke ọnwa Jenụwarị.
Ihe agha Biafra napụrụ ndị Igbo

Igbo na-asị na enweghi ihe anya hụrụ gbaa ọbara, mana nke ahụ ezughi iji tụnyere ihe ndị hụrụ agha Biafra gabigara?
Ihe karịrịmmadụ otu nde nwụrụ n'oge agha Biafra, ọtụtụ n'ime ha ọkachasị ụmụaka na ndị okenye, bụ agụụ na ọrịa gburu ha.
Ọtụtụ ụmụaka ka ndị ụlọọrụ enyemaka ụfọdụ kpọọrọ gbaga na mba dị icheiche iji zọọ ha ndụ, ọtụtụ n'ime ha alọtaghịzi ọzọ ruo taa.
Ụfọdụ ndị hụrụ agha Biafra nke a lụrụ site n'afọ 1967 ruo 1970, gwara BBC Igbo ihe mere ebe ha nọ ụbọchị agha biri.
Nke a mere ọtụtụ n'ime ha ji ekwu sị, ọzọ emekwala.
Gịnị na-eme taa?

Ebe foto si, Getty Images
Mana n'agbanyeghị akụkọ maka ihe ọjọọ niile mere n'oge agha, ọtụtụ ndị ntorobịa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa amalitekwala ndọrọndọrọ maka nnwereonwe Biafra.
E nwere ọtụtụ otu bụ ndi bu okwu nnwereonwe a n'isi, mana ndị a kacha mara bụ otu 'Indigenous People of Biafra', IPOB.
Ndọrọndọrọ a etinyekwala mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa n'ụjọ, ize ndụ, na nnukwu enweghị nchekwa.
Onyeisi otu bụ nwa amadị aha ya bụ Mazi Nnamdi Kanu, onye obodo Afara-Ukwu dị n'Umuahia, Abia Steeti.
Nna ya larala mmụọ bụbu eze ọdịnala ndị Afara-ukwu, maka Kanu gụrụ akwụkwọ na Mahadum Liverpool nke mba UK.
Ka ọ dị ugbua, gọọmentị Naịjirịa ji Kanu na mkpọrọ ma na-ebo ya ebubo iso n'otu na-eyi ndụ egwu.
Gọọmentị bokwara Kanu na ọ na-achọ ịkpa nkata ịkwatu ọchịchị onye kwuo uche ya.
Ikpe Kanu ka na-aga n'ihu ugbua n'ụlọikpe kachasị nke Naịjirịa.
Ndị mere ihe akụkọ a bụ Vining Ogu, Ikechukwu Kalu, Chimamaka Ihenacho, Chiemela Peter na Chukwunaeme Obiejesi.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
- O meela afọ 50 a lụrụ agha Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme
- Taa bụ January 15 bụ afọ 50 Agha Biafra biri
- Etu Uli/Amọka 'Airstrip' siri zọọ ndị Biafra
- Biafra: Ndị Naịjirịa ejibeghi ihe mere n'agha Biafra mụta ihe - Okey Ndibe
- Ụbọchị ncheta Biafra: Ka o si gaa
- Biafra at 50: Etu azụ okporoko si bata Naịjirịa n'ihi agha Bịafra