Biafra at 50: Etu Uli/Amọka 'Airstrip' siri zọọ ndị Biafra

Aha onyonyo, Uli/Amọka Airstrip: Etu Okporoụzọ ụgbọelu asiri zọọ ndị Biafra

Onye ọbụla ma maka agha Biafra ma maka okporoụzọ ụgbọelu si efedata ma fepu a kpọrọ "Uli Airstrip".

Okporoụzọ a toro ogo site Amọka ruo Uli.

Ọ bụ ebe a ka ụgbọelu na-ebute nri na ihe ndị ọzọ eji enyere ndị Biafra aka n'oge agha si abata.

N'ehihe, a na-eji igu na akwụkwọ ndụ ndi ọzọ mechie ya ka ndị Naịjirịa ghara ịhụ ya.

N'abalị, eji ọkụ gosi ebe ọ dị maka ụgbọelu ga-efedata.

Oge ahụ, ndị agha Naịjirịa emechiela ụzọ ihe si oshimiri abata.

Ọ bụkwa okporoụzọ ụgbọelu a ka onyeisi Biafra bụ Odumegwu Chukwuemeka Ojukwu siri gbaa ọsọndụ ka agha bịara na njedede.

Akụkọ ga-amasị gị