Innoson: Anyị anaghị amanye ndị mmadụ ka ha zụọ ụgbọala anyị - Innocent Chukwuma

Ụgbọala CAris nmke ndị INNOSON na-eme

Ebe foto si, INNOSON

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka akụkọ na-efegharị na ndị ụlọ ọmeiwu ukwu nke Naijirịa jụrụ ịnya ụgbọala nke emere na Naijirịa dịka ụgbọala ọrụ ha, ma sị na ọ bụ nke esi ala bekee bute ka ha chọrọ.

Akụkọ na-ekwu na ọ bụ na nzụkọ nke ha nwere n'ụbọchị ise nke ọnwa Febuarị afọ 2020 ka ha nwere mkpebi a.

Ndị omeiwu a sị na ọ bụ ụgbọala Toyota Camry nke afọ 2020 ka ha chọrọ.

Ndapụta a mere ka ndị mmadụ gaa na shọshal midia were kwupụta obi ha.

Na aka n ke ọzọ ka ọnyeisi ụlọọrụ na emepụta ụgbọala na NAijirịa bụ Innocent chukwuma kwuru sị " Ugbọala anyị na-arụ bụ onye chọọ, anyị eresi ya, ọnweghị onye anyị na amanye ga ọ zụọ ụgbọala anyị. Nke masịrị onye ya goro".

Aha onyonyo, Innoson Motors: Etu m si bido ịgba mbọ

O kwukwara sị na ha enweghị ikike ịmagide ndị ụloomeiwu ka ha zụo ụgbọala ha, were sị "anyị na-arụ ka ọ dịrị ndị be anyị mma, nke anyị na arụ be anyị bụ nke ndị be anyị. Onye chọo kwa nke ndị oyibo ya ga goro".

Chukwuma sị na ọ bụ ụgbọala emere na Naijirịa ka ọ na-anya ma sị na ihe kpatara o jị anya ya bụ na; " ọ na-atọ m ụto inya ya maka na ọ bụ na be anyị ka emere ya".

BBCIgbo kpọrọ onye na-ahu maka mgbasa ozi ndị ụlọomeiwu bụ Ben Kalu kama ọzaghi ekwe nti ya.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu a

Enigma kwuru sị na ọdịghị mma na ndị omeiwu na-amanye ndị mmadụ iri owkute sị na ọ bụ osikapa ma jụ ka ebunye ha ụgbọala Innoson.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Vick sị "ọ bụ gịnị mere ụgbọala Innoson? Ị gbachiri ịbụbata nrị ma ịmachịghị ibubata ụgbọala"

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Success Adams sị " A na-enye Innoson ntụrụugo na-erughị ya"

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Akụko ga-amasị gị