BBC Igbo at one: Igbanwe etu ihe dị na mbụ
Nke a emeela ya otu afọ ụlọọrụ BBC a malitere mgbasaozi dịka otu n'ime ndị e kewapụtara na mgbakwunye BBC W2020 maka ndị asụsụ na-abụghị bekee.

N'ime otu afọ ahụ, anyị etoola, kpọbata ndị ọhụrụ n'ọgbakọ anyị, mee ihe ndị a na-emetụbeghi mbụ makwa hụ ihe ọgbatuhie dị iche iche.

Mana n'ime ihe niile a, mụ na ndị otu m ka na-amụta nakwa na-amụgharị ihe, site n'iji ụkpụrụ e ji mara BBC mere ihe ntuziaka.
Anyị kụwara akị oyibo Nsugbe anyị nke mbụ - mgbe anyị na nwunye onye ndu ndị Ipob nwere mkparịtaụka, ebe o boro gọọmentị Naịjirịa ebubo na ha ma ebe di ya na-efu efu oge ahụ, nọ.
Anyị aghọtala mkpa dị n'ịrụkọ ọrụ na ndịnootu; ebe otu onye enweghi ikike, onye ọzọ enyere aka, na-agba mbọ ịhụ na ọrụ anyị na-aga siriri werere.
Otu ihe anyị atụwaghị anya bụ ụdịrị nkwugide na mmegide anyị na-enweta n'aka ndị na-akwado Biafra na ụfọdụ ndị Igbo ndị ọzọ na-ahụta anyị dịka 'igwe mba' BBC, maka akụkọ gbasara anyị agaghị echefu echefu na iwe si n'agha obodo Nigeria, nke ahụ bụ nke na-araghị ndị mmadụ ahụ ikwenye n'ime ya.

Ihe dị mkpa bụ ịmata na nke a bụ mbụ a na-esi etu a agbasa ozi n'asụsụ Igbo, site n'ụzọ mgbasa ozi ọhụrụ.
Ma anyị gbara nakwa na-agba mbọ ịhụ na anyị na-agbasa ozi n'ụzọ ziri ezi, bụ eziokwu nakwa nke metụtara ndị Igbo; ka oge na-aga, ndị na-abata n'ọgbakọ anyị na-enwe ntụkwasịobi na okwukwe n'ime anyị.
Anyị ezutela ndị ụfọdụ hụrụ ihe anyị na-eme na etu ọrụ anyị si emetụta ndị mmadụ n'ụzọ dị mma, n'anya, n'ime otu afọ a.

Otu ọmụmaatụ dị mma bụ etu gọọmentị Ebonyi steeti si tinye aka n'ihe gbasara osimiri nnu Ebonyi nke dị n'obodo Uburu, ka anyị kọchara akụkọ gbasara etu ụmụnwaanyị obodo ahụ na-esi emepụta nnu na ya bụ mmiri.
Akụkọ ọzọ butere mgbanwe a hụrụ anya bụ akụkọ gbasara Festus Ijeomah, otu nwoke ndị ụlọọrụ na-ahụ maka okporoụzọ bụ FRSC mebiri ụgbọala ya ma jụ imezi ya.
Ka anyị mechara akụkọ gbasara ya, ụlọọrụ ahụ gara buru ma mezie ya bụ ụgbọala wee bunyeghachị Festus; ha tinyere ya ihe ruru nde anọ.
Nso nso a, anyị gbaziri ndị ọzọ ụzọ site n'iji asụsụ igbo mee mkparịtaụka ndọrọndọrọ maka ntuliaka 2019, na steeti ndị dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ.

N'ime otu afọ a garala aga, anyị bu ndị na-abata n'ọgbakọ anyị n'obi; ọkwa maka ha ka anyị ji biri?
Kwa mgbe, anyị na-alaghachi, tulee ma chọpụta ụzọ dị iche iche anyị ga-esi mee ihe ka o yie ihe, ọkachasị ebe ọ gbasara igosipụta omenaala Igbo nye ndị na-abata ọgbakọ anyị.
Anyị erubeghi ebe anyị che na-anyị kwesịrị iru ugbua, mana anyị na-etinye uchu wee mara na ihe dị ka ụbọchị a n'afọ na-abịa, anyị ga-erugo ebe atụwaghị anya.















