BBC Igbo at one: Ndị bịarala n'ọgbakọ BBC Igbo n'otu afọ

Maka ọrụọma anyị na-arụ, ndị anyị na-akpọ oku maka ndọrịtaụka, ịgba ajụjụọnụ na ihe ndị ọzọ, na-abịa aza anyị oku.

Chimamanda Adichie
Nkọwa foto, Chimamanda Adichie bụ odeakwụkwọ a ma ama bịara ka anyị gbaa ya ajụjụọnụ
Solomon Mugera
Nkọwa foto, Solomon Mugera bụ onyeisi BBC na mpaghara Afrịka sokwa na ndị anyị nabatarala n'ụlọọrụ anyị
Emeka Opara na Kosi Udechukwu
Nkọwa foto, Emeka Opara na Kosi Udechukwu bịara soro anyị mee ndọrịtaụka n'ihe gbasara nwaanyị iketa ala na be nna ya
Pamela Udoka, Chisom Ojukwu, Roseann Nwamaka
Nkọwa foto, Pamela Udoka, Chisom Ojukwu na Roseann Nwamaka bịara soro anyị mee mkparịtaụka gbasara di na nwunye ịma ego ole onye na-akpata
Ebuka Obi-Uchendu
Nkọwa foto, Ebuka Obi-Uchendu e ji 'Big Brother Nigeria' mara, abịakutekwala
Ndị Lọndọn
Nkọwa foto, BBC Igbo agaruola Lọndọn. Ndị Igbo na-akwado anyị bi na mba dị iche iche
Nnamdi Kanu
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu bụ onye ndu ndị otu Ipob so na ndị aha ha na-ada ụda anyị zuterela
Emeka Anyaoku
Nkọwa foto, Emeka Anyaoku bụbu odeakwụkwọ kachasị na ngalaba Commonwealth so na ndị kpọtụrụla anyị n'ụlọọrụ anyị
CKN
Nkọwa foto, Onye ntaakụkọ Chris Kehinde Nwandu a ma dịka CKN bịakwara soro anyị mee mkparịtaụka
Jimmy Abia
Nkọwa foto, Jimmy Abia na Udo Agbarakwe bịara soro anyị mee mkparịtaụka gbasara Peter Obi na mgbajọ ntuliaka ndị Ipob
Oby Ezekwesili
Nkọwa foto, Oby Ezekwesili bụ onye ihe gbasara ikike dịịrị onye na-amasị, abịkwala n'ụlọọrụ anyị
'Gala Boy'
Nkọwa foto, Ugochukwu a ma dịka 'gala boy' maka inye ndị ụlọmkpọrọ gala ọ na-ere n'ụzọ, kpọtụrụ anyị
Nnia Nwodo
Nkọwa foto, Nnia Nwodo bụ onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bịakwara n'ụlọọrụ anyị
Ndị BBC Igbo
Nkọwa foto, Otiegwu a ma ama bụ Tobechukwu Ejiofor nke a ma dịka "Illbliss" bịara kpọtụrụ anyị
Amaechi Theo-Vincent, Ebere Ekeopara,...
Nkọwa foto, Ndị ọbịa anyị n'okwu 'Kedụ ihe ịchetara maka Agha Biafra'