Bola Tinubu Presidential rally: 'Ụnụ atufula vootu ụnụ' na ihe isii ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ Tinubu kwuru n'Enugu

Ebe foto si, Imo Government
Onye na-azọ ọkwa Onyeisiala n'afọ 2023, Senetọ Bola Ahmed Tinubu mere n'ụbọchị Wenezde, Jenụwari 11, 2022, akpọọla ndị si Owụwa-Anyanwụ oku ga ha.
“Ụnu atufula vootu unu, mepeenụ anya, tie aka n'obi gị, nọrọ nụ n'anwụ, nọrọnụ na mmiri, nwee obi siri ike, ga weta PVC gị."
Ihe asaa Tinubu gwara ndị Ọwụị̀a Anyanwụ dịka ọ gara Enugwu achụmnta vootu
N'ọgbakọ achụmntavootu ahụ, Tinubu kwere nkwa inye ndị Ọwụwa Anyanwụ ihe bụ oke ha na akụ Naijiria:
Lee mkpụrụokwu ole na ole n'ihe ndị o kwuru:
1: Tinubu tụrụ ilu sị " Ọ sọ gị gbaa onwe gị ọkụ n'aka, ọ sọ gị wepụ ntị gị, ipụghị imechi ụzọ mmeri."
2. "Nanị amaghị ihe ga-akwụchị ụzọ oloko na- agbasi ọsọ ike."
3. "Ndị isi pati APC juputara ebe a, onweghị onye na-enye unu ekene, mana unu na-arụsi ọrụ ike. Ụnụ na-agba mbọ, mana achọrọm ka ụnụ gbatikwo onwe unu maka pati a, ganye na unu enye m mmeri, ganye na Bola Tinubu abụrụ onye isi ala Naijiria.
4. "Ihe anyị ga-enye unu bụ nwa ntakịrị aka ka anyị ga-akụrụ ụnụ ma ọ bụ obere achịcha atinyere na mmiri odee ede"
5 "Ọ bụrụ na ụnụ atụnyerem vootu ma tinyekwara nke Gọvanọ, ụnụ ndị Enugwu ga-eketa oke na 'national cake' ”
6. “Ụnu atufula vootu unu, mepeenụ anya, tie aka n'obi gị, nọrọ nụ n'anwụ, nọrọnụ na mmiri, nwee obi siri ike, ga weta PVC gị."
7. "Na-agbanyeghị otu ọbụla ha si atinyere gị ogbauhie, enwela obi nkoropu, ya bụ pvc bụ akwụkwọ nwere onwe."
Ndị APC Enugu nwere agba abịaghị achụmta vootu Tinubu

Ebe foto si, Imo State Government
ụtụ ndị ọnụ n'eru n'okwu na pati APC Enugwu abịaghị achụm nta votu maka onye isi ala Naijiria nke Senetọ Bola Ahmed Tinubu mere ụnyịahụ bụ wed 11th January 2022. Isi okwu bụ na nsogbu dị ukwuu ebutela nkewa na APC Enugwu, nke na ọtụtụ n'ime ha ekwenyeghị na nhọpụta emere wepụta Ọka ikpe Ugo Agballa dịka onye isi pati ahụ n'Enugwu nakwa ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ.

Ebe foto si, Imo State Government
Ndị a iwe dị n'obi kewapụrụ onwe ha gụnyere, Minister n'ahụ maka Mba ọzọ bụ Geoffrey Onyeama, onye bubu Senate President, Ken Nnamani, Aka chiburu Enugwu bụ Ọka Ikpe Sullivan Chime, onye ndụmọdụ President Buhari na ihe gbasara Ikpe bụ Juliet Ibekaku, onye jibu ọkwa onye is pati APC n'Enugwu bụ Ben Nwoye, Emperor Baywood Ibe n'ọtụtụ ndị ọzọ.
Nsogbu APC n'Enugwu dịzị ka ihe dị ime ma kwọrọ nwa n'azụ n'ihi na ọbụghị nani na ndị nwere agba akwadoghị nhọpụta Ugo Agballa dịka onye isi Patị n'Enugwu, ha bokwara ya ebubo na orela ụlọ ejiri mara APC na GRA Enugwu ma kwaga ndị ọrụ ebe ọzọ. Ebubo ọzọkwa na ebute nnukwu nsogbu na pati Ahụ bụ ka ha siri kee ego karịrị out ijeri dollar bụ ego ha nwetara n'aka pati.
Okpara Square ejughị eju

Ebe foto si, Imo steeti Government
Ndị otu pati APC pụtara ịnabata ma kwado Seneto Tinubu mana ha ejughị eju ka a tụrụ anya n'ihi na ha ofu obi anọghịzị. N'okwu ya, Gọvanọ Hope Uzodimma yọrọ Tinubu mgbaghara na ndị mmadụ apụtaghị etu ha kwesiri. Uzodimma kwuru na site taa gaba na ya ga atinyesi aka ike ịhụ na ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ n'enye nkwado ha.

Ndị ozo kwugasịrị okwu na ya bụ mme mme were yọ ndị igbo ka ha tinyere Tinubu votu gunyere Gọvanọ Ebonyi Dave Umahi, APC governorshi candidate Ebonyi, Ognonna Nwifuru, onye na azọ gọvanọ Enugwu Uche Nnaji, Sinato Andy Uba, Adams Oshiomale, Abike Dabirj na ọtụtụ ndị ọzọ.













