Etu nsogbu dị na PDP na APC nwereike isi metụta ntuliaka 2023

Pati abụọ nwere agba na Naịjirịa nwere ọgbaghara na-ada n'ime ụlọ ha ugbua.

Ebe foto si, Facebook

Nkọwa foto, Pati abụọ nwere agba na Naịjirịa nwere ọgbaghara na-ada n'ime ụlọ ha ugbua.

Dịka ntuliaka 2023 ji ọsọ agba, achụmntavootu ga-amalite kpọm kwem n’ụbọchị 28 nke ọnwa Sepụtemba mana pati abụọ nwere agba na Naịjirịa nọ n’ọnọdụ kata kata.

Nsogbu ndị na-eselite isi na pati abụọ a bụ People’s Democrative Party (PDP) na All Progressives Congress (APC) abụrụla ihe ọha na-agba nkiri n’oge ntuliaka a.

Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị ekwuola na ọ bụrụ na patị abụọ a esepụghị aka enwe n’ofe, na o nwere ike ịghọ aka mmadụ.

Atiku na Wike ka na-atakọta isi ọnụ n'okwu onye nọ n'isi oche pati ahụ

Ebe foto si, Atiku Abubakar/Nyesome Wike/Facebook

Nkọwa foto, Atiku na Wike ka na-atakọta isi ọnụ n'okwu onye nọ n'isi oche pati ahụ

Nsogbu na-echere PDP aka mgba

Ọ bụghị akụkọ ọhụrụ na kemgbe PDP mechapụrụ ntuliaka ime ụlọ ha na nsogbu si azụ ụlọ banye be ha.

Na ụbọchị 21 nke ọnwa Septemba a, gọvanọ Nyesom Wike nke Rịvas steeti na ụfọdụ ndị kwụnyere ya na patị ahụ kwuru n’ọha na ha agaghị esozi n’otu na-ahazị achụmnta vootu na patị ahụ bụ otu a kpọrọ ‘Campaign Council’.

O kwuru na ha na-eme nke a n’ihi onyeisi oche pati ahụ bụ Iyorcha Ayu ekweghị enye onye ọzọ si na mpaghara ndịdịa anyanwụ ohere ịnọ na ya bụ ọkwa.

Otu onye ọkaibe n’okwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Sani Bala gwara BBC na okwu mpaghara ebe ndị mmadụ si so n’ihe kacha emebi ihe na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa.

O kwuru “Ndị mpaghara ugwu kwesịrị igosi ọchịchọ ihe gbasara ndị ndịda, ndị ndịda kwesịrị igosi ọchịchị ihe gbasara ndị ugwu.”

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Cheta na Wike arụọla aka ugboro ugboro na etu Ayu siri nọrọ n’ọkwa ahụ megidere iwu patị ahụ nke metụtara iweghari ọchịchị si na mpaghara gaa mpaghara.

Mana okwu Wike na PDP nwere metụtakwara onye ji ọkọlọtọ patị ahụ azọ ọkwa onyeisiala 2023 bụ Atiku Abubukar.

Okwu ya na Atiku dapụtara dịka o nweteghị mmerị na ntuliaka ime ụlọ patị ahụ e mere n’ọnwa Maachị.

Wike pụtara dịka onye so Atiku na-azụ na ya bụ ntuliaka, dịka o bụ onye si mpaghara ndịda Naịjirịa ma bụrụkwa onye okpukperechi Kraịsti, ọtụtụ tụrụ anya na Atiku ga-ahọrọ ya dịka osote ya mana Atiku kpọpụtara aha gọvanọ Ifeanyi Okowa nke Delta steeti dịka osote ya.

Nke a mere ka iwe Wike dị ọkụ dịka o kwuru na Atiku egeghị ndụmọdụ kọmitịị patị ahụ nke Samuel Ortom nọ n’isi ya nyere maka nhọpụta osote onyeisiala ntị.

Bala kwuru na “Ọ bụrụ na PDP chọrọ inweta mmerị na ntuliaka 2023, ha kwesiri ikpezi okwu nọ n’etiti Wike na Atiku ngwa ngwa”

Mgbe nke a mere, Wike “O nweghị onye m bụ odibo ya, agaghị m abụ odibo onye ọbụla.”

O kwekwara nkwa ugboro ugboro na ọ ga-agba n’ọha ihe nzizo ndị na-eme na pati ahụ.

N’ụbọchị 23 nke ọnwa Septemba, Wike boro Iyorchia Ayu ebubo na o tinyere aka n’usoro na-ezighi ezi na nhazi ntuliaka ime ụlọ patị ahụ.

O kwuru “Ọ (Ayu) ji ụzọ agụghọ megherie ndị ‘delegates’ anya, E nweghị ihe ọ meghị iji hụ na Wike enwetaghị mmerị”

 Bala kwukwara na dịka oge ntuliaka nọzị nso na ọtụtụ patị ga-achọ ebe ọpịọ dị na patị ndị ọzọ ma si ụzọ ahụ na-akwanye ọkụ nsogbu na pati ha dịka nke a ga-enyere ha aka nweta mmerị.

Ọtụtụ akatọọla nhọrọ ndị alakụba abụọ ịzọ ọkwa onyeisiala na osote ya n'APC.

Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/Facebook

Nkọwa foto, Ọtụtụ akatọọla nhọrọ ndị alakụba abụọ ịzọ ọkwa onyeisiala na osote ya n'APC.

Nsogbu na-echere APC aka mgba

Ebe nsogbu APC na nso nso so pụtara ihe mgbe onye ji ọkọlọtọ patị ahụ azọ ọkwa onyeisiala bụ Bola Ahmed Tinubu kpọpụtara aha Kashim Shettima dịka osote ya.

Ọtụtụ katọrọ mkpọpụta nke a n’ihi ha abụọ bụ ndị okpukperechi alakụba. Agbanyeghị na iwu Naịjirịa emegideghị nke a, omenala ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa kemgbe na-akwado ka onye okpukperechi Kraịstị na onye okpukperechi alakụba zọkọọ ọkwa abụọ ahụ. Nke a bụ iji hụ na e tinyere ndị ebe a, e tinyere ndị ebe a.

Otu nwoke ọzọ bụ ọkaibe n’okwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Lekan Ige gwara BBC na okwu okpukperechi bụ okpotokpo okwu ugbua na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa.

O kwuru na mgbe ụdịrị ihe mebụrụ bụ mgbe ndị alakụba abụọ zọkọrọ ọkwa onyeisiala na osote ya na 1993, ọnọdụ ịdịnaotu Naịjịrịa adabeghị etụ a.

Ige kwuru “Ọ dịzịrị ndị APC ikpezi iwe dị n’etiti ndị otu ha ma ọ bụrụ na ha chọọ ọdịmma patị ha ugbua.”

Otu onye nwere agba na patị ahụ ma bụrụkwa onye bụbu ọdeakwụkwọ gọọmentị etiti bụ Lawal so katọọ ihe a ma kwuo “Ndị nille hụrụ ịdịnaotu Naịjriịa n’anya ọkachasị ndị si mpaghara ugwu kwesịrị ịma nhọpụta ndị alakụba abụọ a agaghị achịta aja.”

Onye bụbu onyeisi ụlọomeiwu nta Naịjirịa bụ Yakubu Dogara katọkwara nke a n’ọnwa a ma kwuo na ọ kwunyeghịrị ya bụ ihe.

O kwuru na ọgbakọ Nigeria National Christian bụ ọgbakọ ndị otu jịkorọ ụka Kraịstị e mere n’Abuja ma kwuo “Aga m e foro ntutu taa ịhụ na ndị ụka Kraịsti emefughị vootu ha n’efu”

Nsogbo ozọ bụkwa nsogbo nọ n’etiti Ahmed Lawan na Bashir Machina. Ka ọ dị ugbua, onyeisi ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa bụ Ahmed Lawan agaghị eso zọọ ọkwa Sineti na 2023. Nke a bụ ihe gbara n’ọha dịka ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec n’ịchafụ zipụtara akwụkwọ ndị ga-azọ ọkwa n’izuụka a.

Lawan so na ndị zọrọ ntuliaka imeụlọ APC maka ọkwa onyeisiala, mana ọ nwetara naanị vootu 152.

Akụkọ kwuru na oge Lawan chọrọ ịlaghachi azụ ga zọọ ọkwa Sineti nke Yobe North, onye meriri ntuliaka imeụlọ APC maka ọkwa ahụ bụ Bashir Machina jụrụ ajụ irituru ya. Nke a e bụtela ọtụtụ okwu n’etiti ha abụọ dịka Machina ka gbara isi akwara n’ọkwa ahụ.

Ka ọ dị ugbua, Inec etinyeghị ma aha Ahmed Lawan ma nke Bashir Machina n'akwụkwọ a ha bipụtara.

Kemgbe ọchịchị onye kwuo uche ya lọghachịtere na 1999, Naịjirịa enwebeghị ọnọdụ patị atọ na-azọ onye ga-enweta mmeri na ntuliaka.

Ebe foto si, Cosmos Nayaba

Nkọwa foto, Kemgbe ọchịchị onye kwuo uche ya lọghachịtere na 1999, Naịjirịa enwebeghị ọnọdụ patị atọ na-azọ onye ga-enweta mmeri na ntuliaka.

Owuwu aha pati ọzọ

Anya ọha na-ele pati abụọ a dịka ihe ndị a na-echere ha aka mgba nakwa otu ihe ọzọ bụ mpụta patị ọzọ na-ewu ewu ugbua nke na-emetubeghị na nso nso na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjriịa.

Etu aha pati Labour party na onye ji ọkọtọlọ patị ahụ azọ ọkwa onyeisiala bụ Peter Obi si ewu abụrụla ihe ịtụnaya nye ndị ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa.

Ite nọ n'ọkụ na-esi ugbua, dịka ọha na-echezị ka nrị ghee na ntuliaka 2023.

Bala na Ige gbara ama na ihe ndị ga-emetụta ntuliaka a na-abịa mana amabeghị etu ya bụ ihe ga-esi gaa.