Muslim -Muslim ticket: Ndị ụkọchukwu na ndị ọzọ amanyela ọnụ ha n'okwu

Oluoma, Yesufu, Addo Facebook Page

Ebe foto si, Oluoma, Yesufu, Addo Facebook Page

Nkọwa foto, Oluoma, Yesufu, Addo bụ ndị na-ekwu

Kamgbe Bola Ahmed Tinubu jị ọkọlọtọ All Progressive Congress azọ ọkwa onye isiala nakwa onye okpukperechi alakụba kpọpụtara osote ya bụ Kashim Shettima bụkwa onye okpukperechi alakụba, soshal midia enwụrụla ọkụ.

Ndị kwe na ndị ekweghị tinyere ọnụ na ya bụ okwu ma na-ekwu uche ha.

Fada Oluoima Facebook Page

Ebe foto si, Fada Oluoma Facebook page

Nkọwa foto, Fada Oluoma bụ ụkọchukwu na-ekwukarị maka ọdịmma obodo

Fada Oluoma bụ ụkọchukwu na Katọlịk Archdiocese Abuja ama ama ekwuola na ọdịghị mma ka ndị mmadụ kwawa akwa maka etu pati APC si wepụta ndị alakụba abụọ ga-azọtara ọkwa onyeisiala 2023.

O kwuru na e nwere pati ndị ọzọ na-esoghị ntụziaka ahụ, ụmụ Naịjirịa nwerike isi na ha họrọ ma tụnyere vootu.

O depụtara uche ya na twitter ebe ọ sị na etu ọtụtụ Ụmụ Naịjirịa na-akwa akwa maka ya bụ ihe APC mere gosiri na ha adịghị njikere igbanwe etu ihe si kwụrụ na Naịjirịa nakwa ime mkpebi zuruoke.

Ọ gara n'ihu kwuo na ihe mere APC ji mee ihe bekee kpọrọ "Muslim-Muslim ticket bụ makana ha chọrọ ka ha nweta ọtụtụ vootu na ka ndị ugwu na-ekpe alakụba ọnụọgụgụ ha gbalitere.

"O gosiri na APC na-achọ vootu ha ga-enwete karịa irubere ndọrọndọrọ ọchịchị okpukperechi isi."

" Ihe kwesiri ị bụ isi sekpụ ntị na ntụliaka na-abịanụ bụ ntọzụ, ikwu eziokwu nakwa ikpe kwụ ọtọ."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Aisha Yesufu Facebook Page

Ebe foto si, Aisha Yesufu Facebook Page

Nkọwa foto, Aisha Yesufu so na otu n'ime ndị bu ngaghariwe Endsars mere n'afọ 2020
Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Aisha Yesufu bụ onye na-ahụ maka ikike dịrị onwe kwuru na atụmaatụ 'Muslim -Muslim ticket' pati APC ji aga bụ mkparị nye nhatanha nakwa ikpe nkụmọtọ.

"O gosiri na ndị APC enweghị ihe ha ji ụmụ Naịjirịa kpọrọ maọlị, ha chee na ọ bụ atụmaatụ ka mma karịa ịkwanyere ụmụ Naịjirịa ugwu.", bụ ihe Aisha Yesufu depụịtara n'akara twitter ya."

Elisha Abbo

Ebe foto si, Elisha Abbo Facebook Page

Nkọwa foto, Elisha Abbo na-anọchịte anya Adamawa North Senetorial Zone

Senator Elisha Abbo na-anọchịte anya Adamawa North Senetorial Zone gbara arụkwaghịm dịka otu onye so na ọgbakọ pati APC hibere maka ịchụ nta vootu nye Bola Ahmed Tinubu.

Abbo kwuru n'onyonyo ndị Arise tv gosiri na obi ya aghaghị ekwe ya gawa n'ihu ịkwado ịchụ nta vootu pati ahụ maka na atụmaatụ 'Muslim-Muslim ticket' APC ga-etisa udo na ọganihu Naịjirịa.

O kwuru na o nweghị mgbe Tinubu ji jụọ ese tupu o mee ihe o mere kama ọ dịbụ ha n'obi imee iwepụta 'Muslim-Muslim ticket'.

'Muslim - Muslim ticket' bu ọrụ Chukwu - Onyeisi Apc

Abdullahi Adamu bụ onyeisi APC na Naịjirịa

Ebe foto si, Abdullahi Adamu

Nkọwa foto, Abdullahi Adamu bụ onyeisi APC na Naịjirịa

Onyeisi All Progressives Congress (APC) bụ Abdullahi Adamu akọwala atụmaatụ 'Muslim-Muslim ticket' dịka aka ọrụ chukwu, ma na-ekwu na ndị okpukperechi Kraist na-eti mkpụ enwela ụjọ ọbụla.

Adamu kwuru na obi siri ya ike na pati APC ga-emerị na ntụliaka gọvanọ a na-eme n'Osun steeti iji wee gosi udiri mmeri ha ga-enwe na ntuliaka 2023.

Adamu kwuru ihe ndị a mgbe ọ kpọ ndị isi pati APC ga kele onyeisiala Muhammadu Buhari na Daura bụ obodo ya dị Katsina steeti.

O kwuru APC gabigara ọtụtụ ihe tupu ha họpụta Kashim Shettima dịka osote Bola Ahmed Tinubu.

Adamu kwuru na Shettima bụ onye Naịjirịa na-ekwesighị ịbụ onye okpukperechi ọbụla tupu ahọpụta ya dịka osote nye onye ọbụla na-azọ ọkwa onyeisiala.

O kwuru ka ụmụ Naịjirịa leghara ndọrọndọrọ ọchịchị okpukperechi ma tinye anya na atụmaatụ ga-ewulite ọganihu obodo.