Ihe mere n'oge nke Abiola na 1993 ga-emekwa ọzọ na 2023 - Tinubu

Ebe foto si, Bola Tinubu/Twitter
Aka chịburu Lagos Steeti ma bụrụkwa onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na pati 'All Progressives Congress' bụ Bola Tinubu, ekwuola na ihe mere na ntuliaka Naịjirịa n'afọ 1993 ga-emekwa ọzọ n'afọ 2023.
Tinubu kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara iji kọwaa ihe mere o ji họrọ aka chịburu Borno Steeti bụ Kashim Shettima dịka osote ya.
Shettima na Tinubu bụcha ndị okpukperechi Islam, nke mere ọtụtụ ji akatọ pati APC maka ịgbakụta ndị okpukperechi Kraịst azụ.
N'akwụkwọ ozi ya, Tinubu kwuru na ya ghọtara nke ọma na okpukperechi dị nnukwu mkpa na Naịjirịa, "mana ọrụ chere anyị n'ihu ugbua abụghị okwu okpukperechi, kama ọ bụ maka onye bụ ọkaibe n'ịrụ ya bụ ọrụ."
"Ekwenyere m na onye a m họpụtara bụ onye ga-enyere m aka ịchị Naịjirịa nke ọma, n'agbanyeghị agbụrụ maọbụ okpukperechi o si na ya," Tinubu kwuru.
"Iji weta ọganihu n'obodo anyị bụ Naịjirịa, oge eruola mgbe anyị ga-esi n'ụzọ ochie anyị pụta."
"Na 1993, ụmụ Naịjirịa niile kwadoro MKO Abiola na Baba Gana Kingibe, ha abụọ bụcha ndị Islam, mana ntuliaka ahụ bụ nke kacha gaa nke ọma na Naịjirịa."
"Mmụọ nke 1993 abịakwasala anyị ọzọ na 2023."
Gịnị mere na 1993?

Ebe foto si, Getty Images
N'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa June afọ 1993, Naịjirịa mere ntuliaka iji họpụta onyeisiala ga-ewere ọchịchị n'aka ndị agha bụ ndị weghaara ochịchị n'afọ 1983.
Na ntuliaka ahụ, Moshood Kashimawo Abiola onye zọrọ ọkwa onyeisiala na pati 'Social Democratic Party', ebe Baba Gana Kingigbe bụ osote ya. Ha abụọ bụcha ndị okpukperechi Islam.
Ọ bụ eziokwu na onye agha Ibrahim Babangida, onyeisiala nọ n'ọchịchị n'oge ahụ, kagburu ya bụ ntuliaka, ọtụtụ kwuru na ọ bụ Abiola na Kingigbe meriri.
Dịka Babangida kagburu ntuliaka ahụ, Abiola jiri aka ya kpọpụta onwe ya dịka onyeisiala Naịjirịa n'ọnwa June afọ 1994.
Mana Sani Abacha, onye agha weghaara ọchịchị n'aka Babangida, nwụchiri Abiola, tụkpuo ya na mkpọrọ ebe ọ nọrọ nwụọ n'abalị asaa nke ọnwa Julaị afọ 1998.
Tinubu ahọpụtala Kashim Shettima dịka osote ya

Ebe foto si, BATinubu Facebook/Getty Images
Bola Ahmed Tinubu nke ji pati All Progressives Congress (APC) azọ ọkwa onyeisiala Naịjiria n’afọ 2023, ahọpụtala Sinetọ Kashim Shettima dịka osote ya.
Tinubu kwuputere nke a dịka ya na Onyeisiala Muhammadu Buhari nwechara nzukọ n'obodo ya na Daura, Katsina steeti, n'ụbọchị ụka.
Ọ sị na ọ họpụtara Shettima bụbu gọvanọ Borno steeti, n'ihi na ọ "ma ihe ọrụ nyịrị, ọ ga-emeli ihe dị na ya, o ruru iji mee osote onyeisiala."
Cheta na Tinubu họpụtaburu Ibrahim Masari dịka onye ga-anọ dịka osote onyeisiala ruo mgbe ọ họpụtara onye ọzọ.
Ihe ị kwesịrị ịma maka Kashim Shettima
- A mụrụ ya n'abalị abụọ nke ọnwa Septemba, n'afọ 1966
- Ọ rụrụ dịka kọmishọna na ministrị ise dị iche iche site n'afọ 2007 ruo 2011
- Ọ bụbu gọvanọ Borno steeti site n'afọ 2011 ruo 2019
- Ọ banyere n'ụlọomeiwu Ukwu Naịjiria mgbe ọ zọtara oche inọchi anya ndị Borno Sentralụ, n'afọ 2019
- Ọ gara mahadum na mahadum Maiduguri nakwa nke Ibadan, ebe o si banye ọrụ ụlọakụ tupu ọ banye ndọrọndọrọ ọchịchị
- Ọ bụ nwa Kashim Ibrahim bụbu gọvanọ mpaghara Ugwu Naịjiria site n'afọ 1962 ruo 1966
- Ọ bụ n'oge Shettima nọ n'ọchịchị ka otu oyindụegwu Boko Haram tọdoro Borno steeti n'akpịrị, mana ọ gbara mbọ na-arụ ọrụ ya dịka aka na-achị steeti ahụ.








