Peter Obi: Achọrọ m ka a tụnyere m n'ihi na m ma ihe ekwe na-akụ, ọ bụghị maka ebe m si

Ebe foto si, Peter Obi_Facebook
Onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naijiria n'aha otu 'Labour Party' bụ Peter Obi ekwuola ihe mere o jiri họrọ Yusuf Datti dịka Osote ya na ntuliaka 2023.
Obi kwuru na mkparịtaụka ya na BBC nwere na ihe mere ya jiri họrọ Yusuf Datti ka ọ bụrụ osote ya bụ na "anyị enyochara Datti, hụ na o tozuru ihe a chọrọ iji gbanwee ọnọdụ Naijiria".
O kwuru na ebumnobi ya bụ igbo nsogbu enweghị nchekwa na ịdọpụta ụmụ Naijirria n'ụbịam.
N'okwu ndị na-akparị ndị mmadụ na soshal midia n'ihi ya, Obi kwuru na ọ bụghị nani ndị na-akwado ya na eme nke a, "ụfọdụ ndị na-akparị ndị mmadụ na soshal midia bụ ndị na-azọsara m ọkwa onyeisiala gobiri ha iji mebie aha m".
N'okwu agbụrụ na okpukperechi, Obi sịrị na " achọghị ka a tụnyere n'ihi na m si na Ọwụwa Anyanwụ, achọrọ m ka a tụnyere m maka nka nwere ime ka Naijiria dị mma. Ọ bụghị n'ihi ebe m si".
Ọ kọwara na ya bụ mmadụ okwu ọdịmma Naijiria na-anọ ya ọkụ n'obi.
Cheta na Obi bụ aka chiburu Anambara steeti si na otu PDP banye Labour party tupu ntuliaka imeụlọ PDP bụ ebe o nwetara ikike ịzọ ọkwa onyeisiala n'aha pati ahụ.
Kemgbe ahụ, aha ya na-ewu na soshal midia dịka ọtụtụ ndị ntorobia kpụ ya n'ọnụ n'ihi olileanya ha na ọ bụ ya ga-agbanwe ọnọdụ akụnaụba Naijiria na-adakpo n'ihi tigbuo zogbuo na ụbịam.



