Ihe mere ndị Okpanam ji sị ndị Fulani nọ be ha laa

Ndị obodo Okpanam dị n'Okpuruọchịchị Oshimili North na Delta Steeti enyela ndị Fulani bịara ọhụrụ na be ha iwu ka ha kwapụ ngwangwa maọbụ ha achụpụ ha.
Ndi Eze na ndị obodo na ndị uweojii gara n'ime ọhịa dị n'Obodogba ileta ebe ndị Fulani bi.
Onyeisi ndị ụmụntorobịa na Okpanam bụ Lucky Okolo sị na, "mgbe anyị ruru ebe ndị Fulani nọ n'ime ọhịa ahụ, ọtụtụ n'ime ha gbawara ọsọ".
Ọ sị na ndị uweojii ya na ha so gwara ha ka ha ghara ịgba ọsọ, na ha bịara nzuko.
Ọ sị na ụfọdụ ndị kara obi nọrọ bụ ụmụnwaanyị na ụmụaka na ụfọdụ ụmụnwoke kara obi.
Ọ sị na ha gwara ha ka ha zie ndị otu ha bịara ọhụrụ ka ha kwapụ na be ha, ma gwa ndị nọbu kemgbe ka ha bịa ọgpakọ na nke Igwe obodo ka ha nwee nkwekọrịta etu ha ga-esi nọrọ ebe ahụ.
Ha gwakwara ha na ha batara ebe ahụ na-enweghị nkwekọrịta ndị obodo. Ha bịa ọgbakọ n'izu na-abịa ka ha mara ndị ha bụ, nwee nkwekọrịta.
Ọ sị na ndi nnọchiteanya ogbe ise ha nwere bụ ndị ga-abịa ya bụ ọgbakọ.

Ihe meburu
Ndị obodo Okpanam dị n'Okpuruọchịchị Oshimili North na Delta Steeti tiri mkpu maka ndị ha sị bụ ndị Fulani karịrị narị abụọ gara kpara obi na mpaghara Obodogba dị n'Okpanam.
Onyeisi ụmụntorobịa n'Okpanam bụ Lucky Okolo, gwara BBC Igbo na ya bụ okwu amaliteghị taa.
Ọ sị na ndị ahụ bụ ndị Fulani batara Okpanam ọhụru na-ejighi ikike onye ọbụla.

Eze Obodo Okpanam bụ Michael Ogbolu (Ugoani) gwara ndị ntaakụkọ na ya enyeghị ndị ọhụru ahụ ikike ịnọ ebe ahụ, na ya nyere ha naanị ụbọchị iri na anọ isi ebe ahụ laa ebe ha siri.
Ugoani kwuru nke a mgbe ha kuliri na mkparịtaụka ha na ndị Fulani ahụ nwere be Igwe n'Okpanam ya na onyeisioche Okpuruọchịchị Oshimiri North bụ Innocent Esewezie .

N'afọ 2020 ka onyeisi oche ndị Okpuruọchịchị ahụ mgbe ahụ bụ Louis Ndukwe gwara ndị Fulani niile nọ na be ha chọta ụlọ n'ebe ndị mmadụ bi si n'ime ọhịa pụọ, iwu ha tiri n'ụlọomeiwu.









