APC Presidential Primaries: Peter Obi ga-emecha chọpụta na ọ bụ ego ka e ji eme ndọrọndọrọ ọchịchị - Joe Igbokwe
Onye enyemaka Gọvọnọ Legọs Steeti na mkpocha na nzacha bụ Joe Igbokwe akọwala ya bụ ebubo ndị mmadụ na-ebo gbasara ije ego gara n'ọgbakọ APC ha jiri wepụta Bola Tinubu bụ onye ga-eburu ha ọkọlọtọ na ntuliaka onyeisiala nke 2023.
Igbokwe, onye BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ sị na ego enyere ndị "delegate" na ntụlịaka imeụlọ ha mere abụghị ngarị, kama ihe ọ kpọrọ "Logistic", "ka ọ ga-abụ akpọọ onye ahụ oku echi ọza gị".
Igbokwe sị na ịzọ ndọrọndọrọ abụghị egwu ụmụazị, na ọ bụ ego ka e ji eme ya.
O kwuru na ego ndị ahụ bụ ihe e ji etinye ndị ahụ na họtelụ, nye ha nri na ihe ndị ọzọ.
O kwuru na Peter Obi na-eme na ya anaghị enye ndị mmadụ ego ga-emecha chọpụta na " a naghị agba aka ụkpọrọ ahụ nwata na-epu eze n'ọnụ."
O kwuru na mmadụ iri isii nọchitere anya ndị steeti Legọs na ya bụ ọgbakọ bụ ego ka e jiri kpọga ha ebe ahụ.

Ọ zakwara ajụjụ maka ohere ndị Igbo nwere ịzọta ọkwa onyeisiala Naịjirịa, bụ nke o ji ilu kọwaa sị, "ọkụkọ ga-abụ okeọkpa, a na-ama ya n'ụtụtụ".
Nke a pụtara na a na-amalite gboo kwadowe ịzọ ya bụ ọkwa. "Ọ bụghị ihe a na-aba n'ike".
O kwuru na ndị Igbo e bidoghị n'oge kwadowe ya bụ njem, nke mere na ọ ga-ahịa ha ahụ inweta ya.
O kwuru na uche Bola Tinubu adịla n'ọkwa onyeisiala Naịjirịa kemgbe 1990. Igbokwe sị na ndị Igbo agbajichaala akwammiri niile ha ruburu mbụ kaara ịnyere ha aka ịzọta ya bu ọkwa.
Gee ya ntị n'ihe onyonyo a pụrụiche.












