Aston Villa vs Liverpool: A kọọla Liverpool ka ncha nkọta

Aston Villa na Liverpool

Ebe foto si, Getty Images

Aston Villa gwọrọ Liverpool nnọọ ọrịa ji ha site n'iji ọkpụ goolu asaa asatara abụọ merie ha n'asọmpi Premier League.

Goolu malitere izu ka mmiri n'elu ụlọ ndị Liverpool na nkeji 4' mgbe Ollie Watkins nyere goolu mbụ.

Liverpool ka che na Aston Villa bịara ihe egwuregwu mgbe nwa amadị a nyere goolu nke abụọ na nkeji 23'.

Mana Mohammed Salah kpotere ndị Liverpool n'ụra site na goolu o nyere na nkeji 33'.

Na-egbughi oge John McGinn nke Aston Villa sụnyere goolu nke atọ ya na nkeji 35' iji gwa Liverpool na sụrụgede abụghị egwu ụmụaka.

Tupu Liverpool ekuru mmiri tọgbọ ike Ollie Watkin mezuru ya goolu anọ na nkeji 39', bụ goolu nke atọ ọ na-enye n'asọmpi a.

Dịka ọkara nke abụọ malitere, Ross Barkley nke Aston Villa ji goolu ọzọ nabata Liverpool na nkeji 55'.

Mohammed Salah zaghachịrị ha oku a na nkeji 55' site n'inye goolu nke abụọ ndị Liverpool.

Mana o mere ndị Liverpool vuum n'anya ka ndị mgbe Jack Grealish nyere goolu ọzọ n'aha Aston Villa na nkeji 66'.

Liverpool chere na ụka agbasala mana Aston Villa ji goolu ọzọ s n'aka Grealish na nkeji 75' nke asaa gwa ha na 'onwebeghi ihe ị hụrụ gị na-akpọ kashị'.

Ụdị mmeri a ga-abụ mbụ a na-eji etu a emeri otu egwuregwu mabutere iko Premier League.

Ọ ga-abụ nke mbụ a na-eji goolu ruru asaa emeri otu Liverpool kamgbe afọ 1968 (afọ 57 gara aga), mgbe Tottenham meriri ha.

Tottenham amịkpọọla Man United n'anwụ ka azụ Mangala

Mgbe Son were De Gea solo

Ebe foto si, Premier League/Twitter

Tottenham mere Manchester ụra aga n'anya n'asọmpi Premier League site n'iji ọkpụ goolu anọ asatara otu merie ha.

A kwọbeghi 'beans' n'asọmpi a mọị mọị malite isi na nkeji 2' mgbe Bruno Fernandes ji penariti nye goolu mbụ ndị Man U.

N'otu ntabi anya ahụ Tottenham gwara Man United na ha abịaghị ịchị ma saa goolu a site n'aka Tanguy Ndombele na nkeji 4'.

Tupu Man United amata nke ekwe na-akụ Tottenham mezuru ya goolu abụọ na nkeji 4', nke Heung-Min Son nyere.

O kpu pịpịrọ ji akwụkwọ ọbara ọbara chụpụ Anthony Martial na nkeji 28' maka ịma onye Tottenham ụra.

Nke a nyere ndị Tottenham ohere iji ndị Man United gwuo egwo ka ụmụaka na-amụ amụ.

Na nkeji 30' na 37', Tottenham yere goolu abụọ site n'aka Harry Kane na Heung-Min Son iji mee ya goolu anọ.

Ka ọkara nke abụọ malitere, Serge Aurier mezuru ya goolu ise na nkeji 51'.

Tottenhma malitere iji Man United agba okoso nke mere Paul Pogba ji gbara penariti na nkeji 79' nke Harry Kane nyere goolu ya.

Mmeri a tụrụ ndị Man United n'anya maka na ọ bụ n'ụlọ ha ka Tottenham bịara tie ha mmanwụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: