Abakaliki Catholic Diocese: Etu ngaghari iwe e mere maka Fada siri gbaa ihe e zoro ezo n'anwụ

Ebe foto si, Kingsley Aman
Kemgbe akụkọ gbara na ụfọdụ ndị ụka Katolik na Dayọsis Abakaliki, Ebonyi steeti, mere ngagharịiwe n'ihi nkwụsị ọrụ a kwụsịrị otu ụkọchukwu ha, ihe na-arịtụ na-arụtụ aka na mmiri agbarụọla n'ụlọụka.
N'abalị 14 nke ọnwa Novemba afọ, 2021,ọtụtụ ndị ụka Katọlik wụjuru na 'Pastoral Centre Chaplaincy, Abakaliki' bụ be nnukwu Ụkọchukwu ha bụ Bishọpụ Peter Nworie Chukwu mee ngagharịiwe maka etu e si kwụsị Fada John Odey ọrụ n'ike.
John Odey bụ ụkọchukwu na-achịkọta ụlọụka 'Holy Trinity Catholic Church', Umuoguduakpu, Otinyi-Ngbo dị n' Okpuru Ọchịchị Ohaukwu n'Ebonyi Steeti.

Ebe foto si, Benedict Okoro
Bishọpụ kwụsịrị ya bụ Fada ọrụ abalị ole na ole o bipụtachara akwụkwọ nke ọ kpọrọ "The Hidden Truth and the Cloud of Witness".
N'ime akwụkwọ ahụ, Fada Odey dere, o boro otu ụkọchukwu aha ya bụ Fada Emmanuel Obuna ebubo,na ọ bụ ya nyụrụ ihe na-esi na dayosis Abakiliki ihe ruru iri afọ atọ.

Ebe foto si, Fr John Odey
Fada Emmanuel Obuna rụburu ọrụ dịka Odeakwụkwọ Bishọpụ Michael Okoro bụ Bishọpụ na-achịkọtabu dayosis ahụ ,onye larala ezumike nka.
N'ime akwụkwọ ahụ dị ibe 479,John Odey depụtachara ihe ndị megara oge niile Bishọp Okoro nọ n'ọkwa nke o jiri rụọ Fada Emmanuel Obuna aka dịka onye na-ekpe ma na-ebi okwu na dayọsis ahụ.

Ebe foto si, Screengrab
O kwukwara na Emmanuel Obuna anaghị ekwe ka ndị ụkọchukwu ndị ọzọ rue Bishopụ nso.
Akwụkwọ ahụ kọwakwara ihe butere nghọtahịe nke mere ka Bishopụ Michael Okoro kwụsịbuo Fada Odey ọrụ n'ike n'afọ 2009.
Ngwa ngwa akwụkwọ ahụ nke e wepụtara n'ọha n'abalị 23 nke ọnwa Oktoba, afọ 2021, pụtara ihe, ebe niile nwuuru ọkụ na dayọsis ahụ, nke mere ka Bishọpụ Chukwu kwụsị Fada Odey ọrụ n'ike,

Ebe foto si, Kingsley Aman
Mana nke a kpasuru ọtụtụ ndị ụka Katọlik ihe Fada Odey na-amasị iwe, nke mere ka ọtụtụ mee ngaghariiwe, ebe ụfọdụ dere ozi na-akpọ oku ka a kpoghachi ya na-egbughị oge.
N'ozi ha degaara Bishopụ Chukwu n'ọha nke rutere BBC Igbo aka, ha jụrụ ya ihe kpatara o jiri nye Fada Odey ikike ka o bipụta akwụkwọ ahụ, mechaa tụgharịa taa ya ahụhụ na-erubeghị otu izuụka akwụkwọ ya pụtara.
Akwụkwọ ozi ahụ kwuru: "Ihe a tụrụ anya n'aka gị bụ ihibe kọmiti ga-elebanye anya n'ebubo ndị Fada Odey boro tupu. Ị mara ihe ị ga-eme ya,"
"Kama ịta ya ahụhụ na-enyochaghị ihe kpatara ya bụ akwụkwọ bụ ime uche ndị na-ememila ụka."

Ebe foto si, Alamy
Ha dọrọ aka na ntị na ọ bụrụ na ụka Katọlik na Naijiria amaghị hazie okwu metụtara Bishop Okoro na Fr. Dr. Emmanuel Obuna, na ihe mere n'Ahịara Katọlịk Dayosis ga-eme na dayọsis ha.
Cheta na Ahiara dayọsis bụ ebe ndị ụka na ndị ụkọchukwu jịkọrọ ọnụ jụ ịnabata Bishopu Okpaleke bụ Bishọpụ ọhụrụ e nyere ha.

Ebe foto si, AFP
Ndị ahụ mere ngagharịiwe kwuru na ọ bụrụ na a kpọghachi Fada Odey n'ọrụ, na ha, ga-agba n'anwụ mpụ ụfọdụ ndị ụkọchukwu merela na dayọsis ahụ dịka ndị na-edina ụmụnwaanyị nọ na di, ndị na-emetọ ụmụaka, ndị na-ete ụmụnwaanyị ime na ndị nwere ọtụtụ ụlọ na akụnụba.
Mana ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ebere Fada Odey na-arụ a kpọrọ 'Father John Odey Centre' agọọla na aka Fada Odey adịghị na ngagharịiwe ahụ ndị mmadụ mere.

Ebe foto si, AFP
Oge a kpọrọ ya, Fada Obuna gwara BBC Igbo n'ekwentị na ya agaghị asa ihe ọbụla banyere ebubo niile Fada Odey boro ya n'akwụkwọ o dere.
O kwuru sị: "Okwu ahụ eruola Rome. Na ụka Katọlik, okwu ruo Rome, ọ dịka okwu dị n'Ụlọikpe Kachasị, agaghị m etinyenwuzi ya ọnụ."
Mbọ BBC gbara ịnụta uche Bishopụ nakwa Ụka Katọlik na Dayosis Abakiliki amịtaghị mkpụrụ.
Oge onye ntaakụkọ anyị kpọrọ odeakwụkwọ dayọsis ahụ bụ Fada Henry Ogodo na-ekwentị, jụọ ya maka ebubo a na-ebo dịka o siri metụta Fada Odey, o kwuru na ya enweghị ike ịsa ya n'ihi na ya na-anya ụgbọala.
O kwuru na ya ga-enye ọsịsa ya ụbọchi Fraide mana oge BBC Igbo kpọghachiri ya, ọ zaghị ekwentị ya.
N'aka nke ọzọ, mbọ inweta Fada Odey amịtaghị mkpụrụ dịka a gbanyụrụ ekwentị ya agbanyụ.

Ebe foto si, Abakaliki Catholic Diocese
Otu onye maara Fada Odey kemgbe afọ iri atọ bụ Benedict Okoro gwara BBC Igbo na nsogbu Fada Odey nwere bụ na ọ bụ onye na-ekwu okwu gbowam, na-atụghị egwu onye o metụtara.
O kwuru na Fada Odey dere ihe ọtụtụ ndị ụkọchukwu nakwa ndị na-ekpe ụka Katọlik ma mana egwu ekweghị ha ekwupụta ya.
Bennet kwuru sị,"Fada Odey amaghị atụ asị. Nke mere na ọ naghị ezo ọnụ ikwu okwu megide ihe o kwenyere adịghị mma."
Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Fada Odey

Ebe foto si, Benedict Okoro
- Ewezụga ọrụ ụkọchụ, Fada Odey bụ ya bụ ụkọchukwu na-achịkọta ụlọakwụkwọ "Holy Trinity College dị n' Umuoguduakpu Ngbo.
- O deela akwụkwọ ruru iri anọ na isii
- E ji ikpu nkata n'ihu agwa eze okwu mara ya
- Akwụkwọ ndị o deelera gụnyere; "Church And State: Profiles in Costly Discipleship"; "After the Madness Called Election 2003"; "Another Madness Called Election 2007: Nigeria's Journey From Colonial Bondage To Democratic Tyranny (Vol 1)": Christians, Politics, and the Nigerian Dilemma" Wdg.













