Ana m akwado enyemaka ndịagha Amerịka na Naịjirịa – Ali Ndume

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'izu a.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Ana m akwado enyemaka ndịagha Amerịka na Naịjirịa – Ali Ndume

    Ana m akwado enyemaka ndịagha Amerịka na Naịjirịa – Ali Ndume

    Ebe foto si, Ali Ndume/Facebook, Africom/X

    Onye omeiwu na-anọchiteanya Borno South n’Ọmeiwu Ukwu Naịjirịa bụ Sịnetọ Ali Ndume, ekwuola na ya kwenyere na nkwado ndịagha Amerịka na-enye Naịjirịa n’agha a na-ebu megide ndị na-eyi ndụ egwu bụ nke dabara adaba.

    Oge ya na ndị ntaakụkọ Channels TV na-akparịta ụka n’ụbọchị Fraịde 13 Febụwarị 2026, Ndume kwuru na Naịjirịa chọrọ enyemaka niile ha pụrụ inweta, iji kpochapụ iyi ndụ egwu.

    Onye omeiwu ahụ kwuru na o teela Naịjirịa malitere ịchọ ụdị enyemaka dị etu a mana ha ekweghị abịa.

    Cheta na ọ bụ ihe dịka otu izuụka gara aga ka Ọchịagha na-ahụ maka ụlọọrụ United States Africa Command (Africom) bụ Dagvin Anderson kwuru na mba Amerịka na Naịjirịa “akwalitela mgbakọaka” maka nchekwa.

    N’ogbakọ ya na ndị ntaakụkọ nwere n’onyonyoo ka Anderson kwuru na ha ekpebiela na ha kwesịrị ijikọta aka n’ụzọ a ga-esi mee ka mpaghara Afrịka gaa n’ihu.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  2. Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi?

    Anyị na-asị gị nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 14 Febụwarị 2026.

    Ọfọ anyị bụ ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche anyị ji bịa taa.

    Udo dịrị gị!

  3. INEC na-eme atụmatụ iji ijeri N873 hazie ntuliaka afọ 2027

    INEC na-eme atụmatụ iji ijeri N873 hazie ntuliaka afọ 2027

    Ebe foto si, INEC

    Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC) emeela atụmatụ iji narị ijeri Naịra asatọ na ụma (N873,778,401,602.08) hazie ntuliaka n’afọ 2027.

    Onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Joash Amupitan kpughere nke a n’ụbọchị Tọzde 13 Febụwarị 2026 oge ọ na-egosi kọmitii ụlọomeiwu atụmatụ mkpata na mmefu ego afọ 2026 nke ụlọọrụ ya, tinyekwara ego ole a tụrụ anya na ha ga-emefu maka ntuliaka afọ 2027.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Amupitan mere ka o doo anya na atụmatụ mkpata na mmefu ego nke ntuliaka a dị iche n’ijeri N171 a mawapụtara maka afọ 2026, nke bụ maka ọrụ dị iche iche ụlọọrụ ahụ na-arụ tinyekwara ntuliaka mmegharị na ntụliaka ndị mapụrụ n’oge ntuliaka ọha.

    O kwuru na nke a gbasoro mpaghara 3(3) nke Iwu Ntuliaka afọ 2022, nke manyere ụlọọrụ INEC iwepụta atụmatụ mkpata na mmefu ego ha maka ntuliaka n’ime otu afọ tupu a hazie ntuliaka.

  4. Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 13 Febụwarị 2026.

    Ka ụbọchị taa dịrị anyị niile na mma.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche anyị ji bịa taa.

    Ya gazie!

  5. Fubara achụọla ndị kọmishọna ya nile n’ọrụ

    Siminalayi Fubara

    Ebe foto si, Siminalayi Fubara/Facebook

    Nkọwa foto, Siminalayi Fubara

    Aka na-achi Rivas steeti bụ Siminalayi Fubara achụọ1)a ndị kọmịshọna y anile n’ọrụ ma nye ha ikwu ka ha nyefee ihe nile n’aka ndị isụ ndị ọrụ Oyibo na mịnịstrị ha dị iche iche.

    Nke a gbara ihe n’akwụkwọ mgbasa ozi o wepụtara n’ụbọchị Tọzde. Abalị 12 nke ọnwa Febuwarị, afọ 2026.

    N’ozi ya, Fubara kelere ha nile maka ‘nnukwu ihe ha mere” steeti ahụ oge ha nọ n’ọkwa ma kpere ha ekpere ọganihu.

  6. Mmadụ 21 anwụọla n'ihe mberede ụgbọmmiri mere na mba Sudan

    Ụgbọmmiri

    Ebe foto si, Getty Images

    Mmiri eriela ihe ruru mmadụ 21 dịka ụgbọmmiri bu ndị na-eme njem River Nile steeti dị na mpaghara ugwu mba Sudan.

    Ozi otu Sudan Doctors Network (SDN) gwara BBC, mere ka o doo anya na ụgbọmmiri ahụ bụ mmadụ 30 gụnyere ụmụnwaanyị, ndị okenye na ụmụaka si obodo Tayba aga obodo Deim al-Qarai oge njinji ahụ jiri.

    Ọnụ na-ekwuru otu SDN bụ Dọkịnta Mohamed Faisal Hassan kwuru na ndị ọrụ gbatagbata na-achọ ozu ndị ọzọ dịka e kwuru na ndị nwụrụ nwereike ịrị.

    Ndị ọchịchị na steeti River Nile kwuru na a chọpụtala ozu mmadụ 21 n’ụbọchị Tọzde 12 Febụwarị, 2026.

    Ndị hụrụ oge ihe ahụ mere kwuru na mmiri riri ụgbọmmiri dịka oke ikuku kuru na mpaghara Shendi na mgbede Wenezde 11 Febụwarị, 2026.

    Otu SDN akpọkuola ndị ọchịchị ka ha ziga ndị ọrụ gbatagbata maara ihe ekwe na-akụ ka ha nyere aka n’ọrụ ha.

    Akụkọ ndị ọzọ nwereike ịmasị gị:

  7. Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ maka ibu egbe na ọgwụ ike n'Anambra Steeti

    Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ maka ibu egbe na ọgwụ ike n'Anambra Steeti

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ndị uweojii anwụchiela mmadụ atọ maka ibu egbe na ọgwụ ike n'Anambra Steeti

    Ndị uweojii anwụchiela ụmụnwoke atọ maka ibu egbe iwu na-akwadoghị nakwa itinye aka n'ihe gbasara ọgwụ ike n'otu ụlọ nkwari dị n'Anambra Steeti.

    Aha ụmụnwoke atọ ndị ahụ ha nwụchiri gụnyere Ifeanyi Ibeabuchi dị afọ iri atọ na itoolu, Abdullahi Shaibu dị afọ iri abụọ na isii na Obah Chima gbara afọ iri na asatọ.

    Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kọwara na ndị uweojii ‘Rapid Response Squad’ dị na Awkuzu nwetara ọzị n’abalị itoolu nke ọnwa Febụwarị 2026 na ụmụnwoke ndị ahụ nọ n'ụlọ nkwarị nọ na mpaghara Uke dị na Idemili Nọrth

    Mgbe ndị uweojii nọ na-achọgharị n’ụlọ nkwarị ebe e jidere ndị ahụ, ha hụrụ egbe ‘pump action’ nke akara ya bụ 21SA-0724 nke nwere mgbọ egbe atọ.

    Tochukwu Ikenga kwuru na otu onye n'ime ndị ahụ a na-enyo enyo maka mpụ ndị ahụ bụ Ifeanyi kwetara na mpụ ndị o mere ma nyekwara ndị uweojii aka iji nwuchie mmadụ abụọ ndị nke ọzọ nakwa ọgwụ ike ndị ha nwetara.

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ebe a:

  8. Oke ifufe dị ike egbuola ihe ruru mmadụ 31 na Madagascar

    Obodo Toamasina, n'ụsọ oke osimiri ọwụwa anyanwụ nke Madagascar bụ ebe oke ifufe Gezani dakwasịrị

    Ebe foto si, AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Obodo Toamasina, n'ụsọ oke osimiri ọwụwa anyanwụ nke Madagascar bụ ebe oke ifufe Gezani dakwasịrị

    Ndị ọrụ nchekwa ọdachi nke agwaetiti Indian Ocean kwuru na opekatampe mmadụ iri atọ na otu nwụrụ mgbe oke ifufe siri ike kpara nkpa nkpa na mba Madagascar.

    Oke ifufe Gezani ahụ dara n'ụbọchị Tuzde 10 Febụwarị, wee na-etisa ọdọ ụgbọmmiri dị n'agwaetiti ahụ, Toamasina.

    Ụlọọrụ njikwa ọdachi nke Madagascar kwuru na e nwere "ọgbaaghara zuru oke" - na-ekwu na ọtụtụ ụlọ kpụkọrọ n'ebe ihe mberede ahụ mere, ebe a hụrụ ozu ndị ahụ nwụrụ anwọ.

    Nkpa nkpa ahụ tinyere obodo ahụ ya na mpaghara dị iche iche n’ọchịchịrị dịka osisi ọkụ eletrik gbawara, ebe ọtụtụ osisi dara ma dọpụ elu ụlọ.

    "Ihe merenụ bụ ọdachi, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 75 pasentị nke bibiri obodo Toamasina," ka onye ndu ndịagha mba ahụ bụ Colonel Michael Randrianirina, onye weghaara ọchịchị n'ọnwa Ọktoba, gwara ụlọọrụ mgbasa ozi AFP.

    Lee akụkọ ndị ga-amasị gị:

  9. Ndị uweojii anwuchiela ọtụtụ ndị ekperima n’Imo Steeti, napụta ha ngwaọgụ

    Ndị uweojii anwuchiela ọtụtụ ndị ekperima n’Imo Steeti, napụta ha ngwaọgụ

    Ebe foto si, Imo State Police Command

    Ndị uweojii Imo Steeti ekwuola na ha hụtara ọtụtụ ọganihu n’izuụka gara aga n’agha ha na-ebu megide iyi ndụ egwu site na mgbakọaka ha na ụlọorụ nchekwa ndị ọzọ nakwa ndị nwere aka oke.

    Kọmịshọna ndị uweojii n’Imo Steeti bụ Audu Garba Bosso kwupụtara nke a oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka na nso nso a.

    Bosso sịrị na n’ime oge a, ndị ọrụ ya nwuchiri mmadụ iri na ise a na-enyo enyo maka mpụ ndị gụnyere ntọrị, iji egbe ezu ohi, otu nzuzo, iyi ndụ egwu, ịtụ mgbere ụmụaka, igbu mmadụ na izu ohi.

    “Site n’ọrụ a haziri ahazi, anyị napụtara otu onye ha tọọrọ nakwa nwata ha rere ere, ma nyefee ha n’aka ndị ezinaụlọ ha,” ka ozi ahụ kwuru.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Ndị uweojii kwuru na ihe ndị ha napụtara ndị omekome ahụ gụnyere; egbe AK-47 anọ, otu egbe LAR, egbe pump action ise, mgbọ egbe GPMG 260, ogbunigwe iri, obejiri iri na otu, ọgbaatumtum ise e zuru n’ohi, efere ụgbọala iri atọ na abụọ, ekwentị iri atọ na abụọ, igwe laptọpụ ise, ọtụtụ igbo, igwe walkie-talkie abụọ, njirimara IPOB/ESN, akwụkwọ ego adịgboroja nakwa ọtụmọkpọ.

    Nke kachasị gbaa ọkpụrụkpụ bụ nnwuchi a nwuchiri mmadụ ise a na-enyo enyo maka ntọrị bụ Chinonso Ugochukwu, Chibuzor Okafor, Ohaka Chukwuka, Ezekwe Chizoba na Ezekwe Chinyere bụcha ndị Orsuobodo dị n’okpuru ọchịchị Oguta n’Imo Steeti.

    Ndị uweojii anwuchiela ọtụtụ ndị ekperima n’Imo Steeti, napụta ha ngwaọgụ

    Ebe foto si, Imo State Police Command

    N’otu aka ahụ, ngalaba ndị uweojii na-ebu agha megide ntorị nwuchikwara mmadụ abụọ a na-enyo enyo gụnyere Amucha Nkemdirim Innocent na Michael Okafor, ndị obodo Umuakagu-Nsu dị n’okpuru ọchịchị Ehime Mbano n’Imo Steeti maka itinye aka n’iyi ndụ egwu, ntọrị na igbu mmadụ n’obodo ahụ ma napụta ha ngwaọgụ.

    N’ịga n’ihu, ndị uweojii nwuchikwara Chinaemerem Ogamba, onye Ubaheze Omoma dị n’okpuru ọchịchị Oru-East n’Imo Steeti maka igbu otu onye aha ya bụ Izanga, ma napụta ya otu egbe ntụ.

    Ndị uweojii anwuchiela ọtụtụ ndị ekperima n’Imo Steeti, napụta ha ngwaọgụ

    Ebe foto si, Imo State Police Command

  10. Aga m agba arụkwaghịm ọ bụrụ na a chọpụta na okporoụzọ Abuja-Kaduna-Kano esighị ike - Umahi

    O kwuru na ya dị njikere itinye ọrụ ahụ n'aka onye kwụrụ onwe ya ka ọ tụlee ya.

    Ebe foto si, David Umahi/Facebook

    Nkọwa foto, O kwuru na ya dị njikere itinye ọrụ ahụ n'aka onye kwụrụ onwe ya ka ọ tụlee ya.

    Minista na-ahụ maka ọrụ na Naịjirịa bụ David Umahi, ekwuola na ya ga-agba arụkwaghịm ma ọ bụrụ na a chọpụta na ọrụ okporoụzọ Abuja-Kaduna-Kano na-aga n'ihu adịghị mma.

    O kwuru na ya dị njikere itinye ọrụ ahụ n'aka onye kwụrụ onwe ya ka ọ tụlee ya.

    Umahi kwuru nke a mgbe ọ na-azara ọnụ banyere mmefu ego mịnịstrị ya n'ihu ọgbakọ ndị omeiwu mba n’ụbọchị Wenezde.

    N'oge ọgbakọ ahụ, a jụrụ ya ajụjụ gbasara inye otu akụkụ nke ọrụ ahụ n’aka ụlọọrụ ụfọdụ ndị omeiwu kọwara dịka ndị a maghị ndị ha bụ ma bụrụkwa ndị e kọwara na mbụ na-ere igwe ọkụ.

    Na nzaghachi, Umahi gwara ndị omeiwu ka ha elekwasị anya n'ịdị mma nke ọrụ e nyere kama ilekwasị anya n'echiche banyere ụlọọrụ na-arụ ya.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  11. Ụtụtụ ọma, Igbo ndị ọma

    Anyị na-asị gị nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde 12 Febụwarị 2026.

    Ekpere anyị bụ ka ụbọchị taa mịtara anyị niile mkpụrụ ọma.

    Sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche anyị ji bịa taa.

    Udo dịrị gị!

  12. Ụgbọelu Arik Air si Legọs aga Pọtakọt enweela nsogbu injini

    Arik Air

    Ebe foto si, Screengrab

    Ụgbọelu Arik Air si Legọs aga Pọtakọt gbalahụrụ ihe mberede dịka o nwere nsogbu injini ụbọchị Wenezde.

    Nsogbu ahụ mere ka ya bụ ụgboelu gaa kwụsị na ntụmadị n'ọdọụgbọelu Bini taa.

    Mana o nweghị onye merụrụ na ndapụta ahụ.

    Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka inyocha na ije awale bụ 'Nigerian Safety Investigation Bureau kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie n'ozi ha wepụtara n'akara n'ọbaọzi X."Ụlọọrụ 'Nigerian Safety Investigation Bureau na-ekwu n'ezie na ụlọelu Arik Air bu akara B737-7GL (5N-MJF) si Legọs aga Pọtakọt nwere nsogbu injini dịka ọ na-efe were ka kwụsị na Bini."

    Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na onweghị ihe mere ụgbọelu ma ndị njem.

    Ụgbọelu Arik

    Ebe foto si, ArikAir/X

  13. Ndị akaebe agwala ụlọikpe etu ndị ohi si wakpoo ma gbuo Somtochukwu Maduagwu

    Maduagwu nwụrụ mgbe ndị ohi wakporo ebe obibi ya dị n'Abuja n'ọnwa Sepụtemba, 2025.

    Ebe foto si, Arise News

    Ikpe a na-ekpe mmadụ iri na otu a na-enyo enyo gburu Somtochukwu Maduagwu bụ onye ntaakụkọ ụlọọrụ Arise News amalitela n’ụlọikpe dị n’Abuja dịka ndị a wuchiri n’ụlọikpe.

    Nwoke a e boro ebubo na mmadụ iri ndị ọzọ ka e boro ebubo ịgba izu, izu ohi nakwa ogbugbu mmadụ bụ nke ha niile gọrọ na aka ha dị ọcha n’ebubo ndị ahụ.

    ‎Ndị akaebe abụọ a kpọtara bụ ndị bibu n’ụlọ ebe nwada a bi a kpọrọ Unique Apartment kpuchiri ihu ma kọwaa ihe mere n’ụtụtụ ụbọchị 29 Sepụtemba afọ 2025 ahụ.

    Ha kọwara etu ndị ohi ahụ kpuchiri ihu ha si wakpoo ụlọobibi ha zuo ha ohi ma na-eti mkpu ‘area’. Ha kwuru na ndị a mere mwakpo ahụ mgbe o ji ọkara gafee elekere abụọ nke isiụtụtụ.

    ‎Ndị akaebe a kọwara etu ndị a bucha egbe si kụkasịa ọnụụzọ ndị bi n’ụlọ ahụ ma na-ezu ngwo ngwo ha.

    ‎Ha gwara ụlọikpe na a hụrụ ozu Somtochukwu n’elekere anọ nke ụtụtụ ka o kpudoro ihu n’ala n’ime oruru ọbara. N’otu aka ahụ ha kpọrọ n’ekwentị ka e nwee ike nyere Barnabas Danlami bụ onye nche ụlọ ahụ aka maka egbe ndị ohi ahụ gbara ya.

    E mechara ha abụọ anwụọla dịka e kwupụtara ọnwụ ha n’ụlọọgwụ Maitama District.

    Ọkaikpe Mohammed Idris bugara ikpe ahụ n’ụbochị 12 Tọzde Febụwarị.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  14. Amerịka ga-ezite ndịagha 200 iji nyere Naịjirịa aka buo agha megide iyi ndụ egwu

    Iwu ahụ ga-akpọpụta ka ọdeakwụkwọ Amerịka tule ịkpọpụta ndịagha agbụrụ Fulani dịka otu ndị na-eyi egwu.

    Ebe foto si, STEFAN HEUNIS/AFP via Getty Images

    Nkọwa foto, Iwu ahụ ga-akpọpụta ka ọdeakwụkwọ Amerịka tule ịkpọpụta ndịagha agbụrụ Fulani dịka otu ndị na-eyi egwu.

    Gọọmenti Amerịka ekwupụtala na ha ga-eziga ndịagha nari abụọ na Naịjirịa iji nyere ndịagha Naịjirịa aka n'agha ha na-ebu megide otu na-eyi ndụ egwu.

    Ndị ọchịchị sị na ndịagha Amerịka ahụ ga-enye ọzụzụ na nkwado tekịnụzụ mana ha agaghị eso lụọ ọgụ.

    Akụkọ kwuru na ọ bụ ndịagha Naịjirịa rịọrọ maka enyemaka ahụ. A na-atụ anya na ndịagha Amerịka ga-abata n’izuuka na-abịa abịa isonye ndị otu ha ntakịrị nke e kwuru nọ na Naịjirịa.

    N’aka nke ọzọ ndị omeiwu mba Amerịka etinyela usoro iwepụta iwu nke ga-amụba ihe ndị gọọmenti Amerịka ga-eme maka ogbugbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa.

    Iwu a nke a na-atụle, a kpọrọ ‘Nigeria Religious Freedom and Accountability Act of 2026 (HR 7457) ga-enye odeakwụkwọ Amerịka ohere inye kọmitii na-ahụ maka mba ofesi n’ụlọomeiwu akụkọ afọ ọbụla gbasara mbọ a na-agba ikwụsị ogbugbu a na-egbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa.

    Iwu ahụ ga-akpọpụta ka ọdeakwụkwọ Amerịka tule ịkpọpụta ndịagha agbụrụ Fulani dịka otu ndị na-eyi egwu.

    Gụọ ọzọ ebe a:

  15. Mmadụ itoolu anwụọla dịka a gbara egbe n’ụlọakwụkwọ dị na Kanada

    Foto mbara ezi nke ụlọ akwụkwọ sekọndrị Tumbler Ridge

    Ebe foto si, Tumbler RidgeLines/Reuters

    Nkọwa foto, Foto mbara ezi nke ụlọ akwụkwọ sekọndrị Tumbler Ridge

    Mmadụ itoolu nwụrụ ebe mmadụ iri abụọ na ise merụrụ ahụ mgbe onye ojiegbe wakporo ma gbee egbe n'ụlọakwụkwọ nakwa n'ụlọobibi dị na mba Kanada.

    Ndị uweojii sị na a hụrụ ozu mmadụ isii n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị ‘Tumbler Ridge’ dịka onye nke mezuru ọnụọgụgụ ndị nwụrụ mmadụ asaa nwụrụ dịka a kpọ ya na-aga n'ụlọọgwụ.

    Ndị uweojii mechara hụ ozu mmadụ abụọ n’ụlọobibi nọ n’akụkụ ụlọakwụkwọ ahụ.

    Otu nwa akwụkwọ gwara CBC na ya na ndị otu ya "wetara tebụlụ ma mechie ụzọ" n'oge a na-agba egbe ahụ.

    Ndị ọchịchị sị na ha ma onye mere mwakpo ahụ mana ha akpọpụtaghị aha ma ọ bụ nwoke ka ọ bụ nwaanyị.

    Ihe ịdọ aka na ntị ebe ndị mmadụ bi kọwara onye a na-enyo enyo dịka nwaanyị yị uwe nwere ntutu isi aja aja.

    Praịm minista Kanada bụ Mark Carney sị “obi gbawara” ya maka ihe mere dịka David Eby onye isi ‘British Columbia’ kwuru na nzaghachi ngwa ngwa nke ndị uwe ojii pụtara mgbe ihe a na-eme ‘gbochiri ọdachi ahụ ka ọ ka njọ".

    Gụọ akụkọ ọzọ ebe a:

  16. Igbo ndị ọma e ji eme ọnụ, daalụ nụ ooo!

    Obi sara mbara ka anyị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde Febụwarị 11, 2026.

    Buru oche gị bịa nọnyere anyị n'ọgbakọ BBC News Igbo ebe a na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ anyị maka akụkọ, foto na vidio dị iche iche anyị ji bịa taa.

    Ndewo!

  17. Ọ naghị ewute m na Onyeisiala Tinubu wepụrụ m dịka Minista – Uju Kennedy-Ohanenye

    Onye bụbu Minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị, Uju Kennedy-Ohanenye ji igwe eji ekwu okwu dịka onye uweojii nwannyị nọ ya n'azụ

    Ebe foto si, Kennedy-Ohanenye/Instagram

    Nkọwa foto, Onye bụbu Minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị, Uju Kennedy-Ohanenye ji igwe eji ekwu okwu dịka onye uweojii nwannyị nọ ya n'azụ

    Onye bụbu Minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị bụ Uju Kennedy-Ohanenye ekwuola na o nweghị ihe mwute maka mwepụ onyeisiala Naịjrịa bụ Bola Tinubu wepụrụ ya dịka minista.

    O kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakukọ ụlọmgbasaozi Channels TV na-enwe mkparịtaụka, bụ ebe ọ kọwara ihe ndị ọ rụrụ mgbe ọ ka nọ n'oche dịka minista na-ahụ maka ụmụnwaanyị.

    O kwuru na onyeisiala Tinubu na ndị gọvanọ na-arụ ọrụ mana ọ maghị ihe ndị Naịjirịa na-eme, maka na onye chọọ ka Naịjirịa rụọ ọrụ, onye ahụ ga-agbadọ ụkwụ na-ala.

    Kennedy Ohanenye mere ka o doo anya na mgbe ọ nọ n'ọrụ, o nweghị ihe na-adịghị mma n'ọrụ ndị a sị ya rụọ.

    Dịka o siri kwuo, “Obi dị m mma n'ọrụ ndị m rụrụ mgbe m ka nọ n'ọrụ, ya mere i lee m anya ọfụma ị ga-ahụ na ahụ dị m mma”

    “Apụọla m n'ọrụ dịka minista, ihe ọ bụla ha na-eme ebe ahụ ugbua gbasara ha.”

    Mgbe a jụrụ ya ma obi ọ dị ya mma na mwepụ e wepụrụ ya n’agbanyeghị ọrụ ọma ndị ọ rụrụ, ọ kọwara na ihe gbasara mkpebi ndọrọndọrọ ọchịchị bụ nke dị omimi nke ndị ọha agaghị aghọta.

    “Mụ na onyeisiala Tinubu ka na-ekwu okwu ruo ugbua. Obi dị Tinubu mma etu m si rụọ ọrụ, o nwereike e nwere ihe karịrị ya ike merenụ”.

  18. "Ụbọchị ọbụla a gbachiri ahịa anyị na Ladipo na-abụ ụsụ ahịa nyere anyị"

    Ụlọahịa ndị a gbachiri agbachi n'ahịa akụrụngwa ụgbọala bụ Ladipo dị na Legọs

    Ndị na-azụ ahịa na Ladipo ọ kachasị na mpaghara ahịa ahụ gọọmenti Legos gbachiri agwala BBC Igbo Etu ọnọdụ ha dị ugbua.

    Ha kwuru na ụbọchị ọbụla ha na-azụghị ahịa bụ oghom diri ha.

    Chinedu Iwuoha bụonye a ma ama n'ahia ahụ ma bụrụkwa onye na-ahụ maka nchekwa n'ebe a na-akpọ 'Toyota bus stop' kọọrọ BBC Igbo etu ọnọdụ ha siri dị.

    N'okwu ya "nsogbu dapụtara mgbe ndị Lawma bịara kwuo na gburugburu ahịa adịghị ọcha".

    "Ha nyere anyị akwụkwọ n'ihe dịka Fride ma jiri Sonde bịa machie ma kpọchie ụlọ ahịa dị icheiche"

    Chinedu kwuru na ihe gbagwojuru ha anya bụ na ha na-akwụ ndị LAWMA ụgwọ, n'okwu ya "ndị ahịa niile na-akwụ ụgwọ Lawma. A ma m na anyị ejighị ha ụgwọ ọbụla".

    Chinedu gara n'ihu kwuo na ndị Lawma gbadoro ụkwụ n'ebe ndị mmadụ na-etufu ahịhịa dị n'ụzọ e si aga ọdọ ụgbọelu, "mana ọ bụghị ndị nwere ụlọ ahịa na-etufu ahịhịa ebe ahụ" ka ọ kwuru.

    Ọ si na "ndị na-etufu ahịhịa ebe ahụ enweghị ụlọ ahịa nke ha, ọ bụ ndị na-ere ahịa n'ụzọ. Chi jie, ha na-etufu ahịhịa n'ụzọ".

    Ihe anyị mere Kamgbe a gbachiri ụlọ ahịa anyị

    Chinedu gwara BBC News Igbo na ihe mbụ ndị ahịa mere bụ ị ga kpochapụ ahịhịa niile dị ebe ahụ na-ese okwu.

    "Kamgbe abalị garaaga, anyị na-arụ ọrụ na-ekpochasị ahihia niile dị ebe ahụ."

    "Anyi wepụta kwara ndị ga-ahụ na ebe ahụ na-adị ọcha" .

    "Ndị a gbachiri ahịa ha nakwa ebe mbuse ngwaahịa 'warehouse' agawala izute onyeisi Lawma".

    Gọọmenti Legos steetị site n'ulooru Lagos waste management authority gbachiri mpaghara ọdọ ahịa Ladipo n'ụbọchị Sonde maka na gburugburu ebe ha gbachiri adịghị ọcha.

    Akụkọ ndị ọzọ metụtara Ladipo

  19. Pete Edochie dị ndụ - Linc Edochie

    Pete Edochie dị ndụ - Nwa ya nwoke

    Ebe foto si, Pete Edochie/Instagram

    Ezinaụlọ ochie dike a ma ama na-eme ejije bụ Pete Edochie ekwuola na nna ha ka dị ndụ ma gbasiekwa ike.

    Nke a na-abịa dịka akụkọ fesara ebe niile n'ụbọchị Tuzde 10 Febụwarị 2026 na Maazị Edochie anwụọla.

    Oge ọ na-agwa BBC Igbo okwu, nwa Pete Edochie nke nwoke bụ Linc Edochie mere kao doo anya na nna ha ka dị ndụ.

    "Nna m ka dị ndụ ma gbasiekwa ike," ka Linc Edochie ziteere onye ntaakụkọ BBC News Igbo n'ozi ekwentị.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  20. A malitela iduga nwada Ifunanya Nwangene na njem ịkpeazụ ya

    Ifunanya Nwangene yi efe ojii wee see foto a n'onwe ya nke a kpọrọ selfy

    Ebe foto si, Ifunanya Nwangene/Facebook

    Nkọwa foto, Ifunanya Nwangene yi efe ojii wee see foto a n'onwe ya nke a kpọrọ selfy

    Ezinaụlọ Ifunanya Nwangene ekwuola na ha ga-ekpe ụka akwamozu nwaada Igbo nwụrụ mgbe agwọ abụọ tara ya n'Abuja.

    Ifunanya Nwangene bụ otu n'ime ụmụ abụọ nne na nna ya mụrụ. Kirie ihe nne na nna ya gwara BBC ka anyị gbara ha ajụjụ ọnụ.

    Akwụkwọ ozi ezinaụlọ Nwangene zipụtara

    Ebe foto si, Ezinaụlọ Nwangene

    Nkọwa foto, Akwụkwọ ozi ezinaụlọ Nwangene zipụtara