Etu ndị uweojii Anambra si jichie ụkọchukwu Katọlik maka ebubo ịbụ onye Massob

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii n'Anambra Steeti ejichiela otu ụkọchukwu Katọlik aha ya bụ Samuel Aniebonem na mmadụ ise ndị ọzọ n'ihi ebubo na ha bụ ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra a na-akpọ 'Movement for the Actualiasation of the Sovereign State of Biafra (Massob).
Ọnụ na-ekwuru otu Massob bụ Chris Mocha wepụtara ozi gbasara nke a dịka o kwuru na ọ bụ ndị si n'ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Awkuzu, Anambra steeti wakporo ụlọọrụ ha n'ụbọchị 25 nke ọnwa Septụmba ma kpụrụ mmadụ atọ.
Otu n'ime mmadụ atọ ahụ bụ nwoke dị afọ 87 aha ya bụ Sylvester Dinyelu, onye bụ ọgọ nwoke ụkọchukwu ahụ.
Mocha kwuru na ụkọchukwu Aniebonem, na-arụ ọrụ n'ụlọụka Katọlik St Patrick's Cathedral dị n'Awka, gara n'ụlọọrụ ndị uweojii ahụ iji jụọ ese ọgọ ya nwoke ha ji.
"Mana kama ndị uweojii ga-akọwa ihe kpatara ha ji jichie ọgọ ya nwoke, ha jidekwara ụkọchukwu ma bokwa ya ebubo na ọ bụ onye otu Massob," Mocha dere n'akwụkwọ ozi ahụ.
"Ndị uweojii jidekwara onye nwoke aha ya bụ Udebunu Anachuna, bụ onye bu ụkọchukwu ahụ n'ụgbọala gaa n'ụlọọrụ ndị uweojii."
Chris Mocha boro ebubo na ọ bụ etu a ka ndị ọrụ nchekwa na mpaghara Owụwa Anyanwụ si awakpo ma na-ejichi, ma na-emekpa ndị aka ha dị ọcha ahụ n'ihi ebubo na ha bụ ndị otu Massob maọbụ Ipob.
Oge BBC kpọtụụrụ Toochukwu Ikenga, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti, o kwuru na ya bụ ihe mere n'eziokwu mana nnyocha ka na-aga n'ihu.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ikenga kwuru n'ozi o ziteere BBC Igbo sị: "Ndị ọrụ anyị nwetara ozi wee wakpo ụlọọrụ ha (bụ ndị Massob) nke dị n'okporoụzọ si Oyeagu gawa Ifitedunu, n'ụbọchị 25 nke ọnwa Sepụtemba. Ọtụtụ ihe akaebe nke gosiri nnupuisi nye obodo Naịjirịa ka a chọtara n'ime ụlọọrụ ahụ."
Ikenga ekwughị ma ụkọchukwu ahụ a ka nọ n'aka ndị uweojii ruo ugbua.
N'otu aka ahụ kwa, BBC Igbo kpọtụụrụ otu onye welitere isi na dayọsis ụka Katọlik nke Awka, o wee kwuo na ya bụ ihe mere eme n'eziokwu.
Onye a, na-achọghị ka a kpọpụta aha ya n'ihi na o nwetabeghị ikike ịgwa ndị ntaakụkọ okwu maka nke a, kwuru na ọ bụghị na 'St Patrick's Cathedral ka ụkọchukwu ahụ na-arụ ọrụ, kama ọ bụ n'otu ụlọụka dị n'Abagana.
Onye ahụ kwuru na oge ụkọchukwu ahụ gara n'ụlọọrụ ndị uweojii n'Awkuzu ịjụ ese maka ndị ahụ ndị uweojii jidere, "o yighi akwa ụkọchukwu ya maọbụ ihe ọbụla gosiri na ya bụ ụkọchukwu, nke pụtara na o nwereike ndị uweojii amaghị na ọ bụ ụkọchukwu".
Onye ahụ gara n'ihu kwuo na ụkọchukwu ahụ enwerela onwe ya ugbua, kama ya amaghị kpọmkwem ụbọchị ndị uweojii tọhapụrụ ya, maọbụkwanụ ụbọchị ole ọ nọrọ n'aka ndị uweojii.
Ka ọ dị ugbua, BBC amaghị ma ndị uweojii atọhapụla ndị ọzọ ahụ ha jichiri n'ụbọchị 25 nke Septemba n'ihi ịbụ ndị otu Massob.
O megidere iwu ịbụ onye otu Massob?

E nwere otu dị icheiche na-azọ maka nnwereonwe Biafra, mana atọ kacha pụta ihe n'ime ha bụ: 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) - nke onye hibere ya bụ Mazị Nnamdi Kanu n'afọ 2012; Biafran Zionist Front (BZF) bụbu Biafran Zionist Movement (BZM) - nke onye hibere ya bụ ọkaiwu Benjamin Onwuka; na Massob - nke onye hibere ya bụ ọkaiwu Ralph Uwazurike n'afọ 1999.
Mana ọ bụ naanị Ipob ka gọọmentị Naịjirịa machiri n'afọ 2017 ma kwuo na ha bụ otu na-eyi ndụ egwu. Nke a pụtara na onye ọbụla bụ onye otu Ipob na-ada iwu maka na ọ nọ n'otu iwu akwadoghi. Kama iwu a emetụtaghị otu ndị ọzọ na-ekwu okwu maka nnwereonwe Biafra.
Dịka ozi dị n'ọbaozi nke gọọmentị UK si gosi, onyeisiala Naịjirịa n'oge gara aga bụ Goodluck Jonathan, kwupụtara n'afọ 2013 na otu Massob so n'ime otu atọ na-enye nchekwa Naịjirịa nsogbu.




























