Aka akparala agadi nwoke, ndị ọzọ maka mgbere ọgwụ ike

Nchịkọta akụkọ ndị gbapụtara ihe na Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile n'ọnwa Sepụtemba 2023.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Uche Akolisa, Adline Okere, Jessica Nwankwo, Chukwunaeme Obiejesi, Chimezie UcheAgbo and Chioma Nkemdilim Daramola

  1. Ka chi fo

    Igbo ndị ọma, anyị ga-awụsa ọị̀a ebe a.

    Sonyere anyị ọzọ n'elekere asatọ nke ụbọchị Sọnde.

    Ka chi fo.

  2. Ụlọikpe kachasị etinye ụbọchị maka ikpe NNamdi Kanu na gọọmentị Naịjirịa

    Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya

    Ndị ọkaiwu Mazi Nnamdi Kanu, bụ onyeisi otu na-azọ maka nnwereonwe Biafra bụ Ipob, ekwupụtala na ụlọikpe kachasị etinyela ụbọchị ise nke ọnwa Ọkụtoba dịka ụbọchị a ga-anụ ikpe dị n'etiti Kanu na gọọmentị Naịjirịa.

    Ọkaiwu Mike Ozekhome (SAN) na Ifeanyi Ejiofor, bụ ndị na-anọchite anya Kanu n'ụlọikpe kwupụtara nke a site n'akara soshal midia ha na mgbede ụbọchị Satọde.

    Gọọmentị Naịjirịa na-ebo Nnamdi Kanu ebubo ịkpa nkata ịkutu ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa nakwa ịbụ onye so n'otu na-eyi ndụ mmadụ egwu.

    Ndị ọrụ nchekwa jidere Mazi Kanu na mba Kenya n'ọnwa Jun afọ 2021 ma kpụlata ya n'ike na Naịjirịa.

    Mana n'ọnwa Ọkutoba afọ 2022, ụlọikpe mkpegharị Naịjirịa nyere iwu ka gọọmentị Naịjirịa tọhapụ Nnamdi Kanu maka na usoro e si jide ya na mba Kenya megidere iwu.

    N'agbanyeghị iwu a, Kanu ka nọ n'ụlọ mkpọrọ nke ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa a na-akpọ DSS n'ịchafụ n'isi ụlọọrụ ha dị n'Abuja.

    Ọ karịala afọ abụọ ugbua e ji kpụlata Kanu ma tụọ ya mkpọrọ.

  3. Ndị ntọ chọrọ N50m iji tọhapụ ndị ụka CAC ha tọọrọ n'Ondo Steeti

    Ndị ojiegbe

    Ebe foto si, Getty Images

    Akụkọ si Ondo Steeti apụta na-ekwu na ndị ekprima tọọrọ ndị otu ukwe nke ụlọụka 'Christ Apostolic Church' (CAC) na steeti ahụ ekwuola ka a kwụọ ha nde naịra 50 tupu ha atọhapụ ha.

    Otu onye welitere isi n'ụlọụka CAC, mana ọ chọghị ka akpọpụta aha ya, gwara onye ntaakụkọ BBC Yoruba na ndị ekperima ahụ ji ekwentị otu n'ime ndị ahụ ha tọọrọ wee kpọọ oku iji kwuo na ha chọrọ ka a kwụọ ha nde naịra 50.

    Onye ahụ kwukwara na ọ bụghị mmadụ 25 ka a tọọrọ dịka akụkọ si kwubuo, kama ọ bụ mmadụ 20.

    N'ime ọnụọgụgụ a, mmadụ asatọ mechara gbapụ n'aka ndị ntọ ahụ, mmadụ asatọ ka a ka ji eji, ebe mmadụ atọ bụ ndị amaghị ebe ha nọ ugbua.

    Cheta na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Ondo Steeti bụ Funmilayo Odunlami kwuru na ndị ọrụ nchekwa na-agbasi mbọ ike ịchọta ma zọpụta ndị ahụ ndị ntọ tọọrọ.

  4. Onyeisiala Tinubu alọghachịla Naịjirịa site n’ọgbakọ United Nations

    Onyeisiala Bola Tinubu nke Naịjirịa

    Ebe foto si, Presidency/Twitter

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu esila na mba Amerịka ebe ọ gara ọgbakọ United Nations lọghachị Naịjirịa.

    Onye ndụmọdụ ya bụ Abdulaziz Abdulaziz gwara BBC na onyeisiala Tinubu lọtara n’abalị Fraịde.

    Nke a na-abịa ka ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ kedụ ebe Onyeisiala Tinubu gara maka ndị niile ha na ya so gaa ọgbakọ a n’Amerịka alọtachaala.

    Pati Peoples Democratic Party kwuru na ka ndị Naịjirịa jụọ ajụjụ maara ebe Tinubu gara mana ụlọọrụ onyeisiala kwuru na o nweghi ihe nzuzo dị na njem onyeisiala Tinubu na ọ bụ egbe ọnụ ka PDP na-agba.

    A na-atụ anya na Onyeisiala Tinubu ga-agbasa ozi emume ncheta afọ iri isii na atọ Naịjirịa nweere onwe ya n'aka ọchịchị mba Briten n'ụbọchị ụka 1 Ọktoba, 2023.

  5. Azọpụtala mmadụ asatọ n'ime ndị ụka CAC 25 ndị ntọ tọọrọ n'Ondo Steeti

    CAC

    Ebe foto si, Police

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Ondo steeti bụ Funmilayo Odunlami-Omisanya ekwuola na ndị ọrụ nchekwa azọpụtala mmadụ asatọ n'ime mmadụ 25 ndị ntọ tọọrọ na steeti ahụ n'ụbọchị Fraịde.

    Odunlami-Omisanya kwuru na ndị ọrụ nchekwa ka na-agba mbọ ịzọpụta mmadụ 17 ndị ka fọdụrụ n'aka ndị ntọrị mmadụ ahụ.

    Cheta na ndị ojiegbe e chere bụ ndị ntọ tọọrọ mmadụ iri abụọ na ise n'okporo ụzọ Owo/Ifon/Benin dị n'Ondo steeti.

    Akụkọ na-ekwu na ndị a tọọrọ bụ ndị otu ukwe n'ụlọụka Christ Apostolic Church (CAC) nke dị n'Akure bụ isi obodo steeti ahụ.

    Ọ bụ n'ebe elekere atọ n'ụbọchị Fraịde ka ndị ojiegbe ise wakporo ndị otu ukwe ahụ n'ime obodo Elegbeka mgbe ha na-aga akwamozu n'Ifon.

    Ndị uweojii sị na ha nwetara ozi na o nwere ụgbọala bọọsụ agbahapụrụ n'akụkụ ụzọ n'Elegbeka.

    Okporoụzọ a bụ 'Owo/Ifon/Benin Expressway' abụrụla ebe jọrọ nnukwu njọ maka ndị njem dịka e nwerela ọtụtụ mwakpo ntọrọ mmadụ na izu ohi na ya n'ọdị nso a.

    Ọ bụ n'okporoụzọ ahụ ka ndị ojiegbe gburu otu eze ọdịnala a ma ama n'Ondo Steeti bụ Olufon nke Ifon, aha ya bụ Oba Israel Adeusi. Nke a mere n'ọnwa Nọvemba 2020.

  6. A nwụchiela otu nwoke a na-enyo n’aka ya dị n’ogbugbu Tupac Shakur

    Ndị uweojii Las Vegas anwụchiela otu nwoke a na-eche na aka ya dị n’ogbugbu oti egwu a ma ama bụ Tupac Shakur kamgbe ihe chụwara afọ iri atọ gara aga.

    Ọkaibe a n’iti egwu hip-hop ka ndị bu ụgbọala na-agbafe gbara ya ọnụegbe anọ na Las Vegas n’afọ 1996. Kamgbe ahụ a mabeghi onye gbagburu ya.

    N’ụtụ Fraịde, ka ndị uweojii Las Vegas nwuchiri otu nwoke maka ọnwụ ya, dịka a kọọrọ ndị ntaakụkọ AFP.

    Shakur dị afọ iri abụọ na ise mgbe ọ nwụrụ n’ụbọchị 13 Sepụtemba, 1996 n’otu izuụka a gbara ya egbe ugboro anọ mgbe ọ nọ n’ime ụgbọala na-eche ọkụ mmemme.

    N’otu aka ahụ, ụlọ ntaakụkọ ABC sị na otu onye ọkaiwu gbagotere n’ọkwa kwuru na a nwụchiri onye a na-enyo enyo n’ọnwụ ya ma sị na a ga-akpụpụ onye ahụ n’ụlọikpe na Fraịde.

    Ọnwụ nwamadị a bụ ọkaibe n’egwu hip-hop e meela ka ewepụtala ọtụtụ akụkọ na-akpalite mmụọ ndị mmadụ.

    Shakur onye a na-akpọbiri ha ya ka 2Pac, tipụtara efere egwu mbụ ya n’afọ 1991.

    Shakur rere efere egwu karịrị nde 75 (75milliom) n’ụwa niile, egwu ya ndị gụnyere ‘California Love, All Eyez On Me na Changes’ nọ n’ogogo mbụ n’egwu ndị a na-ege n’oge ahụ.

  7. Ndị oyi ndụ egwu egbuola ndịagha Niger mmadụ 12

    Ndịagha Niger gwara ndịagha France na-enye aka n'ibuso ndị ekperima agha kwakọrọ si na mba ha pụọ

    Ebe foto si, AFP

    Ọtụtụ ndị oyi ndụ egwu bucha ọgbatumtum wakporo obodo dị na mpaghara south-west nke Niger ma gbuo ndịagha mmadụ iri na abụọ dịka minista nchekwa si kwuo.

    Mmadụasaa ka e gburu mgbe ha na-alụ agha ebe mmadụ ise ndị ọzọ nwụrụ n’ihe mberede okporoụzo ka ha na-alụ ọgụ a.

    Minista nchekwa kwuru na e gbuola ndị ekperima karịrị otu narị na nzaghachị mwakpo ahụ.

    Mwakpo ndị ekperima na-eme megide ndịagha arịala elu kamgbe ọnwa Julaị ndịagha weere ọchịchị n’ike.

    Ndịagha kwuru na ha weere ọchịchị n’ike a iji busoo ndị ekperima agha ọfụma, nke ụfọdụ n’ime ha bụ ndị otu al-Qaeda na Islamic State.

    Ndịagha mba Niger gwara ndịagha mba France na-enyeaka iji busoo ndị ekperima agha ka ha pụọ - n’izuụka gara aga, onyeisiala mba France bụ Emmanuel Macron kwetere iwezuga ha.

    Onye nnọchiteanya mba France na Niger bụ Sylvain Itte adịla mbụ kwakọrọ pụọ na mbido izuụka ma kwuo n’ihe onyonye French TV na atụmatụ ndịagha a bụ “igbu mmụọ m”.

    Akụkọ kwuru na a kpọlatala ọtụtụ ndịagha ka ha bịa n’isi obodo Niamey iji chekwaa onyendu ha nke mere ọtụtụ mpaghara ha na-echekwa jiri ghere oghe.

    N’ọnwa gara aga e gburu ndịagha ruru mmadụ 17 na nwakpo ọzọ mere n’ebe dị nso n’okeala Niger na Burkina Faso. Nke a bụ nwakpo kachasị na mba ahụ kamgbe ndịagha weere ọchịchị.

  8. Ogbunigwe mgbagbu onwe egbuola ihe ruru mmadụ 50 na Pakistan

    Ogbunigwe a bụ nke ndị mgbagbu onwe gbara

    Ebe foto si, EPA

    Ihe ruru mmadụ iri ise anwụọla ebe ihe karịrị iri ise merụrụ ahụ mgbe onye ogbunigwe mgbagbu onwe gbara na mba Pakistan dịka ndị uweojii si kwuo.

    Ogbunigwe gbara n’akụkụ ebe okpukpere ndị Alakụba dị mpaghara southwest nke Balochistan n’ụbọchị Fraịde ka ndị mmadụ gbakọtara iji mee emume ncheta ọmụmụ onye amụma Muhammad.

    Ndị ọrụ gọọmentị etinyela ọnọdụ ọdịrị ụkọ n’obodo ahụ. O nwebeghi otu pụtarala kwuo na ọ bụ mere mwakpo ahụ.

    N’otu aka ahụ, ogbunigwe ọzọ gbara n’ebe dịkwa nso n’ụlọ okpukperechi dị nso n’obodo Peshawar na mpaghara Khyber Paktunkhwa.

    Ihe onyonyo gosiri ka ndị ọrụ gbata gbata nakwa ndị obodo na-azọ ndụ merụrụ ahụ n’obodo Balochistan nke Mastung.

    Onyeisi ndị uweojii na Balochistan bụ Abdul Khaliq Sheikh kwuru na ogbunigwe ahụ bụ nke mgbagbu onwe. O kwuru na otu onye uweojii ọkwa ya dị elu nwụrụ n’ogbunigwe ahụ.

    Minista ime obodo nke mba Pakistan bụ Sarfraz Bugti kwuru na ogbunigwe ahụ bụ “agwa ọjọọ dị ekwu” ma katọọ ihe a ọ kpọrọ “mwakpo ndị oyi ndụ egwu.”

    Onye na-ekwuru ndị uweojii Khyber Pakhtunkhwa sị na e gbochiri ndị ogbunigwe mgbagbu onwe abụọ na otu ụgbọala ogbunigwe juru na ya.

    O kwuru “a gbagburu otu n’ime ha n’ọnụụzọ” mgbe ha chọrọ ịbanye n’ụlọ Alakụba dị na Hangu.

    Maapụ na-egosi ebe ogbunigwe a gbara

    A mabeghi ọnụọgụgụ ndị ihe metụtara n’ogbunigwe nke Handu mana ndị uweojii kwuru na ọtụtụ mmadụ ka nwereike ịtọ n’ala dịka elu ụlọ dakwasịrị ha.

    Ụlọ okpukperechi ahụ nwekwara ụlọọrụ ndị uweojii dị na ya nke nwereike ịba mmadụ 40 maọbụ 50 dịka ndị uweojii gwara BBC.

    Balochisten bụ nke mba Afghanistan na Iran gbara gburu bụ mpaghara kachasị ukwuu na Pakistan, e nweela ọtụtu agha n’obodo n’etiti agha nnupuisi gụnyere Tehrik-e Taliban Pakistan (TTP) nakwa ndị oyi ndụ egwu Islamic State.

    Mana TTP sị na aka ha adịghị n’ogbunigwe a gbara na Fraịde ma sị na mwakpo dị etu a megidere iwu na-achị ha.

    Na mbido ọnwa mmadụ iri na otu gụnyere onyendu Alakụba a ma ama merụrụ ahụ n’ogunigwe gbara na mpaghara ahụ.

    N’ọnwa Julaị, e gburu ihe karịrị mmadụ 40 n’ogbubigwe mgbagbu onwe na mpagbara north-west Khyber Pakhtunkhwa na ọgbakọ ndọrọ ndọrọ okpukperechi.

  9. Etu e si gbaa ụlọ Canice Nwachukwu ọkụ n'Imo steeti

    Ulo Canice Nwachukwu

    Ebe foto si, Other

    Ndị echere bụ ndị omekome agbaala ụlọ Canice Nwachukwu ọkụ n'Imo steeti

    Canice a ma dịka Omeogo bụ onye omeiwu na-anọchite anya Orlu/Oru East/Orsu n'ụlọomeiwu nta.

    Onye ntaakụkọ anyị chọpụtara na nke a mere n'ụzụ ụtụtụ ụbọchị Tọzde tupu amalite ọgbakọ akụnụba na nchekwa ọwụwa anyanwụ nke Gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ bịara na ya.

    Otu onye achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC na omeeiwu Canice anọghị n'ụlọ mgbe ndị ahụ biara.

    Ọ sị "ha ji ogbunigwe arụrụ arụ, igwe nakwa mmanụ ụgbọala were bịa. Ha sere ihe onyonyo ma zuo ohi ihe ụfọdụ n'ime ụlọ ahụ tupu ha gbaa ya ọkụ".

    Onye ahụ kwukwara na ha majara ndị ọrụ bi n'ebe ahụ mana ha gbalahuru ọkụ ahụ mgbe ndị omekome sunyere ya.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Henry Okoye kwetara na ha bụ ndị uweojii anụla maka akụkọ ahụ nakwa na ha amalitela nyocha banyere ya.

  10. Ụlọikpe enyela Uba Sani nke APC mmeri n'ọkwa Gọvanọ Kaduna Steeti

    Gọvanọ Uba Sani nke Kaduna Steeti

    Ebe foto si, Uba Sani/Facebook

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ọkwa Gọvanọ Kaduna Steeti akụchapụla mkpesa onye ji aha People Democratic Party (PDP) zọọ ọkwa bụ Isa Ashiru gbara megide mmeri Gọvanọ Uba Sani nke All Progressive Congress (APC) na ntuliaka afọ 2023.

    Ikpe a nke ọkaikpe abụọ n’ime atọ ji ikpe kwenyere ebe otu ekweghi, Ọkaikpe Victor Oviawie kwuru na a gbaghị akwụkwọ n’oge e kwesịrị ya mere e jiri gbahapụ ya.

    Kama ụlọikpe ahụ kwuru na ọ bụrụ na akụchapụghi ikpe a n’ihi agbaghị akwụkwọ n’oge na ọ kaara a sị ka e megharịa ntuliaka n’ọgbọ polling unit iri abụọ na abụọ n’ime ọnwa atọ.

    N’oge ntuliaka ahụ, Gọvanọ Sani nwetere vootu 730,001 iji merie Ashiru nwetere vootu 719,196 nkw Inec jiri kpọpụta aha ya.

    Onye ji aha Labour Party (LP) zọọ ọkwa bụ Jonathan Asake nwetere vootu 58,283 iji gbaa onye atọ ebe Suleiman Hunkuyi nke New Nigeria Peoples Party (NNPP) nwetere vootu 21,405.

    LP na NNPP nabatara mpụtara ntuliaka ahụ mana PDP na onye ji aha ha zọọ ọkwa jụrụ ịnabata ya ma sị na Inec kpọpụtara onye ọ bụghị ya meriri.

    Ha boro ebubo na e nwere ọtụtụ nrụrụaka na ntuliaka ahụ n'ụfọdụ okpuruọchịchị nke steeti ahụ iji mee ya Gọvanọ Sani merie.

  11. Anyị akwụsịla ndị chọrọ ịnapụ ọchịchị n'ike - Burkina Faso

    Ibrahim Traore nke Burkina Faso bụ onyeagha nọ n'ọchịchị ugbua

    Ebe foto si, Reuters

    Ndị agha na-achị mba Burkina Faso ekwuola na ha akwụsịla ọnwụnwa ịnapụ ọchịchị n'ike ọzọ na mba ahụ.

    A na-eche na ndị agha ahụ nwara ime nke a iji bute ọgbaghara ma kwatuo ndị nọ n'ọchịchị.

    O rubeghi otu afọ kemgbe e mere nnapụ ọchịchị n'ike na mba ahụ n'afọ 2022 dịka nnupu isi nke ndị agha Islam na-akawanye njọ.

    N'ozi nke a gụpụtara n'igwe Television, ndị nọ n'ọchịchị si na ha anwụchiela ụfọdụ mmadụ maka nke a ebe ha ka na-achọ ndị ọzọ.

    Cheta na ndị agha nọ n'ọchịchị ugbua kwuru na a ga-eme ntuliaka n'ọnwa Julai afọ na-abịa iji weghachi ọchịchị n'aka onyekwuoucheya.

    Mgbe niile e nwerela nnapụ ọchịchị n'ike na Burkina Faso

    Eserese na ọkọlọtọ mba Burkina Faso

    Mba Burkina Faso si n'okpuru ọchịchị mba Fransị pụta n'afọ 1960 kemgbe ahụ e nweela ọtụtụ nnapụ ọchịchị n'ike n'ebe ahụ gụnyere:

    - 1966 mgbe ndị agha naara ọchịchị n'ike n'ụbọchị 3 nke ọnwa Jenụwarị afọ ahụ dịka enwechara ngagharị iwe maka ihe isi ike na mba ahụ. Aboubakar Sangoule Lamizana nọchiri anya onyeisiala Maurice Yameogo.

    - 1980 mgbe Colnel Saye Zerbo napụrụ Onyeisiala Lamizana ọchịchị dịka afọ iri na anọ gachara n'ụbochị 25 nke ọnwa Nọvemba.

    - 1982 mgbe onyeisi otu 'Council for the salvation of the people' bụ Jean-Baptiste Ouedraogo chuturu Colnel Zerbo n'ọchịchị n' ụbọchị 7 nke ọnwa Nọvemba ma tinye Thomas Sankara dịka Praịm Minista n'ọnwa Jenụwarị afọ 1983.

    - 1983 Blaise Compaore wepụrụ Thomas Sankara n'ọchịchị n'ụbọchị 4 nke ọnwa Ọgọst.

    -1987 bụ ịnapụ ọchịchị n'ike nke akwafuru ọbara dịka e gburu Thomas Sankara na mmadụ iri na abụo ọzọ dịka Blaise Compaore banyere n'ọchịchi ma kwuo na ogbugbu Sankara bụbu enyi ya bụ 'mmehie'. Nke a malitere n'ụbọchị 15 nke ọnwa Ọktoba.

    - 2014 mgbe ewepuru Blaise Compaore n'ọchịchị n'ihi na ọ na-achọ igbanwe iwu ala inye onwe ya ogologo oge ọzọ ịnọ n'ọchịchị.

    - 2022 mgbe ndị agha pụtara kwuo n'igwe onyonyo n'ụbọchị 24 nke ọnwa Jenụwarị na ha ewegharala ọchịchị n'ike ma wepụ onyeisiala bụ Marc Roch Christian Kabore n'ọchịchị.

  12. Francis Nwifuru enwetela mmeri n'ụlọikpe dịka Gọvanọ Ebonyi Steeti

    Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Francis Nwifuru

    Ebe foto si, Francis Nwifuru/Facebook

    Ụlọikpe akụchapụla akwụkwọ PDP gbara gọvanọ Nwifuru nke Ebonyi steeti

    Ụlọikpe na-ahụ maka ntuliaka ọkwa Gọvanọ Ebonyi Steeti akụchapụla ebubo onye zi aha PDP zọọ ọkwa ahụ boro Gọvanọ Francis Nwifuru nke APC maka imeri na ntuliaka.

    Na nkwekọrịta ndị ọkaikpe ji ikpe nke Ọkaikpe Lekan Ogunmoye nọ n’isi ya kụchapụrụ mkpesa ahụ ma sị na ọ chịtaghị aja.

    Ụlọikpe a kwuru na enweghi ihe akaebe gosiri na Nwifuru bụ onye otu PDP mgbe ọ zọrọ ọkwa Gọvanọ na ntuliaka ụbọchị 18 Maachị 2023.

    Ụlọikpe a gakwara n’ihu kụchapụ akwụkwọ onye ji aha APGA ahụ bụ Benard Odoh gbara megide mmero Nwifuru.

    Ha kwuru na o nwekwaghi ihe akaebe gosiri na Nwifuru etozughi oke ịzọ ọkwa ahụ.

  13. Ịtọrọ mmadụ n’Enugwu abụrụla akụkọ mgbe ochie - Uweojii

    Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu steeti

    Kọmishọna Uweojii ọhụrụ ewetara n’Enugwu bụ Kanayo Uzuegbu ekwuola hohaa na aka ya ga-akpara ndị omekome niile na-atọrị mmadụ, ndị ohi na ndị ala adịghị mma niile na-enye nsogbu n’Enugwu.

    Uzuegbu gbara ndị omekaome mmadụ 92 ha nwuchiri n'anwụ kamgbe ọ malitere ọrụ n'ọnwa Ọgọọstụ dịka kọmishọna n'Enugwu.

    “N'otu ọnwa n’ụma ka anyi jidere mmadụ iri itoolụ na abụọ bụ ndị ntọrị, ndị ohi, ndị akanakpa, nakwa ndị otu nzuzo” Dịka o siri kwuo.

    “Anyị napụtara ha egbe 70 nke gụnyere AK 47 dị isii, egbe ndị ọzọ dị 66. Anyị bughachịrị ụgbọala 25 e zuru n’ohi."

    Ndị omekome a nwụchiri n'Enugwu

    Kọmishọna ahụ kwuru na ịtọrọ mmadụ n'okporoụzọ Ugwogo-Opi-Nsukka nakwa Fourcorner ebelatala nke ọma, ma sị na ndị mmadụ ka na-ebu akụkọ ụgha dị iche iche na-emeghi eme.

    Ọ rịọrọ ndị ntaakụkọ ka ha dọnyere ndị uweojii ukwu site n'inyocha akụkọ ọbụla tupu ha edepụta ya.

    Ọ gbarụrụ ihu kwuo na mgbe ụfọdụ akụkọ na-efegharị na soshal midia abụghị eziokwu.

    O gosiputara ọtụtụ ndị ntoroọbịa na-akwa ọjọọ dị iche iche.

    Isi ụlọọrụ ndị uweojii n'Enugwu
  14. Ihe ruru mmadụ 100 anwụọla n’emume agbamakwụkwọ na mba Iraq

    Ụlọagbamakwụkwọ ọkụ gbara

    Ebe foto si, Social Media

    Ihe ruru mmadụ otu narị anwụọla ebe ihe mmadụ 150 ọzọ merụrụ ahụ mgbe ọkụ malitere ịgba n’ebe a na-agba akwụkwọ n’obodo ndị ụka Kraịst dị n’Iraq.

    Ọtụtụ narị mmadụ nọ n’ekpori ndụ n’ụlọ agbamakwụkwọ dị na Qaragosh na mpaghara Nineveh mgbe ọdịchi a mere.

    A mabeghi ihe kpatara ọkụ a mana akụkọ na-ekwu na ọ bụ ọkụ si na ‘fireworks’ mụnyere ọkụ a.

    Ụlọ a na-agba akwụkwọ ọkụ gbara

    Ebe foto si, Getty Images

    Ọ bụ akụkụ ụlọ e ji akụrụngwa na-adọrọ ọkụ ngwa ngwa meziri ka ọkụ malite ire n’elu ụlọ ma wụtuo n’ala dịka ndị ọrụ gbanyụ ọkụ si kwuo.

    “Ọkụ a mere ka ahụ aja ụlọ ahụ daa na nkeji ole ma ole maka na e ji akụrụngwa na-esighi ike bụ nke na-adọ ọkụ ọsịsọ rụọ ha,” Onyeisi ọrụ civil defence mba Iraq kwuru.

    O dobeghi anya ma di na nwunye na-agba akwụkwọ o so na ndị nwụrụ.

    Ihe onyonyo gosiri ka di na nwunye a na-agba egwu n’ọgbọ mgbe ọkụ ahụ si n’elu na-awutu n’ala.

    Ndị ọrụ gbata gbata na-agba mbọ ịzọpụta ndị mmadụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị na-agbanyụ ọkụ nọkwa na-arị n’elu ụfọdụ osisi na ihe ndị reere ọkụ iji chọpụta ndị ka dị ndụ.

    Anya hụrụ ka ihe a si mee kwuru na ọtụtụ narị mmadụ jupụtara n’ebe ahụ mgbe ọ malitere ire ọkụ n’ihe dịka elekere 22:45 (GMT) nke abalị Tuzde.

    “Anyị hụrụ ka anwụrụọkụ si n’ime ebe ahụ apụta. Ụfọdụ jisiriike pụta ebe ndị ọzọ tọrọ n’ime ya. Ndị pụtara apụta dara mba,” Imad Yohana dị afọ 34 gbanahụrụ ọkụ ahụ gwara ndị ntaakụkọ Reuters.

    Onye dị afọ 17 ọkụ retara kwuru na di na nwunye nọ na-agba egwu mgbe a malitere ịgbali ‘fireworks’ elu tupu ị maara ihe na-eme ọkụ bido na-ere ebe niile.

    “Anyị ahụghị ụzọ chaachaa maka na anwụrụọkụ kojuru ebe niile, anyị enweghizi ike ikuli ume.”

    Onyeisiala mba ahụ agwala ndị ọrụ gbata gbata ka ha gbaa mbọ tinye uchu n’ọrụ iji zọpụta ndị mmadụ n’ọdachi a.

    Praịm minista Iraq bụ Mohammed Shia al-Sudani kwuru na a ga-enyocha ụlọ ahụ ma chọpụta ihe kpatara nke a ebe a ga-anwụchi ndị aka ha dị na ya.

    Ọkụ gbariri ụlọ agbamakwụkwọ a

    Ebe foto si, Getty Images

    O dochabeghi anya mmadụ ole nwụrụla n’ọdachi a, osote gọvanọ Nineveh bụ Hassan al-Allaq gwara ndị Reuters na mmadụ 113 anwụọla ebe otu Red Crescent Humanitarian sị na ọnụọgụgụ ndị nwụrụla na ndị merụrụ ahụ eruola 450.

    Obodo Qaraqosh bụ ebe ihe a mere bụ ebe ndị okpukpere Kraịst kachasị na mba Iraq tupu ndị na-eyi ndụ egwu bụ IS abịa were ọnọdụ n’afọ 2014 nke mere ọtụtụ mmadụ jiri gbafuo.

    Ụfọdụ ndị ntaakụkọ na-ekwu na di na nwunye a gbara akwụkwọ n’usoro okpukpere Kraịst, mana a maghi ma nke a ọ bụ eziokwu.

  15. Gịnị na-esere Victor Osimhen na otu egwuregwu Napoli?

    Osimhen bụ nwafọ Naịjirịa malitere ịgbara Napoli bọọlụ n'afọ 2020

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Osimhen bụ nwafọ Naịjirịa malitere ịgbara Napoli bọọlụ n'afọ 2020

    Onye ọkaiwu Victor Osimhen ekwuola na ha ga-akpụpụ otu egwuregwu Napoli n’ụlọikpe maka akaja ha ji nwamadị a mee na soshal midia.

    Otu egwuregwu Napoli wepụtara ihe onyonyo na TikTok ebe Osimhen tara penariti e nyere ya n’asọmpi ha na ndị Bologna, ma were olu ọzọ tinye ya nke kwuru “biko nye m penariti”.

    E wepụla ihe onyonyo ahụ na soshal midia ugbua.

    Calenda kwuru “Anyị nwere ikike ịkpụpụ ndị n’ụlọikpe ma ọ bụ mee ihe dị mkpa iji chekwaa Osimhen.”

    “Ihe e mere taa n’akata TikTok ndị Napoli adịghị mma ịnabata.

    “Ihe onyonyo na-ama Vicotor akaja ka e wepụtara n’ọha bụ nke e wepụrụla ugbua. Ihe a bụ oke ihe na-emebi njirimaara onye ọgba bọọlụ ma tinyekwuo n’ihe nwamadị a na-agabiga n’oge gara aga n’aka ndị ntaakụkọ nakwa akụkọ ụgha.”

    A hụrụ ka Osimhen na-agwa onye nchịkọta otu Napoli bụ Rudi Garcia okwu oge e wepụrụ ya n’asọmpi ha na Bologna n’ụbọchị Sọnde.

    Ka ọ dị ugbua, Osimhen ewepụla ihe ọbụla gbasara Napoli ma foto ma ihe onyonyo n’akara Instagram ya.

    Osimhen bụ nwafọ Naịjirịa banyere n’otu Napoli n’afọ 2020 n’ọnụego dị nde yuros iri asatọ na otu (81.3m euros) ma nyere ha aka mabute iko Serie A nke mbụ kamgbe afọ iri atọ na atọ gara aga, nye goolu iri abụọ na isii n’ime asọmpi iri atọ na abụọ ọ gbara.

    Otu egwuregwu dịka Chelsea na Machester United nwebuuru mmasị n’ebe ọ nọ n’oge orire na ọzụzụ ndị ọgba bọọlụ - Ugbua o nyela goolu atọ n’asọmpi isii ọ gbarala n’afọ a.

  16. Igbo ndị ọma ndewo nụ ooo!

    Unu abịala n'ụbọchị Taa?, Nke a bụ ịnabata unu n'ọgbakọ BBC Igbo taa.

    Bịa gụrụ akụkọ ndị gbapụtara ihe n'ụwa gbaa gburu gburu.

  17. Olayemi Cardoso abụrụla gọvanọ ọhụrụ ụlọakụ CBN, Ya na ndị ọzọ agafeela nyocha ndị omeowu sineti

    Olayemi Cardoso
    Nkọwa foto, Olayemi Cardoso

    Ndị ụlọomeiwu sineti enyochala ma kwenye ka Olayemi Cardoso bụrụ gọvanọ ụlọakụ kachasị na Naịjirịa bụ Central Bank of Nigeria, CBN n'ịchafụ.

    Cardoso ga-eji afọ ise malite ọchịchị ya dịka onyeisi ụlọakụ ahụ. Mmadụ anọ ndị ọzọ bụ osote ya ndị ụlọomeiwu sineti nyochakwara gụnyere Emem Nana Usoro, Muhammad Sani, Abdullahi Dattijo, Philip Ikeazor na Bala Bello.

    Onyeisiala Bola Ahemed Tinubu họpụtara Cardoso dịka gọvanọ ụlọakụ ahụ malitere ọrụ n'abalị 22 ọnwa Sepụtmba ruo mgbe ndị omeiwu mechara nyocha ha.

    Nke a na-eme ka onyeisiala chụpụrụ Godwin Emefiele bụ onye rụrụ gọvanọ isi ụlọakụ ahụ n'ọchịchị Buhari. A na-atụ Emefiele aka na mpu gbasara ego ruru nde dola itoolu e ji zụọ ihe.

    Gọọmentị etiti na-ekwu na ndị a e webatara ọhụrụ ga-enye aka mezuo ụfọdụ nkwa na atụmatụ ga-agbazi akụnaụba obodo dịka onye nkwuchiteọnụ onyeisiala siri kwuo.

  18. Abụbọọrụ ga-amalite n'Oktoba 3 na Naịjirịa niile - TUC na NLC, Ha agwala ndị otu ha na steeti niile jikere maka ngagharịiwe

    TUC na NLC
    Nkọwa foto, Joe Ajero bụ onyeisi NLC na Festus Osifo onyeisi TUC

    Ndị isi otu ndị ọrụ Nigeria Labour Congress na Trade Union Congress ejikọla aka ọnụ maa ọkwa na ha ga-amalite abụbọọrụ n'abalị 3 ọnwa Oktoba, 2023.

    Otu ahụ gwakwara ndị otu ha na steeti dị icheiche ka ha jikere maka ime ngagharịiwe.

    Festus Osifo bụ onyeisi TUC na Joe Ajaero bụ onyeisi NLC gwara ndị ntakụkụkọ okwu n'Abuja ụbọchị Tuzde.

    NLC

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ngaghrịiwe ga-eso n'abụbọọrụ na steeti dị icheiche

    Dịka ha siri kwuo, abụbọọrụ a enwebeghi ụbọchị e kwuru ọ ga-ebi.

    Cheta na ndị NLC gbaburu abụbọ ọrụ ịdọ aka na ntị n'abalị 5 ọnwa Sepụtemba mana TUC esonyeghi ha maka esemeokwu e kwuru ha nwere mana kepụ kepu na-ekwu na otu abụọ ahụ ekpeziela ugbua.

    Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Simon Lalong arịọla ndị otu abụọ ahụ ka ha wetuo obi na gọọmenti etiti na-enyoba anya na arịrịọ ha.

    Mana ndị otu ahụ agbala isi akwara ma kpebie n'ime ọgbakọ ha nwere na ha ga-amalite abụobọ ọrụ ha.

  19. Zoleka Mandela, nwa nwa Nelson Mandela, anwụọla

    Zoleka Mandela

    Zoleka Mandela, nwa nwa Nelson Mandel na nwunye bụ Winnie Madela nke Saut Afrika anwụọla ka ọ gbachara afọ 43.

    Zoleka nwụrụ site n'ọrịa kansa ara nke a chọpụtara afọ iri gara aga oge ọ dị afọ 32 .

    A gwọtaburu ya mana n'afọ gara aga, Zoleka kwupụtara na kansa ahụ lọghachiri azụ ma banye ya na ngụ nakwa imeju nakwa akụkọ ndị ọzọ.

    Onye na-alụ ọgụ maka ikike dịịrị onye, Zoleka dị afọ 10 oge a tọhapụrụ papa nnukwu ya bụ Mandela na mkpọrọ n'afọ 1990 dịka ọ nọchara afọ 27 na nga.

    Ọ ma papa nnukwu ya dịka nwoke nọ na mkpọrọ nke mere jka o nwee nnukwu ọṅụ oge a tọhapụrụ ya.

    Mandela bụ onyeisiala mbụ mba Saụt Afrịka a họpụtara site na ntuliaka nwụrụ n'afọ 2013 ka ọ gbachara afọ 95.

    Zoleka Mandela
  20. Ụlọikpe akụpụla ikpe LP na PDP ma nye Gọvanọ Sanwo-Olu mmeri

    Babajide Sanwo-Olu

    Ebe foto si, Babajide Sanwo-Olu

    Ụlọikpe pụrụiche maka ntuliaka emeela mkpebi nyere Gọvwanọ Babajide Sanwo-Olu mmeri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ e mere na Legọs.

    Ha kụchapụrụ ikpe e wetara megidere osote Gọvanọ bụ Hamzat na o ghapabụla ala Naịjirịa sonye mba Amerịka.

    Ha kụchapụkwara ikpe kwuru na Sanwo-Olu enweghi asambodo GCE.

    Nke a pụtara na ikpe nke Olajide Adediran zọrọ ọkwa n'aha PDP nakwa Gbadebo Rhodes-Vivour nke LP wegara ụlọikpe amịtaghị mkpụrụ.

    Ọkaikpe Mikail Abdullahi bụ ọnụ na-ekwuru ndị ọkaikpe ibe ya gụpụtara mkpebi ha ma kwuo na ebubo e boro Snawo Olu na osote ya bụ Obafemi Hamzat maka itozu ịzọ ọkwa ahụ bụ okwu ihe mere tupu ntuliaka nakwa na o nweghi ihe jịkọrọ ya na mmeri ntụliaka chaachaa.

    Ha kwukwara na ndị wetara ikpe esoghi n'otu APC nke mere na ha enweghi ikike ịgbagha ntozu Sanwo Olu na osote ya.