Otu Kwankwasiyya, Miyetti Allah ajụla oku ndịomeiwu Amerịka kpọrọ ka a gụnye ha dịka ndị oyiọhaegwu

Ebe foto si, Rabiu Kwankwaso/Facebook
Otu a na-akpọ 'Kwankwasiyya movement' bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-akwado Rabiu Kwankwaso chiburu Kano steeti ajụla ntarama ahụhụ ndị ụlọomeiwu n'Amerịka chọrọ ka a taa Kwankwaso.
Ha jụrụ ebubo ndị omeiwu Amerịka boro Kwankwaso maka "ịkpagbu ndị ụka kraịst, ịkpagbu ndị okpuperechi ndị ọzọ na iyi ọha egwu".
N'otu aka ahụ, otu jikọrọ ndị ọchịehi, bụ Miyetti Allah ajụkwala atụmatụ itinye otu ha dịka ndị na-enyi ọha egwu.
Na nsonso a, ndị omeiwu Amerịka wepụtara akwụkwọ ha chọrọ ime iwu nke ga-amachi Kwankwaso nakwa otu Miyetti Allah bụ nke ha chọrọ ka a kpọwa otu oyinduegwu maka ebube imekpa ndị ụka Kraistị ahụ.
Ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Habibu Sale Mohammed sịrị, "Anyị na-ekwu na ebubo ndị a eyighị ihe ọha ma banyere ndụ na ọrụ Senetọ Kwankwaso rụrụ."
Otu ahụ gara n'ihu kwuo na Kwankwaso a nọọla nọkwa Osote Onyeisi Ụlọnnochiteanya, Gọvanọ Kano Steeti ugboro abụọ, Minista Nchekwa nakwa Senetọ mana o nwebeghị oge eboro ya ebubo maọbụ maa ya ikpe maka imegide ikike dịịrị onye maọbụ mkpagbu n'ihi okwukwe.
Miyetti Allah Cattle Breeders Association of Nigeria (MACBAN) has strongly rejected the designation of the association as a terrorist organisation by the United States Congress.
Onyeisi otu Miyetti Allah bụ Baba Othman gwara ụlọntakụkọ Sun sị,"Anyị dịla na Naijiria afọ 42, o nwebeghị oge a hụrụ anyị na ndị oyiọhaegwu maọbụ anyị na ha enwee ihe jikọrọ anyị. Ya mere ọ bụ ihe mgbagwoju anya na Gọọmentị Amerịka ga-enwe ụdị mkpebi a banyere otu a na-achọ udo dịka otu e MACBAN."
Ndị omeiwu Amerịka chọrọ ka a machie Kwankwanso, Miyetti Allah na ndị ọzọ maka ebubo na aka ha dị na mkpagbu ndị ụka Kraisti na Naijiria

Ebe foto si, Rabiu Kwankwaso/Facebook
Ndị omeiwu mba Amerịka chọrọ ka Amerịka taa aka chịburu Kano steeti bụ Rabiu Kwankwaso, otu Miyetti Allah nakwa Fulani ọchịehi ahụhụ maka ebubo na ha so ebute mkpagbu ndị ụka Kraistị na Naijiria.
Ha na-akpọ oku ka Amerịka machie ha ma jichie akụ ha nwere na mba ahụ.
Ndị omeiwu Amerịka Chris Smitth na Riley Moore nọrọ n'ụbọchị Tuzde weputa akwụkwọ iwu a kpọrọ "The Nigeria Religious Freedom and Accountability Act of 2026' nke ha chọrọ ka e mee iwu iji chekwa ohere ụmụ Naịjirịa nwere ikpere chi masịrị ha.
Akwụkwọ iwu ahụ kwuru sị, "Ka Amerịka nye enyemaka ebere, ya na Gọọmentị Naijiria gbakọ aka nye ego ịkwado otu okwukwe nakwa otu ndị ọrụ ebere na-abụghị nke gọọmentị dị na steeti dị n'etiti Naijiria (Middle belt states).
Ha chọrọ ka "ngalaba na-ahụ maka steeti nakwa ngalaba na-ahụ maka ego machie ha inweta ikike ịbata Amerịka ma jichie akụnụba ha na-ndịaka ha dị na mkpagbu nke okwukwe gụnyere otu ndị Fulani ọchiehi/ndịaghannupuisi na Naịjirịa nakwa Rabiu Musa Kwankwaso, bụbu govanọ Kano steeti, otu Miyetti Allah Kautal Hore."
Akwụkwọ iwu ahụ kporo oku ka a gunye otu ndị Fulani ụfọdụ dịka otu na-eyi ọha egwu (terrorist groups).
Cheta na nsonso a, Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump zitere ndịagha ya tụrụ ogbuigwe na Naijiria.
Nke a na-abịa dika ọchịchị gụnyere Naijiria dịka 'mba kwesịrị ibebara anya maka ihe ọ kpọrọ oke ogbugbu ndị ụka Kraisti.




























