Allen Onyema: Nke bụ eziokwu maka ebubo nrụrụaka mba Amerịka boro ya

Athan Allen Onyema

Ebe foto si, @flyairpeace/X

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọọrụ Air Peace apụtala ịzaghachi ebubo nrụrụaka nke ngalaba ikpe nkwụmọtọ nke mba Amerịka boro onyeisi ha bụ Allen Onyemaka nakwa onye ọrụ ha ọzọ bụ Ejiroghene Aghagha.

N'ozi Air Peace wepụtara n'akara X ha, ha kọwara na ebubo ndị e boro mmadụ abụọ n'ụlọọrụ ha bụ nke malitere kemgbe afọ ole ma ole gara aga.

Ha kwukwara na otu ndị ọkaiwu ha tinyere anya na ya bụ okwu were na-ekpe ikpe dị na ya.

"Anyị chọrọ ikwusi ike na aka Onyema na Eghagha dị ọcha nb'ebubo ndị e boro ha dịka ikpe a ka dị n'ụlọikpe.

"Anyị ji n'aka na nke a ga-edo mmadụ niile anya n'oge adịghị anya" ka ha kwuru.

Ndekọ ebubo ndị e boro Allen Onyema

Allen Onyema

Ọ bụ n'ọnwa Nọvemba afọ 2019 ka ngalaba na-ahụ maka ikpe na mba Amerịka weputara ozi boro Allen Onyema na Ejiroghene Eghagha ebubo dị iche iche gbadoro ụkwụ na mpụ, ịweta akwụkwọ adịgboroja nakwa mbupu ego.

Mana ebubo ọhụrụ nke ha boro mmadụ abụọ a bụ na ha na-achọ ịgwu gọọmentị mba Amerịka wayo ma kwaghaa ikpe site n'iweta akwụkwọ adigboroja.

Ha sị na nke a bụ iji tọghapụ onwe ha n'ebubo mbụ ndị e boro ha.

Ọkaikpe mba Amerịka na-ahụ maka ya bụ ikpe bụ Ryan Buchanan kwuru sị "ọ bụ site n'uchu ndị ọrụ anyị tinyere na nyocha ka e ji chọpụta nkata mmadụ abụọ a kpara ma mee ka ọ dị ire ibo ha ebubo ịnwa ịkwagha ikpe gọọmentị"