Kebbi Boat Crisis: Ụmụ anọ otu nwoke anwụọla na mberede ụgbọmmiri

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụ anọ otu nwoke na Kebbi steeti anwụọla na mberede ụgbọmmiri mere na Kebbi steeti.
Otu onye na-anwụghị n'ihe mberede a bụ Musa Labaran gwara BBC na ọ gbalịrị ịzọ ndụ nwa nke ise nọketere ya nso n'ụgbọ ahụ mana o nweghi isi.Ọ gwara BBC na e buputala ozu ụmụaka anọ ahụ. A na-eche na nwa nke ise anwụọla mana a chọpụtabeghi ozu ya.
Ndị ọrụ nchekwa na ndị agbatoobi ya kwuru na ezinaụlọ ahụ nọ na-agafe osimiri ahụ ka ha gaa ugbo ha n'ụbọchị Wenezde mgbe ụgbọmmiri ha kpuru na Yauri dịka ikuku ike kuwere. Naịjirịa na-enwe mberede mmiri kwamgb kwamgbe.N'ọnwa Mee afọ gara aga, mmadụ karịrị 100 nwụrụ ka ụgbọmmiri ha kpuru na Kebbi steeti. Na Disemba, mmadụ ruru ebe 30 nwụkwara site na mberede ụgbọmmiri na Kano steeti.A na-rụtụkarị aka na ọ bụ ibu ibu karịrị oke ụgbọmmiri ga-ebuli, ị ghara ilebe anya ka ọnọdụ ụgbọmmiri dị nakwa ajọ ọnọdụ gburugburu ihu eluigwe bụ ihe na-akpatakarị mberede ndị a.
Anwụchiela onye bụbụ mịnista mba ofesi bụ Joseph Malanji maka nrụrụaka ego

Ebe foto si, AFP
Anwụchiela onye bụbụ minista na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi na Zambia akpọrọ Joseph Malanjimaka nrụrụaka ego.
Gọọmenti Zambia kwuru na ha anwụchiri Malanji maka ụlọ ọriri na nkwarị ha si o ji ego o zuru ezu zụta.
Ha kwukwara na o ji ego ruru dollar puku narị asaa o zuterer ezute zụta ụgbọelu.
Malanji agọnarịrna ebubo ndị a na mbụ.
Ọ bụ ụlọọrụ na-ahụ nmaka mpụ na Zambia akpọrọ Drug Enforcement Commission (DEC).
" Anyị ejichiela ụlọ oriri na nkwarị nakwa ụgbọelu abụọ , nke otu n'ime ya dị na South Africa ma na-agba mbọ ihụ na ebuchighara ya azụ na mba Zambia." bụ ihe Mathias Kamanga, ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ DEC depụtara n'akwụkwọ ozi o wepụtara."
Atọghapụrụ Malanji dịka ụlọọrụ Diamond TV si kwu.
Gọọmenti Zambia na-achị ugbua na-ebuso mpụ na nrụrụaka agha ka ha merichara na ntụliaka n'afọ gara aga.
Nwaanyi nwere akpa nwa abụọ, ụzọ akpa nwa abụọ, ọtụ abụọ

Elizabeth Amoaa bụ onye mba Ghana akọwala etu ịnwe ọtụ abụọ, ụzọ ọtụ abụọ, nakwa akpa nwa abụọ si enye ya nsogbu.
Amoaa dị afọ iri atọ na asatọ mana o kwuru na ọ bụ mgbe ọ dị afọ iri atọ na abụọ ka ndị dọkịta chọpụtara ihe na-eme ya.
Amoaa bizi na mba Uk ugbua kwuru na o telarịị afọ na-egbu ya mgbu nke mere ka ọ kwụsị ọrụ tupu achọpụta na o bu akpa nwa abụọ bụ ọnọdụ dị iribama.
Ọ dị ime ma mụkuo nwa ya nwaanyị amụkwụọ n'afọ 2010 na-achọpụtaghị ihe kpatara ya. O ka na-ahụ nsọ ya dịka nwa ahụ nọ n'akpa nwa nke abụọ etolite dịka Amoaa si gwa onye ntaakụkọ BBC.
Ka o mechara ọtụtụ ịwa ahụ , nyocha nakwa ịnata ọgwụ, o mechara ghọta ihe na-eme ya n'afọ 2015.
Ugbua Amoaa chọrọ ka ụwa mara ihe ọ na-agabiga ka ụmụnwaanyị ndị ọzọ ghara ịta ahụhụ ma ha na-agabiga udiri ọnọdụ a.
Ọ natara nkatọ mgbe mbụ ọ pụtara gwa ụwa maka ọnọdụ ya n'ụlọọrụ redio dị na Ghana mana ọ gbadoro anya n'ikuziri ndị mmadụ ihe ha kwesiri ịma.
O dela akwụkwọ gbasara ọnọdụ ya bụ nke o wepụtara n'ọnwa November ma hibee ụlọ enyemaka akpọrọ 'Speciallady Awareness' .
N'ọnụ Amoaa, "ụmụnwaanyị na-agabiga udiri ọnọdụ a bụ ka ha kwupute okwu, anwụla na mkpuchi ọnụ, chọpụta iohe na-eme gị n'oge ma nweta ọgwụgwọ, ma cheta na ịbụ ọpụrụiche."









