Tinubu abaala mba n’ihi ndịagha e gburu n’Abịa steeti

Bola Tinubu

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala Naịjirịa bụ Ahmed Bola Tinubu abaala mba n’olu ike n’ihi ndịagha ise e gburu n’Aba dị n’Abịa steeti n’ụbọchị Tọzde gara aga ma kwuo na agaghị anabata ụdị omume ahụ na Naịjirịa.

Tinubu kwupụtara nke a n’ozi o zipụrụ n’ụbọchị Satọde 1 Juun 2024.

Dịka o siri kwuo “Gọọmenti Etiti ga-eji ike ya niile dakwasa ndị ahụ akaọrụ ha bụ ịwakpo ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa.”

Ọ gara n’ihu kwuo na “Gọọmenti Naịjirịa na ndị ọrụ nchekwa nwere ikikere ịzọpịa ndị ekperima niile na-ebutere obodo dị iche iche ọnọdụ enweghị nchekwa.”

Tinubu kwuru na itinye iwu onye apụtakwala ezi bụ arụ dịka ọ gbara ndị ọrụ nchekwa ume ka ha chọpụta ndị aka ha dị na mwakpo ahụ e mere ndịagha n’Aba tinyekwara ndị na-akpọ oku maka ọnọdụ onye apụtakwala ezi.

Ọ kasiri ezinaụlọ ndịagha nwụrụ anwụ obi tinyekwara ndị otu ha na ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa ma gwa ha ka obi ghara ịda ha mba n’ọrụ.

Chọpụtanụ ndị aka ha dị n'ọnwụ ndịagha n'Aba - Peter Obi

Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi

Onye zọrọ ọkwa onyeisiala afọ 2023 n’okpuru Labour Pati bụ Peter Obi akatọọla mwakpo nakwa ogbugbu ndịagha ise n’Abịa steeti.

Obi kwupụtara nke a n’ozi o bipụtara n’akara ọbaozi X ya n’ụbọchị Fraịde 31 Mee 2024.

N’ozi ahụ, Obi dere sị “mwakpo e mere ndịagha n’Abịa steeti ma gbuo ise n’ime ha wutere m nke ukwuu. Omume ọjọọ ahụ bụ nke kwesịrị nkatọ, dịka ọ na-echetere anyị ọnọdụ enweghị nchekwa na tigbuo zọgbuo nke na-aga n’ihu ugbua.”

“A na m akatọ arụ ahụ nke ukwuu ma na-akpọ oku ka e mee nnyocha miri emi ngwangwa iji chọpụta ma taa ndị aka ha dị na ya ahụhụ. Anyị agaghị akwụrụ dịka osisi ebe tigbuo zọgbuo na ụjọ na-etisasị ala anyị,” ka Obi dere.

N25m Bounty: Gọọmenti Abia steeti etinyela ego n’isi ndị gburu ndịagha ise n’Aba

Ndịagha Naijiria na nnjirimara Gọọmentị Abia steeti

Ebe foto si, Nigeria Army/ Abia State Govt

Gọọmentị Abịa steeti ekpebiela inye onye ọbụla ga-enye ha ozi banyere etu a ga-esi enweta ndị omekome aka ha dị n’ogbugbu ndịagha na steeti ahụ na nsonso a ego dị nde 25 naira.

N’ụbọchị Tọzde, ndị bu egbe a mabeghị ndị ha bụ gbagburu ndịagha ise nọ ọrụ nchekwa n’Obikabia Junction, Ogbor Hill,Aba, Abia steeti dịka a na-eme ncheta ndị nwụrụ n’ọgụ Biafra.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Nke a pụtara ihe n’ozi nke Komishona Mgbasaozi steeti ahụ bụ Okey Kanu binyere aka ma wepụta ụbọchị Fraide.

Gọọmentị Abia ndị kpọrọ ya bụ ọdachi “nnukwu ịrụnye aka na anya” boro ya "ndị omekome" chọrọ iweghachi Abia steeti n’oge egwu na enweghị nchekwa chị ọgbọ rịọrọ ndị ji ezigbo ozi banyere ndị aka ha dị n’ime mere ka ha gbaara ha ama.

Ozi ahụ sịrị, “Iji gosi mkpebi anyị, Gọọmentị Abia steeti dị njikere inye onye obụla ji ozi ga-enye aka ịmata ebe ma nwuchie ndị omekome aka ha dị n’ogbugbu na nakwa ihe na-akpọtụ n’Aba na gburugburu ya nde naira iri abụọ na ise.

Gọọmenti tụrụ arịrị maka etu ihe mere ga-esi metụta ọganihu na akụnaụba ndị Abia.

“Ọ bụ ihe mwute na ọ na-eme oge e tinyererela nnukwu ego n’otu afọ gara aga iji wulite ihe e jienyere ndụaka ma kwalite akụnụba steeti maka ndị ojiegoachụego nọ n’ụlọ ma ndị si ofesi.”

Gọọmentị Abia gara n’ihu tie Ọchịagha ndịagha Naijiria bụ Majọ Generalụ Taoreed A. Lagbaja na ndịagha Naijiria aka n’obi maka ọdachi ahụ ma kpee ekpere ka mkpụrụ obi ha zuru ike na ndokwa.

Ndịagha aṅụọla iyi imemina ndị ojiegbe gburu ndị otu ha ise n'Aba
Ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, NIGERIAN ARMY

Nkọwa foto, Ndịagha Naịjirịa

Ndịagha ekwuola na ha ga-eji ikikere ha niile chụsoo ndị ojiegbe gburu ndị otu ha nọ n’ọrụ Udo Ka n’Obikabia Junction dị n’okpuruọchịchị Obingwa nke Abia steeti.

N’ozi ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa bụ Edward Buba zipụrụ, o kwuru na ndị otu IPOB/ESN na-enweta nkwado ụmụ mmadụ bụ nke mere o ji ahịa ahụ ikpochapụ ha.

Ọ sịrị na ndịagha ise tụfuru ndụ ha n’oge mwakpo ahụ dịka ha nọ ugbua na-eme nnyocha iji chọpụta ma nwụchie ha bụ ndị ojiegbe.

Ụnyaahụ ka ndị ojiegbe wakporo ndịagha n’Aba ma gbuo ise n’ime ha. Dịka akụkọ siri kọọ, mmadụ abụọ n’ime ndị ahụ e gburu egbu bụ ụmụafọ Abịa steeti.

Aka mụ na Nnamdi Kanu adịghị n'ogbugbu ndịagha - Emmanuel Iwuanyanwu, Onyeisi Ọhaneze Ndigbo

Foto Emmanuel Iwuanyanwu na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Emmanuel Iwuanyanwu/Facebook/Nnamdi Kanu/BBC

Nkọwa foto, Foto Emmanuel Iwuanyanwu na Nnamdi Kanu

Onyeisi otu Ohaneze Ndi-Igbo bụ Emmanuel Iwuanyanwu ekwuola na aka ya na aka onyeisi otu Indigenous People of Biafra (IPOB) Nnamdi Kanu adighị na ogbugbu ndiagha n’Abia steeti taa.

Ọ katọrọ ogbugbu ndịagha ahụ ma kwuo na Nnamdi Kanu a kwadoghị ihe ọbụla a kpọrọ Sit-at home.

Emmanuel Iwuanyanwu mere ka amata nke a mgbe o jere leta Nnamdi Kanu onye nọ n’ụlọ mkporo n’aka ndị ọrụ Department of State Services.

Ọ gara n’ihu rịọ onyeisiala Bola Tinubu ka a tọghapụ Nnamdi Kanu n’agbụ.

Cheta na otu IPOB nọrọ n’izuuka gara aga kwuo na ha ga-eme mmeme sit-at-home taa iji cheta ndịagha igbo e gburu n’agha 'Civil War' n'afọ 1967 ruo 1970.

Obikabia junction dị n’Aba kpụụ ọkụ n’ọnụ dịka ndị ojiegbe gbagburu ndị ọrụ nchekwa

Ogige ndịagha dị n'Obikabia ndị ojiegbe wakporo na 30 Mee, 2024

Ebe foto si, Screenshot

Ndị ojiegbe agbagbuola ndịagha Naịjirịa abụọ n’Obikabia Junction dị n’Aba bụ ọdọ azụmaahịa nke Abia Steeti.

E gburu ndịagha n’ihe dịka elekere itoolu nke ụtụtụ Tọzde 30 Mee 2024 bụ ụbọchị ncheta Biafra.

Nke a na-abịa n'ime ụbọchị ole ma ole a wakpochara ọdọ nche ndịagha dị na Milverton n'okporoụzọ Asa dịkwa n'Aba.

Ndị ojiegbe ruru iri na abụọ n’ọnụọgụgụ bu ụgbọala abụọ wakpoo ogige ndịagha na-anọ eche nche dị n’Obikabia ma malite ịgba ha egbe.

Ha gbakwara ụgbọala ndịagha ahụ ọkụ ma buru ụfọdụ ngwa egbe ha gbaa ọsọ.

Anya hụrụ ka ihe a siri mee kwuru na ha hụrụ ozu ndịagha abụọ ka ha tọgbọọ n’ala.

Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Abia Steeti bụ Maureen Chinaka, o kwuru ka anyị kpọọ ndịagha, na ọ bụghị ya na-ekwuchitere ha ọnụ.

Onye ntaakụkọ BBC kpagharịrị n’ụfọdụ ebe n’Abia steeti kọwaara ma chọpụta na ndị mmadụ apụtaghị n’uju etu o si adị na mbụ.

Dịka ọ dị ugbua, ndịagha na ndị uweojii ewerela ọnọdụ n’ebe ahụ ọdachi a mere dịka ụgbọelu ndịagha na-efegharị n’elu.

Cheta na otu Ipob nyere iwu ka onye ọbụla bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ghara ịpụta ezi iji kwanyere ndịagha Biafra nwụrụ anwụ ugwu.

N'Ọnịcha, Nnewi ebe nile tọgbọ chakoo

Ahịa azụghị, ụgbọala agbaghị taa bụ Tọzde n'ọtụtụ ebe n'Anambara steeti gụnyere Onịcha na Nnewi bụ ebe e nwere nnukwu ahịa.

N'otu aka ahụ, ụlọakụ, ụlọọrụ na ọdụahịa agbapeghị, nke ndị mmadụ na-apụta ama dịka a na-eme ncheta ndị nwụrụ n'Agha Biafra.

Cheta n'otu Ipob k[ọro oku ka a nọrọ n'ụlọ taa bụ Tozde abalị 30, afọ 2024 iji kwanyere ndị nwụrụ na ya bụ agha Ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Ochie na Naijeria lụrụ malite n'afọ 1967 rue afọ 1970.

Ule Waec ọ na-aga n'ihu n'ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị na Southeast na-agbanyeghi 'sit at home' maka ncheta ụbọchị Biafra

Ụlọakwụkwọ na-akwado ile ule Waec

Ule West African Examination Council (Waec) na-aga n'ihu n'ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa taa bụ ụbọchị ncheta Biafra.

Nke a na-abịa dịka otu na-achọ nwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (IPOB) tinyere iwu ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nke Naịjirịa.

N'Imo Steeti

Onye ntaakụkọ BBC Igbo kpaghara n'ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị n'Ọwụwa Anyanwụ n'isi ụtụtụ chọpụtara na ụmụakwụkwọ na-akwado ile ule ahụ.

Ọ chọpụtakwara na onye nlekọta ule a kpọrọ 'external invigilaltor' bu akwụkwọ ule nọrọ n'ụlọakwụkwọ ahụ.

O kwuru na ọ bụ naanị ụmụakwụkwọ nọ n'ogogo ile ule ahụ bịara n'ụlọakwụkwọ ahụ na ndị nọ na klassị ndị ọzo abịaghị.

Otu onye nkuzi n'otu ụlọakwụkwọ dị n'Owerri kwuru na ule ha gara nke ọma na-agbanyeghi na ndị ọrụ nchekwa anọghị nso.

N'aka nke ndị ọrụ nchekwa Civil Defence, ka onye ntaakụkọ anyị hụrụ n'otu ụlọakwụkwọ ọzọ ka ha na-echekwa ụmụakwụkwọ na-ele ule Waec.

Ụmụakwụkwọ na-ele ule Waec n'Imo Steeti
Ndị ọrụ nchekwa Civil Defence ka ha na-echekwa ụmụakwụkwọ na-ele ule n'Imo Steeti

N'Ebonyi Steeti

Onye ntaakụkọ anyị nọ n’Abakaliki Ebonyi Steeti kpagharịrị ma chọpụta na ụlọakwụkwọ abụọ n’ime anọ ọ gara mechiri emechi na-enweghi ule ọbụla a na-ele ebe ahụ.

N’aka nke ọzọ ụlọakwụkwọ abụọ mepere emepe dịka ụmụakwụkwọ na-ele ule Waec.

Mana ihe ndị dịka ụlọahịa, ụlọakụ, ụlọazụmaahịa ndị ọzọ ndị ọzọ mechiri emechi ebe ọtụtụ okporoụzọ tọgbọọ chakoo.

Ụmụakwụkwọ na-ele ule Waec n'Ebonyi Steeti

Ụbọchị ncheta Biafra ọ na-egbochi ụmụakwụkwọ na-ele ule WAEC n'Ọwụwa Anyanwụ taa?

Ụmụakwụkwọ na-akwado ule

Ebe foto si, Getty Images

Dịka ụbọchị 30 Mee 2024 bụ ụbọchị ncheta Biafra a kpọrọ 'Biafra Rememberance Day' na Bekee, otu Ipob kwuru ka onye ọbụla apụtala ezi n'Ọwụwa Anyanwụ.

Ipob kwuru na iwu a bụ iji kwanyere ndịagha Biafra nwụrụ n'oge agha ukwu nke ikpeazụ.

Mana taa bụkwa ụbọchị ụmụakwụkwọ na-ele ule West African Examination Council (Waec) ka ha lee ule na galaba 'mathematics'.

Ajụjụ ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ bụ ma iwu a ọ ga-emetụta ụmụakwụkwọ na-ele ule na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ?

Ipob mgbe ha na-ekwupụta iwu ịnọ n'ụlọ ahụ dọrọ ụmụakwụkwọ na-ele ule aka na ntị ka ha ghara isepụta isi n'ụbọchị ahụ.

Ụlọọrụ na-ahazi ule Waec dị mbụ kwuo na ha agaghị akwụsị ụmụakwụkwọ ile ule ahụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ihi iwu ịnọ n'ụlọ Ipob tinyere.

Onyeisi ha na Naịjirịa bụ Amos Dangut gwara ụlọntaakụkọ Daily Sun na ha kwetara na e nwere nsogbu nchekwa ebe niile na Naịjirịa ma kwuo na nke a butere ọgbatuhie ịhibe ule n'ebe ndị ahụ.

"Anyị na-adabere n'aka ndị uweojii ịhụ na e wulitere nchekwa n'ebe ndị a" ka o kwuru.

Ihe ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ kwuru

Ụmụakwụkwọ na-aga akwụkwọ n'ụzọ n'ụbọchị Sit at home n'afọ 2021

Ụfọdụ steeti n'ọwụwa anyanwụ agbarụọla ihu maka ụbọchị nọrọ n'ụlọ nke otu Ipob hibere.

Gọọmentị Enugwu steeti n'ozi nke Ken Ugwu bụ onyeisi ndị ọrụ na steeti ahụ weputara kwuru na ha agbaruola ihu "n'atụmatụ iji mebi ọdịnihu ụmu aka anyị nke mere na etinyela usoro nchekwa zuruoke iji wepụta nchekwa na ohere ịgagharị nke ndị mmadụ n'ime steeti ahụ" .