Abụ njirimara ochie ga-enyere aka jikota obodo Naịjirịa – Sịnatọ Victor Umeh

Ebe foto si, NOA/VICTOR UMEH FACEBOOK
Sịnatọ na anochiteanya Anambra central n’ụlọ omeiwu sịnet Naịjirịa bụ Victor Umeh ekwuola na abụ njirimara ochie a onyeisiala Bola Tinubu nwechitara bu nke ga-enweta ezi njikọ obodo Naịjirịa.
N’okwu ya “Abụ njirimara ochie a enweghị onye ọbụla ọ ga emetụta n’ụzọ ọjọ ọbụla”
“Inweghachita abụ njirimara 'Nigeria we hail thee' abụghị ihe ojo maka na abụ njirimara ‘Arise O Compatriots’ anọọla afọ 46.
Umeh gbara ama si “Ndị dere abụ njirimara ochie ahụ mara na-enwere oge ọ ga eru, ụfọdụ mpaghara Naịjirịa ebido mekpaba ibe ha ahụ, ọ bụ ya mere ha ji wee kpee ekpere n’abụ ahụ ka chukwu nyere anyị aka ịjikota onu dịka otu obodo.”
National Anthem: Ihe ndị dị mkpa ị kwesịrị ịma maka Abụ Njirimara Naijiria ọhụrụ

Ebe foto si, NOA
Ọ bụghị Egwu Njirimara ọhụrụ kpọmkwem, kama ndị omeiwu Naijiria nọrọ n'abalị 29 nke ọnwa Mee afọ 2024 kwekọrịta ka e weghachite Egwu Njirimara Naijiria ochie isi okwu ya bụ "Naijiria Anyị Ekelee Gị" ( 'Nigeria We Hail thee'.)
N'abalị 29 nke ọnwa Mee afọ 2024 ka Onyeisi ụlọoimeiwu Ukwu Naijiria bụ Godswill Akpabio mara ọkwa na Onyeisiala Naijiria bụ Bola Tinubu binyere aka n'akwụkwọ Iwu iweghachi egwu njirimara ochie.
N'afọ 1978, n'oge ọchịchị ndịagha nke Olusegun Obasanjo nọ n'isi ya, a kwụsịrị ịgụ 'Nigeria We Hail thee' ma were'Arise O Compatriots were tichie ya.
Ebe ka "Nigeria, We Hail Thee" si?

Ebe foto si, NOA
Naijiria malitere ịgụ Egwu Njirimara ọhụrụ a n'afọ 1960 dịka e nwetara nnwereonwe n'aka ndịọcha(Briten) n'afọ 1960.
Mana n'afọ 1978, e wepụrụ ya n'ụsọ , ma tinye , Kunie ndị "(Arise, O Compatriots)," .
Onye dere ya?
Otu nwaanyị onye mba Briten bi na Naijiria oge e mere Independa bụ Lillian Jean Williams bụ onye dere egwu njirimara Naijiria 'Nigeria We Hail Thee'.
Ka a bụ dịka ọchịchi ndị ọcha nọ oge ahụ haziri asọmpi si ndị mmadụ dee egwu njirimara ma kwuo na onye meriri n'asọmpi edemede agụ ga-erite otu puku paụns.(£1,000)
Nwada Frances Berda tiri ya bụ egwu maka ọgụgụ, ma ritekwa ego maka nke a.
Onye dere 'Arise O compatriots'?
Ụmụafọ Naijiria ise bụ ndị gbakọrọ aka dee Egwu Njirimara Naijiria "Arise O Compatriots".
Ha gunyere P. O. Aderibigbe, John A. Ilechukwu, Dr. Sota Omoigui, Eme Etim Akpan nakwa B.A. Ogunnaike.
Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu
Dịka akụkọ gbara na ndị ọchịchị agbanweela Abụ Njirimara Naijiria gaghachi na nke ochie, ọtụtụ ụmụ Naijiria gbarụrụ ihu.
Ọtụtụ ya hụtara ya dịka onye ụlọ ya na-agba ọkụ ọ na-achụ oke n'ihi na iwu ọhụrụ ahụ na-abịa dịka agụụ, ihe isi ike, nsogbu nchekwa na-awa ụmụ Naijiria agba.
Onye bụbụ Minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Oby Eze kwesịli kwuru na o nweghị onye ga-amanye ya ịgụ 'Abụ Njirimara Naijriia' e weghachiri azụ sị na ọ bụ 'Arise O Compatriots' bụ nke ya ma.











