Ihe niile i kwesịrị ịma maka etu ị ga-esi nweta PVC gị

Inec PVC

Ebe foto si, Inec

    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Lagos

Dịka ntuliaka 2023 na-akpudebe nso na Naịjirịa, ngalaba na-ahazi ya bụ ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) amalitela ikesa akwụkwọ ikike ịtụ vootu nke a na-akpọ 'Permanent Voter Card' maọbụ PVC n'ịchafụ.

Nkesa a bụ maka ndị debanyere aha ha ọhụrụ n'akwụkwọ ntuliaka maọbụ ndị debanyere ochie mana ha agabeghị nata PVC ha, maọbụkwanụ ndị bugharịrị ebe ha nọbụ atụ vootu si otu ebe gafee ebe ọzọ.

Ndị ọzọkwa bụ ndị PVC ha gbajiri agbaji, maọbụ ndị ihu PVC ha kpụchara akpụcha, maọbụkwanụ ndị nke ha furu efu.

Dịka Inec si kwuo, ụbọchị a malitere ikesa ndị mmadụ PVC ha bụ n'ụbọchị 12 nke ọnwa Disemba 2022, ọ ga-akwụsị n'ụbọchị 22 nke ọnwa Jenụwarị 2023.

Lee ọtụtụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ maka nkesa PVC nakwa ọsịs ha:

Ọ bụ naanị ndị debanyere aha ọhụrụ a ga-enweta PVC?

Mba. Inec kwuru na ọ bụrụ nd i debanyere aha gị tupu ntuliaka nke afọ 2019, mana ị nataghị PVC gị n'oge ahụ, ohere dịịrị gị ugbua ịga were ya maka na mpaghara ị nọ debanye aha gị.

Kedụ ebe m ga-aga nata PVC m?

Inec PVC

Ebe foto si, Inec

Oge Inec malitere ikesa PVC n'ụbọchị 12 nke ọnwa Disemba, ọ bụ n'isi ụlọọrụ okpuruọchịchị dị icheiche ka mmadụ ga-aga nata nke ya.

Mana malite n'ụbọchị isii ruo ụbọchị 15 nke ọnwa Jenụwarị 2023, i nwere ike ịga na wọọdụ (ward) gị ga nara PVC nke gị.

Ọ gachaa ụbọchị 15 nke Jenụwarị, a ga-ebughachikwa PVC n'isi ụlọọrụ okpuru ọchịchị dị icheiche ruo ụbọchị 22 nke Jenụwarị oge a ga-akwụsị nkesa PVC kpamkpam.

Kedu etu m ga-esi mata wọọdụ (ward) m?

Inec pvc

Ebe foto si, Inec

Nkọwa foto, Etu ị ga-esi mara ebe ị ga-aga nata PVC gị site n'ekwentị gị

Na wọọdụ dị icheiche, Inec wepụtara otu ebe ndị mmadụ ga-aga ịnara PVC ha.

Ọnụọgụgụ wọọdụ maọbụ ogige ndebanye aha (Registration areas/wards) Inec nwere dị 8,809.

Ị chọọ ịmate kpọmkwem ebe a na-ekesa PVC kacha nso na wọọdụ gị, pịa aka ebe a.

Ọzọkwa, Inec wepụtara akara ekwentị ebe mmadụ ga-eziga aha steeti ya, okupuru ọchịchị ya nakwa wọọdụ ya.

Dịka Inec si kwuo, ọ bụrụ na iziga ihe ndị a site n'akara ekwentị i ji debanye aha n'akwụkwọ ntuliaka, Inec ga-ezitere gị ebe ị ga-aga were PVC gị.

Atụfuola m akwụkwọ ndebanye aha m, gịnị ka m ga-eme?

Inec

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Etu ị ga-esi nweta akwụkwọ njirimara ndebanye aha gị iji nata PVC gị

Cheta na Inec na-enye ndị mmadụ akwụkwọ njirimara n'ụbọchị onye ahụ debanyere aha ya n'akwụkwọ ntuliaka.

Akwụkwọ njirimara a ka onye ahụ kwesịrị iji bịa narazie PVC ya nke ga-enye ya ikike ịtụ vootu.

Ọ bụrụ na ịtụfuola ya bụ akwụkwọ njirimara, ọ gaghị adịrị gị mfe ịnata PVC gị, maka na ọ bụ akwụkwọ ahụ ga-eme ka onyeọrụ Inec mara ebe ọ ga-achọ PVC gị ka ọ dị mfe ịchọta ya.

Lee ihe ị ga-eme:

  • Were ekwentị maọbụ kọmputa gị chọọ www.cvr.inecnigeria.org/vvs
  • Ọ ga-ebute gị n'ebe a kpọrọ 'Voter Verification Service'
  • Tinye steeti ebe ị nọ debanye aha
  • Tinye aha gị na aha nna gị
  • Tinye ụbọchị ọmụmụ gị
  • Pịa aka ebe e dere 'check status'
  • Ọ bụrụ na aha gị dị n'akwụkwọ ntuliaka, ọ ga-ebupụtara gị ozi gbasara ndebanye aha gị.
Inec

Ebe foto si, Screengrab

Chetakwa na ọ bụrụ na i bugharịrị ebe ị ga-anọ tụọ vootu, steeti ị ga-etinye bụ steeti ebe ị nọ ugbua, ọ bụghị steeti ebe ị nọ debanye aha na mbụ.

I ji maa atụ, ọ bụrụ na i debanyere aha ma tụọ vootu na Abuja n'afọ 2019, mana ugbua ị nọzị na Legọs ma bugharịa ebe ị ga-anọ atụ vootu na 2023 ka ọ bụrụzie Legọs, ebe ị ga-ede n'ọba ozi Inec VVS bụ Legọs, ọbụghị Abuja.

Aha m dị n'akwụkwọ ntuliaka mana enweghị m PVC, aga m enweike ịtụ vootu?

Mba! Inec ekwuola ugboro ugboro na naanị ndị nwere PVC ha bụ ndị ga-enweike ịtụ vootu n'ụbọchị ntuliaka.

Nke a bụ maka na akụrụngwa tekịnụzụ a kpọrọ 'Bimodal Voter Verification System' bụ naanị PVC nke Inec nyere ka ọ na-anabata.

Ọ bụrụ na ejighi BVAS nyochaa mmadụ n'ụbọchị ntuliaka, onye ahụ agaghị atụnwụ vootu.