Ụlọọrụ anyị dị icheiche amalitela ikesa PVC ugbua - Inec Anambra

PVC

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Foto a bụ nke e tinyere iji kọwaa akụkọ

Ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) n'Anambra Steeti akọwaala ihe mere ha ebidoghị nkesa PVC na steeti ahụ n'ụbọchị Mọnde, abalị iri na abụọ nke ọnwa Disemba, dịka isi ụlọọrụ Inec dị n'Abuja si nye ntuziaka.

PVC bụ aha ịchafụ maka 'Permanent Voter Card' nke bụ ikike mmadụ nwere iji tụọ vootu na Naịjirịa.

Cheta na ụlọọrụ Inec kwuru na ndị mmadụ ga-enwe ohere iwere PVC ha malite n'ụbọchị 12 nke Disemba 2022 ruo ụbọchị 22 nke ọnwa Jenụwarị 2023.

BBC Igbo gara n'ụlọọrụ Inec dị n'okpuru ọchịchị anọ - Awka South, Dunukofia, Njikoka na Oyi - n'ụbọchị Mọnde wee chọpụta na ha niile kpọchiri akpọchi.

Kingsley Agu, bụ ọnụ na-ekwuru Inec n'Anbambra kọwara na ọ bụ maka ihi nchekwa kpatara nke a.

"Ị ma na ụbọchị Mọnde nwere ka o si adị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ya mere na anyị anaghị emepe iji chekwaa ndụ ndịọrụ anyị maka na ndụ bụ isi," Agu kwuru.

"Mana ị gaa n'ụlọọrụ anyị niile taa, ị ga-ahụ na ndị mmadụ na-ewere PVC ha, ihe niile na-aga n'anya ya."

Ndịọrụ Inec apụtaghị n'Anambra ụfọdụ, iyi egwu n'Imo,Ebonyi, ịnata PVC dị mfe n'Abia

Ịnata akwụkwọ vootu

Ebe foto si, Inec/BBC

Ụlọọrụ na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ 'The Independent National Electoral Commission (Inec)' zipụtara ozi na ha ga-amalite inye ndị debanyere aha inweta akwụkwụ ikike ịtụ vootu nke a ana-akpọ Permanent voters card (PCV) taa bụ Mọnde, ụbọchị 12 nke ọnwa Disemba.

Inec kwụsịrị ndebanye aha n’ụbọchị 31 nke ọnwa Julaị, 2022 iji hazie ma bịpụta akwụkwọ ikike ndị a.

Lee etu nnata akwụkwọ ikike ndị a si aga n’akụkụ Ọwụwa Anywanụ Naịjirịa dị iche iche.

Mmiri ozuzo ezughị ịchụsa ndị mmadụ na Pọtakọtụ

Pọtakọt

N'agbanyeghị mmiri zọro, ọtụtụ ndị mmadụ pụtara iwere PVC ha n’ụlọọrụ Inec dị n'Okpuru Ọchịchị Obio/Akpor dị na Rịvas steeti.

Onye ntaakụkọ anyị hụkwara ka ụfọdụ n'ime ha na-ewere ya bụ PVC, mana mmiri ozuzo mere ka usoro ya na-egbu oge.

N' Abia, ịnata PVC anaghị egbu oge

Ndị bịara ị nara PVC n'Abia

Oge onye ntaakụkọ anyị gara n'ụlọọrụ Inec dị n' Okporouzọ Adelabu Street, Adelabu street isiobodo Abia, hụrụ PVC, ma hụkwa ụmụamala na-eche ka o ruo ha ka ha were nke ha.

Otu onye bịara ị nara akwụkwọ PVC bụ Obioma Onyeaghala gwara onye ntaakụkọ anyị na o werughị ya nkeji 10 ịnata ya.

O jikwa ohere ahụ kpoku ndị mmadụ ha ga were nke ha.

Gladys Chukwu bụ onye nwetakwara nke ya negbughị oge kwukwara na ọ dị mfe inweta ya ma gwa onye ntaakụkọ anyị na ya ejikerela maka ntuliaka na-abịa.

Ndị bịara ị nara PVC n'Abia Steeti

Anambra steeti: A kpọchiri ụlọọrụ Inec akpochi

Ụlọọrụ Inec na Dunkofia,Anambara steeti

Igwe ndị mmadụ gbakọtara n’akụkụ Anambara dị iche iche dịka ha pụtara inweta akwụkwọ ikike ịtụ vootu ha.

BBC Igbo gara n’ụlọọrụ Inec ndị dị n’Awka bụ isi obodo Anambra steeti. N’okpuruọchịchị Njikoka, Awka South, Oyi nakwa Dunukofia, enweghị ndị ọrụ Inec a hụrụ dịka ebe niile tọgbọọ chakoo ma a gbachiri ụlọọrụ ahụ niile agbachi. Ụfọdụ na-eche na e nwereike ịbụ na nke a mere maka iwu onye nọrọ n’ụlọ nke otu Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere bụrụ kwa ụbọchị Mọnde ma mechaa kagbuo ya.

Ebe ndị tọgbọọ chakoo
Nkọwa foto, Ụlọọrụ Inec n'Awka South

Kemgbe afọ 2021 ya bụ iwu ka na-aga n’ihu n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ dị iche iche dịka ụfọdụ ndị otu ojiegbe amabeghị ndị ha bụ na-amanye ndị mmadụ ya bụ iwu.

Ụlọọrụ Inec

Imo steeti: Ndị bu egbe kụsara ụlọọrụ Inec n'Owere

Ụlọọrụ Inec

Ọsọ tara n’ụlọọrụ Inec n’Owere bụ isi obodo Imo steeti n’ụtụtụ taa dịka ndị bu egbe wakporo isi ụlọọrụ Inec dị ebe ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abattam kwuru na ndị uweojii gburu mmadụ atọ n'ime ndị bịara mwakpo a ebe otu onye uweojii tụnyere ndụ ya dịka ha kwarịtara mgbọ.

Otu onye uweojii ọzọ merụkwara ahụ.

Ụlọọrụ Inec

Abattam gara n'ihu kọwaa na ndị ekperima ahụ si n'ogige ebe a na-ere mmanụ ụgbọala iji tụbanye ogbunigwe ahụ n'ime ụlọọrụ ndị Inec.

Ebonyi steeti: Ndịọrụ Inec apụtaghị

Ụlọọrụ Inec n'Ebonyi
Nkọwa foto, Ụlọọrụ Inec n'Abakiliki kpọchiri akpọchi

Isi ụlọọrụ Inec n’Abakalili, Ebonyi steeti tọgbọ chakoo dịka enweghị onye ọrụ Inec ọbụla a hụrụ ebe ahụ.

E nweghịkwanụ ndị a hụrụ bịara inweta akwụkwọ ịtụ vootu ha mana ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa wụjuru n’akụkụ ogige ụlọọrụ Inec niile ebe ahụ.

Cheta na ndị ojiegbe amabeghị ndị ha bụ wakporo akụkụ Ebonyi steeti dị iche iche n’ụtụtụ taa bụ Mọnde.

Ahịa

Akụkọ kwuru na ndị ojiegbe ahụ mụnyere akụkụ ahịa Ishieke ọkụ ma gbakwa otu ụgbọala ọkụ n’ahịa New Market dị nso okporoụzọ si Abakaliki gawa Enugu.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo ji anya ya hụ etu ebe niile siri tọgbọ chakoo dịka ndị mmadụ ji ụjọ gbabasia be ha.

Kọmịshọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Uchenna Orji kwuru na enweghi onye maọbụ akụnụba onye ọbụla ya bụ mwakpo metụtara dịka ọ gbarụrụ ihu nye iwu nọrọ n’ụlọ ahụ.

O gwara ndị mmadụ ka ha gawa mkpa ha ma ghara ịnọ n’ụlọ taa bụ Mọnde

Iwere PVC na-aga nke ọma n'Abuja

Onye weterela PVC ya
Nkọwa foto, O gbughị oge ọbụla tupu m nweta PVC nke m - Alexander

"Tupu e nye onye ọbụla PVC ha, onye ahụ ga-egosi akwụkwọ e nyere ya n'ụbọchị o denyere aha ya n'akwụkwọ ntuliaka, nke a na-akpọ 'Temporary Voter Card' (TVC)," onye ntaakụkọ anyị kwuru.

"Otu onye na-ejighi TVC ya gosiri ebe o sere ya foto n'ekwentị ya, ndị Inec nabatara nke a ma nyekwa ya PVC."

"Mana ụfọdụ ndị a na-acghọtaghị aha ha n'ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ, ndịọrụ Inec gwara ha ka ha lọghachi n'ọnwa Jenụwari bịa were ya."

Inec Bwari, Abuja

Onye ntaakụkọ anyị gakwara lee etu usoro inweta PVC si aga n'okpuru ọchịchị Bwari nke dị n'Abuja.

O kwuru na ọ hụrụ ka ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha nwereike ịkarị otu narị kwụrụ n'ahịrị, iji nweta PVC ha.

Otu onye aha ya bụ Alexander Kenneth gwara onye ntaakụkọ anyị na o gbughị ya oge ọbụla inweta PVC ya n'ihi na usoro ya na-aga nnọọ siriri werere.