Ọ bụ eziokwu na-ekweghị ndị Igbo nweta PVC ha na Legọs? Lee ihe anyị hụrụ

Festus Okoye bụ ọnụ na-ekwuchitere nbalaba INEC gwara BBC Igbo na ha etinyela usoro iji hụ na ndị mmadụ nwetara PVC ọsịsọ.

Okoye kwuru sị, " Anyị atụghị anya dịka etu igwe mmadụ siri pụta ịnweta PVC ha, kama anyị ewepụtala igwe 209 eji edebanye aha maka ndị chọrọ ịnweta PVC ha".

O kwuru na mgbe ọ fọrọ abalị ole na ole ka ya bụ ndebanye aha gwụ, na ha ga-enwe nzụkọ mara ma ha aga adọọtị oge ịdebanye aha ntuliaka".

Ndị chọrọ ịnweta PVC ha

Ọ bụ eziokwu na-ekweghị ndị si na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa ekweghị idebanye aha ha?

Tọzde, ụbọchị itoolu nke ọnwa Juun ka ndị ahịa Alaba International Market dị n’Alaba, Okpuruọchchi Ojo nke steeti Legọs mechiri ahịa maka ịgbata akwụkwọ ikike nke e ji atụ vootu a kpọrọ PVC na Bekee.

Ya bụ ihe butere ọgbaghara di egwu maka na ndị ọrụ Independent Electoral Commission, Inec, akwadoghị maka ya bụ ihe mere n’ụbọchị ahụ.

N’otu mpaghara obodo dị n’okpuruọchịchị ebe ahụ bụ Igbede, Ojo, e nwere ezigbo ọgbaghara ebe ahụ maka ọtụtụ mmadụ bịabidoro ndị ọrụ Inec na mberede.

Ginị ka soshal midia kwuru gbasara ya bụ ọgbaghara?

Ihe na-ewu na soshal midia ụbọchị ahụ bụ na ndị Yoruba ekweghị ka dị Igbo gbata ya bụ PVC.

Ọtụtụ ihe onyonyo pụtara ebe ndị Igbo na-ekwu ihe mere ha ebe ahụ.

Ọ nwechere ụfọdụ meruchere ahụ mana ọnweghị onye nwụrụ.

Kedụ ihe BBC Igbo hụrụ ebe ahu?

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mgbe BBC Igbo ruru n’ulọọrụ Inec dị na Igbede, Okpuruọchịchị ebe ahụ echi ya bụ ụbọchị iri nke ọnwa Juun, anyị hụru ọtụtu mmadụ ebe ahụ, hụkwa na ihe niile na-aga werere.

BBC Igbo hụkwara ụgbọala ndị uweojii nakwa ndị uweojii nọ ebe ahụ.

BBC Igbo gbara mbọ ịba n’ime ụlọọrụ ebe ahụ ịga jụọ ndị isi ụloọrụ Inec nọ ebe ahụ ka eke si anya anwụ. Mana ndị nche ha ekweghị ka anyị baa agbanyeghị na anyị kọwara onwe anyị.

BBC gbara mbọ ịgba ụfọdụ bịara ebe ahụ ajụjụ ọnụ, ebe ọtụtu jụru ikwu okwu, mmadụ atọ nọ ebe ahụ mgbe ya bụ ihe mere gwara anyị ihe ha hụru.

Otu nwaamadị bụ Lawal Wahid kwuru na e buuru ngwaọrụ ndị Inec gawa ebe ndị ọzọ ha kwesiri ịga ọrụ.

“Ndị mmadụ sị na Inec ekwesighị ibupu ngwaọrụ ndị ahụ maka na otu ha hapụru ebe ahu agaghị ezu ọtụtu mmadụ gbakọrọ ebe ahụ”.

Ya bụ nwaadị kwuru na ndị ahịa ahụ malitere ịzọ ya bụ ngwaọru ndị Inec ụzọ, nke mere ka ya na ndị Inec malite ịnwe nsogbu.

O kwuru maka onye Eze obodo bịara ebe ahụ mgbe ahụ bu nke ndị mmadụ kụpụrụ okpu ya n’isi.

Nke a mere ka ndị ntọrọbịa obodo bịa lụsawa ndị ahịa ọgụ, malite imebi ihe.

Ọ sị na ndi uweojii mechere bia chụpụ ndị mmadụ n’ezị kpochie ụzọ e sị abata n’ebe ahụ.

Mgbe BBC Igbo gbara nwaada Chinasa Ikemeziem bụ onye nọ ebe ahụ ụbọsị ahụ ajụjụ ọnụ, ọ sị na “ọ bụ ndị Igbo ka ha siri ka ha pụọ n’ezi, mana ọtụtụ n’ime ha jụru, kwechiri na ya agaghị apụ”.

Ọ sịkwa na e mechere gbanyechaa onye obụla nọ n’ime ebe ahu PVC ka ndị uweojii bịara gboo ya bụ ọgụ.

Mmadụ abụọ ndị ọzọ anyị gbara ajụjụ ọnụ ekwughị na ọ bụ ndị igbo ka a chụpụru ezi, kama na ọ bụ ndị na-akpa aghara ebe ahụ.

BBC mechere gakwa na nke onyeisi ndị ahịa Alaba International Market Association (Electronic) bụ Paulinus Ugochukwu bụ onye sị na, “n’ezie anyị amaghị na Inec agaghị adị nkwadebe maka ọtụtụ mmadụ bịakwutere ha onyaahụ”.

Mana na ọ sị na ọ dị mkpa na ha mechiri ahịa maka na ọtụtu mmadụ enweghị ya bụ PVC.

Maazi Ugochukwu si na ọ bụ otu ndị ahịa kwekọrịtara na ha ga-emechị ya bụ ahịa ubọchị ahụ maka ịgbata ya bụ akwụkwọ.

“ha sị ọ bụrụgodi otu izu ka ha ga-emechi ahịa ma ya bụrụ na onye obụla gbatara PVC, na ha ga-eme ya”.

O kwuru na ha na ndị Inec nọ na mkparịtaụka ịhụ na ha butere ha akwụrungwa n’ime ahịa maka ịgba ya bụ PVC.

Ugochukwu kwukwara na ‘ọ bụghị eziokwu na a kwụsịrị ndị Igbo ịweta PVC ha n’Alaba’...’kama na ọ bụ maka na ndi Inec adịghị njikere maka ọtụtụ mmadu putara ya bụ njem’.