Nigerian Constitution: Adịmiche dị n'etiti iwu Naịjirịa nke ndị agha na ndị ọchịchị onyekwuouche ya dere

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Nnamdi Agbanelo
- Ndị mere akụkọ a, Digital Technical Producer
- Ebeg o si, Lagos
“Iwu a jikọrọ Naịjirịa bụ iwu ndị agha manyere anyị amanye mgbe ha naara ọchịchị na afọ 1966. Anyị agaghị enwe udo, ruo mgbe a weghachịrị iwu jikọrọ obodo a ka ọ bụrụ mgbe mmadụ niile si obodo a jikọrọ aka wepụta ya bụ mgbe Naịjirịa were nnwereonwe ha”.

Okwu a Ayo Adebanjo kpụ n’ọnụ bụ okwu ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa kpụ n’ọnụ ugbua.
Ụfọdụ na-ekwu na iwu obodo Naịjirịa bụ iwu na-emegide ndị mmadụ nkịtị na Naịjirịa. Ụfọdụ ndị ọzọ na-eti mkpu ka e weghachite iwu jikọrọ obodo nke afọ 1963 bụ iwu mbụ nke ndị Naịjirịa niile na mpaghara niile jikọrọ aka wee wepụta ka ọ bụrụ iwu ga-achịkọta ha, ma tufuo iwu afọ 1999 nke ọchịagha Abdulsalami Abubakar hibere ka ọ chịkọta obodo Naịjirịa.
Ka a kwụsịtụ ntuliaka 2023 ma tinye onyeisiala ga-anọ ọnwa isii ka ọ nwee kwadoo iwu ọhụrụ obodo Naịjrịa nke ọ kpọrọ ‘a new-look peoples constitution’
Afe Babalola (SAN) tinyekwara ọnụ n’okwu a.
Mana kedụ ndịiche dị n’etiti iwu abụọ na-akpalite ọtụtụ okwu n’obodo Naịjirịa?

Ka iwu Naịjirịa si gbanwee kamgbe Naịjirịa malitere ịbị otu obodo na nkenke.

Iwụ jikọrọ Naịjirịa agbanweela ọtụtụ oge site na mgbe ndịọcha na-achị, ruo mgbe naị Naịjirịa nwetere nnwereonwe ha, ruo mgbe ndị agha weere ọchịchị ma ruzie ugbua Naịjirịa bụzị obodo ọchịchị onye kwo uche ya.
Iwu Lord Federick Lugard nyere Iwu nke 1914

Ka anyị malite n’afọ 1914 mgbe lord Federick Lugard hibere iwu nke mbụ nke Naịjirịa. E mechara chọpụta na iwu ahụ nwere ọtụtụ nsogbu dị na ya.
Sir Hugh Clifford Nyere Iwu 1922

- N’afọ 1922, Sir Hugh Clifford hibere iwu ọhụrụ dịka ọ kagburu nke mbụ mgbe ọ bụ onyeisi obodo.
- Iwu a ka a kpọrọ Iwu Clifford. O nyere ndị isi ojii (si Naịjirịa) gụtara akwụkwọ ka ha soro n'usoro ndọrọndọrọ ọchịchị nke a kpọrọ British West Africa Council. Ndị a bụ ndị kpebiri ka mkpata na nwepụ si aga na Naịjirịa. Ndị a sokwa katọọ ikikere ndị Afrịka enweghị ma nweekwa ike ịzọ nnwereonwe ha.
Sir Arthur Richard nyere Iwu nke 1946

- Ka Sir Arthur Richard weere ọchịchị n’afọ 1945, iwu Naịjirịa gbanwere ọzọ n’afọ 1946.
Iwu John Macpherson nke 1951

Ebe foto si, Getty Images
- N’afọ 1951, Naịjirịa nabatara iwu ọzọ bụ iwu Macpherson. Iwu a bụ iwu onyeisi obodo ọhụrụ bụ Sir Machpherson hibere. Iwu a kwadoro Naịjirịa inwe ụlọ omeiwu.
- John Macpherson wepụtara iwu nke ya sitere n'isi na a ga-enwe ndị omeeiwu na ndị isi ọchịchị Naịjirịa. Ndị mepụtara ụlọ omeeiwu ndị a bụ ndị si mpaghara isii Gọvanọ tụrụ aka ka ha soro ọchịchị mana ndị mmadụ sị na ndị a esighị obi ndị Naịjirịa nkịtị.
Iwu Oliver Lyttleton nke 1957

Ebe foto si, Getty Images
- Iwu Lyttleton nwekwara ebe ndị a chọpụtara na ọ dara mba nke ya nke mere e ji hibe ọgbakọ n’afọ 1957. Iwu ya kpokọtara mpụtara sitere n'ọgbakọ iwu e mere na Lọndọn na Legọọs.
- N'iwu a, a malitere hụwa Gọvanọ dịka Gọvanọ obodo dum, ebe osote ha bụ ndị a kpọrọ ndị Lieutenant Gọvanọ bidoro chiwa na mpaghara Naịjirịa dị icheiche. E hibere ndị isi ụlọomeeiwu ebe niile mana ehibeghị na mpaghara ugwu. Ọ bụ iwu a hibere ndị isi mpaghara dị icheiche na Naịjirịa, ma hibekwa ndị ọrụ ọkaikpe na ndị ọrụ gọọmenti n'ime mpaghara Naịjirịa dịgasị icheiche. Iwu Lyttleton a bụkwa ihe mere e jiri wee hibe ọtụtụ ndị a tụnyere voootu n'ọgbakọ ndị omeeiwu.
- Ọ bụkwa ọgbakọ a ka e mere ka Naịjirịa ji nwerezie nnwereonwe ha n’afọ 1960.

Ebe foto si, Getty Images
- Ka Naịjirịa nwereonwe ha n'afọ 1960, e bidoro na ngwa hazịwaziwe usoro a ga-esi tụgharịa iwu Naịjirịa nke mere e ji wee nwee iwu Naịjirịa 1963.
- N’afọ 1963, Naịjirịa wepụtara iwu ọhụrụ nke mpaghara niile kwetara na ọ ga-abụ iwu ga-achịwazi obodo Naịjirịa.
- Iwu nke 1963 gbadoro ụkwụ n'usoro iwu ndị Briten ebe e nwere otu ụlọomeeiwu a kpọrọ ụdị gọọmenti 'parliament'
Iwu Naịjirịa nke 1979

Ebe foto si, Getty Images
- Iwu Naịjirịa gbanwekwara ọzọ n’afọ 1979 dịka ndị agha weere ọchịchị nke mere ka Brig. Gen. Murtala Rufai Mohammed bụrụzie onyeisiala Naịjirịa nke na osote ya bụ Olusegun obasanjo.
- N'iwu nke 1963 e nwere ọchịchị agba abụọ ebe Sineti nwere mmadụ 56 si mpaghara 12 Naịjirịa. N'afọ 1979 e nwere ndị Senate mmadụ 95, ise si steeti 19 ndị dị mgbe ahụ. N'iwu 1963, iwu a nyere ohere ndị esighi mba Naịjirịa ga-eji bụrụ ndị Naịjirịa site alụmdi na nwunye na obibi na Naịjirịa, mana iwu 1979 nabatara ihe ọkpụrụkpụ dị n'ime iwu ahụ.
Abdulsalami Abubakar 1999

- N’agbanyeghi na e nwere ọtụtụ iwu dịgasị iche iche ndị agha na-achị obodo Naịjirịa tinyegasịrị ka ọchịchị ha na-aga n’ihu, iwu jikọrọ obodo Naịjirịa gbanwere ọzọ n’afọ 1999 n’ọchịchị ọchịagha Abdulsalami Abubakar.
Kedụ ihe ọhụrụ gbanwere n’iwu Naịjirịa site 1963 na nke 1999.
- Atụmatụ ‘Federal Character’.

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Okwu a kachasị kpụrụ n’ọnụ iwu jikọrọ obodo Naịjirịa nke 1999 bụ nnabata atụmatụ ‘Federal Character’. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ usoro gọọmenti etiti hibere iji megide maọbụ gbochie ọganihu ụfọdụ mpaghara dị na ndịda naịjirịa.
Mana kedụ ihe bụ ‘Federal character’, kedụ ihe iwu Naịjirịa kwụrụ maka ya?
Iwu a kwuru na nchịkọta na usoro a ga-esi hibe gọọmenti maọbụ ngalaba gọọmeti ọbụla ga-abụ usoro ga-egosipụta ma wulie ịdịkọ n’otu. Nke pụtara na ọ gaghị abụ n’otu steeti maọbụ otu mpaghara ka ndị niile nọ na ngalaba ahụ ga-esi.
Ọkaiwu Goddy Uwazurike gwara BBC na okwu ‘Federal Character’ a na-ewute ya dịka onye Igbo. Ọ sị na mgbe e chepụtara echiche, na ọ bụ ezigbo ihe ọma. Uwazurike sị na etu e si eme ya na mbụ bụ ndị mpaghara ọbụla wepụta mmadụ ole dị etu a. Mana ọ dịghịzi etu a ugbua. Ọ gara n’ihu kwu na nwa ya chọrọ ịga ụlọakwụkwọ ugbua, ọ sọ ya bụrụ onye nke mbụ n’akwụkwọ, o nwereike onye ikpeazụ agawa n’ihu yanwa gbara nke mbụ. Ọ sị na ọ bụzi mmegbu ka e ji ya eme.
2. Mgbakwunye n’ikike ọchịchị etiti bụ ‘Exclusive legislative list’

Atụmatụ ọzọ na-ebute ndọrọndọrọ bụ nke gbasara ‘Exclusive legislative list’ nke e bugoro site na 45 ruo 68 ma bugokwuo ‘Concurrent Legislative List’ site na 29 ruo 30.
Ọkaiwu Chukwuemeka Eze gwara BBC na e weere ụfọdụ ikike dị iche iche steeti nweburu nyefee ya n’aka ndị ọchịchị etiti. O kwuru na n’ime 30 ahụ dị n’aka ndị steeti, na ọchịchị etiti nwekwara ike itinye aka na ya. Nke a mere ka ndị mmadụ na-ebe akwa na-asị ọ bụ na onye nọrọ na steeti ọbụla ọ nọ, ọ chọọ ihe ọbụla, ọ gawa Abụja, nke a mere ka ọ dị ka ndị steeti a na-agba odibo. (3:05 mins)
3. Etu e si eke ego akụ ọnatarachi obodo na steeti niile.

Ọkaiwu Chukwuemeka Eze kọwara na n’afọ 1963, ihe akụ ọnatarachi nọ n’aka ndị mpaghara buru ibu. Na ọ bụ ha rụpụta, nwete ego, ha enyetụ ndị gọọmenti etiti, jidezie nke fọrọ. Mana ugbua, ihe niile e ji emepụtazi ego nọzi n’aka gọọmenti etiti. Nke a mere ka ndị gọọmenti steeti jizi arịọzi oke arịrịọ n’aka gọọmenti etiti maka obere nsogbu ọbụla ha nwere. Ọ bụ ya mere ụfọdụ ji eti mba, ihe aghasaala, na ọ bụghị etu e si kpaa ya na mbụ. Ụfọdụ na-ekwuzi ka a laghachi azụ na iwu afọ 1963.
4. Iwu gbasara onye nwe ala nke bụ ‘Land use act’.

E hibere iwu ‘Land use act’ nke Naịjirịa n’afọ 1978 mana e tinyere ya n’iwu Naịjirịa nke afọ 1979 ma bufekwaa ya na iwu 1999 iwu.
Iwu a kwuru na ala niile dị na steeti ọbụla ma e wepụ nke gọọmenti etiti maọbụ ụlọọrụ gọọmenti etiti nwe, bụzi gọọmenti steeti ahụ nwe ya.

Ụfọdụ ihe ndị ọzọ gbanwere n’iwu jikọrọ Naịjirịa nke 1963 ma a tụnyere ya nke 1999 gụnyere; ịgbado ụkwụ na afọ ole gọọmenti etiti maọbụ nke steeti nwereike ịnọ n’ọchịchị ka ọ bụrụzie afọ anọ, e mere nke a n’iwu afọ 1979. Nke ọzọ bụkwa na e nwereike ichutu onyeisiala n’ọkwa ya ma ọ bụrụ na a chọpụta na o tozughi ị were oche ya, e kewara ụlọ omeiwu ka ọ bụrụzie ụlọomeiwu ukwu na ụlọ omeiwu nta, na ihe ndị ọzọ.
Mana ruo taa, ọtụtụ ndị mmadụ ka na-akpọ oku ka e yigharịa iwu a jikọrọ obodo Naịjirịa weghachi ya n’iwu nke 1963. Oku a adịghị ka ọ ga-akwụsị na nsonso a mana Ọkaiwu Chukwuemeka Eze gwara anyị na;
“Aka ndị agha ji hibere iwu obodo a bụ ka ihe niile na-aga n’ọchịchị etiti. Naịjirịa na-aza ‘Federal’ n’ọnụ mana etu ha si eme ihe bụ Unitary nke bụ na ikike si otu ebe abịa, ndị nke ọzọ a na-agba odibo. E kwesịrị ịwepụ ụfọdụ ikike dị n’aka gọọmenti (Exclusive legislative list), tinye ya n’ikike ndị steeti (Concurrent Legislative List), ọ ga-adịkwa mma ma e mee ya etu ahụ”.









