Democracy day 2022: Ọ na-echu m ụra mgbe ọbụla m chetara ndị nọ n'aka ndị ntọ na Naijirịa - Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Nigerian Presidency
Olusegun Obasanjo bubu onyeisiala Naịjirịa hibere ụbọchị 'Democracy Day' ka e chetara ndị Naịjirịa ka e si gbapụta n'ọchịchị ndị agha nke afọ iri na anọ.
Ụbọchị a bubụ n'ọnwa Mee 29, maka na Mee 29, 1999 ka onyeisiala bụ onyeisi agha Abdulsalami Abubakar nyefere ọchịchị site n'aka ndị agha ruo n'aka ọchịchị onyekwuouche ya.
Cheta na nke a bịara n'ọnwa iri na otu Onyeisiagha Abubakar natara ọchịchị n'aka onyeisi ya bụ Onyeisiagha Sanni Abacha nke nwụrụ n'ọnwa Juun 8, 1998.
E mere mmemme 'Democracy Day' n'ụbọchị Mee 30 site n'afọ 1999 ruo afọ 2019 mgbe onyeisiala Naịjirịa gbanwere ụbọchị ahụ ruo Juun 12.
Chetakwa na ihe mere e jiri hibe ya bụ ụbọchị a na Juun 12 bụ maka ncheta ụbọchị e mere ntuliaka n'afọ 1993 nke Moshood Kashimawo Olawale Abiola bụ onye meriri ya bụ ntuliaka Onyeisiagha Ibrahim Badamosi Babangida ghụọrọ ọchịchị ka o meriri.
Kedụ nke gbara ọkpụrụkpụ n'ihe Onyeisiala Muhammadu Buhari gwara ndị Naịjirịa?
- Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru na o soro ntuliaka imeụlọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị nọ na Naijirịa mere ma si na obi dị ya ụtọ etu ha siri hazie ya.
- O kwukwara na obi dị ya mma etu ụmụ nwaanyị siri soro na ya bụ emume ntuliaka.
- Buhari kwuru sị, "Anyị na-arụsị ọrụ ike ịhụ na ndị omekome agaghị egbochi onye Naijirịa ọbụla ịtụ vootu ya".
O kwukwar na ọchịchị onye kwụọ uche ya abụghị maka tigbuo zọgbuo
Maka nchekwa o kwuru sị :
- "Anyị na-arụsị ọrụ ike, na agbanyeghị ndị omekome na-a ga-enwe ntụlịaka ziri ezi".
- Buharị rịrọ ndị Naijirịa na mgbasa ozi ya. " Ka anyị tinye ndịmwakpo ndị otu oyiegwu metụtara n'cuhe anyị taa dịka a na-eme emume ọchịchị onye kwuo uche ya".
- O kwukara sị, " Mụ na ndị ọrụ nchekwa na-agba mbọ ịzopụta ndị ka nọ n'aka ndị ntọ
- O kwuru na gọọmentị ga-agba mbọ hụ na ndị nwụrụ n'aka ndị omekome ga-enweta ikpe ziri ezi ma taa ndị kpara ya bụ arụ ikpe ziri ezi.
- Buhari kọweara sị, " Ngwa ọrụ nchekwa anyị zụtara kamgbe afọ atọ erutela anyị aka".
- O kwukwara na gọọmentị eweela ndị mmadụ n'ọrụ iji kwalite ndị nchekwa na Naijirịa.
- Buhari rịọrọ ndị Naijirịa si na ọrụ nchekwa abụghị naani nke gọọmentị ma sị ka ndị hụrụ ihe na ezighị ezi gwa ndị ọrụ nchekwa.
- Na mmechi o kwuru sị, " A ga m etinye uchu n'ichkwa ndị Naijirịa ma hụ na emere ntụliaka kwụ ọtọ".




