Voter registeration: Inec ekwuola nke bụ eziokwu n’okwu mmalite ndebanye aha ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
N’ụbọchị Tuzde, akụkọ pụtara na ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyela ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) iwu ka ha malitekwa ndebanye aha n'akwụkwọ ntuliaka ruo mgbe ọ ga-afọdụ ụbọchị 90 tupu ntuliaka 2023.
Mana ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye gwara BBC Igbo n’ụbọchị Wenezde na ya bụ akụkọ na-efegharị ezighi ezi.
Okoye kwuru sị: "Ihe ụlọikpe ukwu nke Abuja kwuru bụ site n’iwu ntuliaka nke ‘Electoral act 2022’, na Inec enweghị ikike ịkwụsị ndebanye aha mgbe ha kwụsịrị ya."
“Ọkaikpe Inyang Ekwo kwuru na ngalaba nke itoolu, amaokwu nke ise na isii nke iwu ahụ akwadoghi nkwụsị ahụ n’ihi na abali 90 tupu ntuliaka erughi mgbe Inec kwụsịrị ya bụ ndebanye aha"

Ebe foto si, Inec
Okoye gara n’ihu kọwaa na ụlọikpe ukwu nke Abuja emebuola mkpebi n’okwu a n’ụbọchị 13 nke ọnwa Julaị, ebe Ọkaikpe Olajumo kwuru na Inec nwere ikike ịkwụsị ya bụ ndebanye aha.
O kwukwara na Inec ga-agbagha ihe ụlọikpe ukwu kwuru n’ụbọchị Tuzde n’ụlọịkpe mkpegharị.
Dịka o si kwuo, nkwụsị Inec mere bụ maka usoro ọrụ ha nke iwu kwadoro nke sị na Inec ga-agbariri n’anwụ aha ndị debanyerela ọnwa ole m ole tupu e mee ntuliaka.

Nke a bụ ka e nye ọha ohere itinye anya n’akwụkwọ Inec mara ma e nwere ndehie maọbụ mehie ọbụla na ya bụ aha ndị mmadụ debanyere.
Ọ gara n’ihu kwuo na Inec kwụsịkwara ya bụ ndebanye aha na Julaị ka ha nweeike ibipụta akwụkwọ ikike ndị mmadụ n’uju n’oge tupu oge ntuliaka eruo, nke ha na-eme ugbua.
Cheta na Inec kwụsịrị ndebanye aha n'akwụkwọ ntuliaka n'ụbọchị 31 nke ọnwa Julaị, dịka ha kọwara na ọ bụ iji nwee ohere bipụta akwụkwọ ikike ịtụ vootu nke mmadụ niile debanyere aha ha, dịka iwu ntuliaka si kwuo.










