Inec asaala ebubo aghụghọ n'usoro ndebanye aha

Ebe foto si, Festus Okoye/Facebook
Ngalaba na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) apụtala ịgọrọ isi ha n'ebubo otu Coalition of United Political Parties (Cupp) boro ha nke kwuru e nwere ndị abụghị ndị Naịjirịa aha ha dị na ndekọ Inec.
Cupp kwuru na ndị mmadụ gara n'ihu na-edebanye ha ịtụ vootu n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche agbanyeghị na Inec mechịrị atụmatụ a na Julaị.
N'ime ozi ọhụrụ nke Festus Okoye bụ ọnụ na-ekwuru Inec binyere aka, ọ sara ebubo a ma kọwa na ndenye aha na ndekọ Inec kwụsịrị kpam kpam na ngwụcha ọnwa Julai.
O kwukwara ma rue ugbua, o nweghizi onye ọhụru ọzọ e debara aha ya na ndekọ ha.
"Anyị na-elebanye anya n'aha ndị edebara ịma ma ndị mmaọdụ edebanyere aha nke ọma, o nwee ndị etozughi dịka enweghi foto maọbụ afọ, maọbụ njirimara ya, a ga-ewepu aha ha na ya bụ ndekọ" ka o kwuru.
Ihe ọzọ o kwuru bụ na a ga-enwe abalị asaa a ga-ewepụtara ndị ọha mmadụ ndekọ Inec ka ha nweike lee aha ndị edebanyere ma kwupụta ma o nwee nsogbu ọbụla ha nwere.
Ọ rịọrọ ndị mmadụ ka ha nwee ndidi ka ngalaba Inec jiri aka ha wepụta aha Ndị mmadụ ka ha nwee ike kwuputa maọbụrụ na ọ masịghị ha.

Ebe foto si, Getty Images
Occupy Inec: Kedu etu nsogbu Inec si bido?

Ebe foto si, INEC
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Tuzde 13 Sepụtemba ka Inec wepụtara ozi gbasara aha mmadụ nde 1.1 akagburu.
Nke a mere ka ndị mmadụ malite ịkatọ Inec ma na-ebo ha ebubo nrụrụaka.
Inec mechara kọọrọ BBC Igbo ihe mere ha ji wepụ aha ndị ahụ.
“Ndị a anyị kagburu aha ha bụ ndị debanyere aha ha ugboro abụọ nke bụ na ndị a edebanyebuola aha ha n’akwụkwọ anyị n’oge gara aga”.
Ọ kọwara na iji gbochie nghọtate na Inec anaghị anabata ndebanye aha ugboro abụọ.
Mgbe nkọwa nke a pụtachara, ihe onyonyo malitekwara ifesa ebe otu CUPP na-ebo Inec ebubo idenye aha ndị abụghị ndị Naịjirịa n'ime ndekọ ha.
Ebubo mmehie a ndị mmadụ kwuru na Inec mere akpalitela akara mgbasa ozi na soshal midia ọkachasị na Twitter nke isi okwu ya bụ 'Occupy Inec' dịka ndị mmadụ na-adọ Inec na-akwa ma na-ekwu na ha ga-ekwuriri etu mmehee ndị a a na-ebo ha siri dapụta.
Ọ bụ ebubo ahụ ka Inec na-agbagha ugbua.










