Ihe mere Inec jiri kagbuo aha mmadụ otu nde debanyere aha ha ịtụ vootu

Aha onyonyo, Ihe mere Inec jiri kagbuo aha mmadụ otu nde debanyere aha ha itu vootu
Ihe mere Inec jiri kagbuo aha mmadụ otu nde debanyere aha ha ịtụ vootu

Ụlọọrụ na-ahụ maka nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ The Independent National Electoral Commission (Inec) zipụtara ozi tụrụ ọha n’anya nke kwuru na ha kagburu aha ihe ruru otu nde na ụma ndị debanyere aha ha iso mee ntuliaka nke 2023.

N’ozi nke pụtara n’izu a ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye kọwara na ndị a kagburu aha ha bụ ndị mere mmehe n’usoro ndebanye aha a.

Okoye kọwara BBC Igbo n’ụbọchị Wenezde na ọtụtụ ghọtahere ozi ya ma gaa n’ihu kọwa ihe mere e jiri kagbuo aha ndị a.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, o kwuru:

“Ndị a anyị kagburu aha ha bụ ndị debanyere aha ha ugboro abụọ nke bụ na ndị a edebanyebuola aha ha n’akwụkwọ anyị n’oge gara aga”.

Ọ kọwara na iji gbochie nghọtate na Inec anaghị anabata ndebanye aha ugboro abụọ.

Ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye kwuru na nbanye aha ugboro abụọ so n'ihe mere ha jiri kagbuo aha ụfọdụ n'ime ndị a.

Ebe foto si, Festus Okoye/Facebook

Nkọwa foto, Ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye kwuru na nbanye aha ugboro abụọ so n'ihe mere ha jiri kagbuo aha ụfọdụ n'ime ndị a.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ọ gara n’ihu gwaa ndị akwụkwọ ikike itu vootu ha nke a na-akpọ PVC dịzị nkịrịnka ugbua ka ha ghara ịtụ ụjọ ma jide ya bụ PVC gaa tụọ vootu n’ụbọchị ntuliaka n’ihi na aha ndị ahụ ka nọ n’akwụkwọ Inec.

Mana iji saa maka ndị a debanyere aha ha ugboro abụọ, o kwuru na enweghị ngwọta mmehie ugbua ruo oge e mechara ntuliaka 2023.

Okoye kwukwara na aga ebipụta aha ndị a n’uju na ọdịnso ka ọha ghara ịsị na akpapụrụ ha n’iso mee ntuliaka 2023.

Inec na-ahazị mmepụta akwụkwọ ikike ịtụ vootu ndị mmadụ maka ntuliaka 2023 ugbua.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Inec na-ahazị mmepụta akwụkwọ ikike ịtụ vootu ndị mmadụ maka ntuliaka 2023 ugbua.

O kwukwara na Inec nọ n’usoro ihazi aha ndị niile tozuru oke ma debanye aha ha ugbua dịka a ga-ewepụta akwụkwọ ikike ndị mmadụ malite n’ọnwa Ọktoba 2022 ma kwukwa na Inec ga-ezitere ndị mmadụ ozi site n’ekwenti ha nakwa na Ịmealụ ma a hazịchaa akwụkwọ ikike ha.

Okoye sara ajụjụ banyere ebubo ndị na-edebanye aha ha na-etozubeghị oke ma kwuo na usoro ọrụ Inec na-akpachị atụmatụ dị etu a ma kpokuo ọha ka e tinyere ha aka n’inyopụ atụmatụ dị etu a ma gbaa ya n’anwụ.

Maka okwu ndị na-egobi vootu n’oge ntuliaka, o kwuru na Inec na-agba mbọ ịhụ na ndị omeiwu mere iwu ngwa ngwa ga-ata onye ọbụla e jidere ahụhụ dịrị ya.

Na nchịkọta, o kwuru na ọ bụrụ na ndị ụlọomeiwu Naịjirịa enweghi ike binyeaka n’iwu a na ikike ka dịrị ndị ọrụ nchekwa ịnwụchi onye ọbụla e jidere na-azụ vootu n’oge ntuliaka.

Kirie ihe onyonyo a, ka ị nụrụ ihe Okoye kwuru n’uju.