Ndị ntoroọbịa bụ isi sekpụ ntị n'iweta mgbanwe na mba ọbụla - Deji Ige

Aha onyonyo, Mgbe mgbanwe na-abịara mba ọbụla, ọ bụ ndị ntoroọbịa na-ebute ya - Deji Ige odee abụ. Kirie ya n'uju.
Ndị ntoroọbịa bụ isi sekpụ ntị n'iweta mgbanwe na mba ọbụla - Deji Ige

Odee abụ "Let there be Light" bụ Deji Ige, akọọrọla BBC Igbo ihe mere o jiri dee abụ ahụ nke wuru ewu na soshal midịa na Naịjirịa.

Abụ a Deji dere katọrọ mpụ na ihe ọjọọ niile ndị ọchịchị na-eme nke mere ndị ntorobịa ji ewe iwe.

N'ọdị nso a, ndị otu Peoples Democratic Party (PDP) kpọrọ Deji Ige ka ọ bịa gụọ abụ ya n'ọgbakọ ebe onye ji ọkọlọtọ pati ahụ azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa, bụ Atiku Abubakar kpọpụtara osote ya bụ Gọvanọ Ifeanyi Okowa nke Delta steeti.

Ọ bụ n'ọgbakọ ahụ ka Deji nọrọ gụọ abụ 'Let there be light', o wee gbasaa ebe niile ka mkpụrụ ụkpaka.

Deji Ige odee abụ
Nkọwa foto, Deji Ige na-eji abụ ya akatọ ọnọdụ ọjọọ nakwa ọchịchị ọjọọ na Naịjirịa

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Deji kọrọ akụkọ etu o si chọọ ịbanye ọrụ ndị agha Naịjirịa mana anabataghị ya.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ mpụ na aghụghọ dewere Naịjirịa n'ọnọdụ ọ nọ n'ime ya taa.

Ọ sị na ihere emeghị ya, ụjọ atụghị ya ịgwa ndị ndọrọndọrọ okwu etu o si nụọ ya ọkụ n'obi.

Deji Ige

Ebe foto si, Deji Ige/Instagram

Nkọwa foto, Odee abụ "Let there be Light" bụ Deji Ige na-ekwu ihe mere o jiri dee abụ ahụ.

Deji si na o ji abụ ya agwa ndị nọ n'ọchịchị na ndị chọrọ ịbanye ọchịchị ka ha mara ihe ha ga-eme iji dozie Naịjirịa, ka ihe dị mma.

Ọ sị na ndị ntoroọbịa bụ mmanụ e ji achụ mpụ na njọ ọsọ na mba ọbụla, ya mere obi ji dị ya aṅụrị n'oge ngagharịiwe EndSars, mgbe ndị ntorobịa gosiri iwe ha maka mpụ ndị uweojii.

O nyekwara ndụmọdụ ndị ọzọ n'ihe onyoonyo a.