BVAS, IReV... Lee ụzọ dị icheiche ntuliaka 2023 ga-esi pụọ iche na ntuliaka ndị ọzọ

Naịjirịa ahaziela ma mee ntuliaka ugboro ise kamgbe a laghachiri n'usoro ọchịchị onye kwuo uche ya n'afọ 1999. Ntuliaka 2023 ga-abụ nke isii.
N'ime oge ahụ, enweela ọtụtụ mgbanwe n'usoro e si eme ntuliaka dịka oge na-agafe nakwa n'ihi mgbanwe ọgbaraọhụrụ tekinụzụ.
N'ihi nke a, usoro a ga-esi mee ntulaiaka nke afọ 2023 agaghị abụcha otu ihe dịka nke 2019 maọbụ nke 2015.
A ga-enwe ọtụtụ mgbanwe n'usoro nakwa akụrụngwa nke ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission' (INEC) wepụtara maka ntuliaka a.
Akụkọ a bụ iji kọwaara gị usoro ndị ahụ dibu na 2015 nakwa 2019, bụ nke agaghị adịzị na ntuliaka nke 2023.
Bimodal Voter Accreditation System (BVAS)

Igwe BVAS bụ akụrụngwa teknụzụ ọgbaraọhụrụ nke Inec wepụtara iji gbochie nrụrụaka na ntuliaka.
Ọ bụ igwe BVAS ka a ga-eji nyochaa onye ọbụla ga-apụta ịtụ vootu ma lekwaa ma akwụkwọ ikike ịtụ vootu (voter's card) o ji bịa ọbụkwa nke ya n'ezie, ọ bụ nke ọma ya ka ọ bụ nke adịgboroja, nakwa ma onye ahụ ọ nọ n'ebe o kwesịrị ịnọ tụọ vootu.
N'afọ 2019, igwe BVAS adịghị, ihe a nwere bụ nke a na-akpọ 'Smart Card Reader'.
Ihe BVAS ji dị iche na 'Smard Card Reader' bụ na e nwere ike iji ya see onye bịara ịtụ vootu foto iji mata n'ezie ma ọ bụkwa ya nwe 'voter's card' o ji bịa.
Enwekwara ike iji BVAS ziga ozi n'ọba ozi Inec maka mmadụ ole tụrụ vootu n'otu ebe, iji gbochie nrụrụaka.
Agaghị enwe 'incident form'

Ebe foto si, Inec/Twitter
Na ntuliaka nke afọ 2015, ọ bụrụ na aha mmadụ dị n'akwụkwọ ntuliaka, mana igwe 'smart card reader' enweghị ike inyochapụta aha ya n'ụbọchị ntuliaka, onye ahụ ka nwereike ịtụ vootu.
Onyeọrụ Inec ga-eweta akwụkwọ a kpọrọ 'incident form', ebe onye ahụ ga-edebanye aha ya nakwa njirimara ya tupu ọ gaa tụọ vootu.
Na ntuliaka nke 2019, ọ bụrụ na 'smart card reader' amataghị mkpịsịaka onye bịara ịtụ vootu, mana onye ahụ ji PVC na-abụghị nke adigboroja, a ga-enye ya ohere ka o binye aka ya n'akụkụ ebe e dere aha ya n'akwụkwọ ntuliaka, ma detuo akara ekwentị ya, tupu e kwe ka ọ gaa tụọ vootu.
Mana na ntuliaka nke afọ a, agaghịkwa enwe ihe ọbụla dịka 'incident form' maọbụ ohere ebe mmadụ ga-ebinye aka n'akụkụ aha ya na 'voters register'.
Naanị akụrụngwa BVAS ka a ga-eji nyochaa mmadụ ma nye ya ikike tupu ọ tụọ vootu.
Onye ọbụla BVAS na-enweghị ike inyochapụta agaghị enweike ịtụ vootu n'ụbọchị ntuliaka.
Ọba ozi 'Inec Result Viewing (IReV) Portal'

Ebe foto si, Screengrab
Na ntuliaka 2023, ndịọrụ Inec ga-enwe ikike iziga mpụtara ntuliaka site n'ọgbọ ntuliaka ọbụla (polling unit) gaa n'ọba ozi dị n'isi ụlọọrụ Inec.
Onye ọbụla nwere ịntanetị n'ekwentị ya ga-enwekwa ike ịga n'ọbaozi (portal) a ma hụ mpụtara ntuliaka a site n'ebe ọbụla ọ nọ na Naịjirịa; onye ahụ chọọ, ọ ga-enweike ibutu (download) mpụtara ntuliaka ahụ n'ekwentị ya.
Atụmatụ a so n'usoro ọhụrụ nke e tinyere n'akwụkwọ iwu maka nhazi ntuliaka na Naịjirịa nke Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka na ya n'ọnwa Febrụwarị nke afọ 2022.
Nziga mpụtara ntuliaka site n'ịntaneetị
A na-akpọ atụmatụ nke a na bekee bụ 'Electronic Transmission of Results'; iwu ntuliaka nke afọ 2019 akwadoghị ya, mana iwu ntuliaka ọhụrụ nke Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka na ya na 2022, nabatara ya.
Na ntuliaka nke 2019, ndịọrụ Inec na-eji aka ha gụkọọ mpụtara ntuliaka n'ọgbọ ntuliaka niile n'otu n'otu, ma buruzie ngụkọta mpụtara ahụ gawa n'isi ụlọọrụ ha dị n'okpuruọchịchị dị icheiche, ebe a ga-esi buru gaa n'isi ụlọọrụ Inec nke steeti, tupu eburuzie ya gawa n'isi ụlọọrụ Inec dị n'Abuja.
Ọtụtụ na-ekwu na ọ bụ site n'ibugharị mpụtara ntuliaka a site n'otu ebe gaa ebe ọzọ ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-enweta ohere iji mee nrụrụaka.
Mana ugbua, ọ bụ n'ebe a nọrọ tụọ vootu ka a ga-esi ziga mpụtara ntuliaka ahụ gaa n'ọbaozi Inec 'portal', tupu ha eburuzie nke ha ji aka gbakọọ gawa Abuja.















