Gịnị nwereike ime ka a kagbuo maọbụ yigharịa ụbọchị ntuliaka 2023?

Ndị ọrụ Inec

Ebe foto si, Getty Images

N'ọdị nso a, ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ 'Independent National Elctoral Commission' (Inec), ekwuola ugboro ugboro na ọnọdụ nchekwa ọjọọ dị n'ọtụtụ mpaghara Naịjirịa ugbua nwere ike imetụta ntuliaka 2023.

N'ụbọchị itoolu nke ọnwa Jenụwarị 2023, n'otu ọgbakọ ndị Inec na ndị ọrụ nchekwa nwere n'Abuja, ka otu n'ime ndị isi Inec bụ Abdullahi Zuru kwuru na "ọ bụrụ na ọnọdụ nchekwa ọjọọ dị na Naịjirịa ugbua akwụsịghị, o nwereike ime ka a kagbuo maọbụ yigharịa ntuliaka na mpaghara dị icheiche, nke ga-eme ka a ghara ịkpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ, nke a ga-ebutekwa ọnọdụ bekee kpọrọ 'constitutional crisis".

Mana Zulu, onye nọchitere anya onyeisioche Inec bụ Mahmood Yakubu n'ọgbakọ ahụ, gara n'ihu kwe nkwa na "Inec na-eme ihe niile anyị nwere ike iji hụ na ndịọrụ nakwa akụrụngwa a ga-eji rụọ ọrụ n'ụbọchị ntuliaka nwere ezi nchekwa."

mana n'agbanyeghị nkwa a, ọtụtụ ndị mmadụ amalitela ịtụ uche ma a ga-akagbu maọbụ yigharịa ntuliaka 2023, nakwa ihe nwere ike ime ma ọ dị otu a.

Ihe iwu kwuru maka nkagbu ntuliaka

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Presidency

Nkọwa foto, Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka n'iwu ọhụrụ 'Electoral Act' n'ọnwa Febrụwarị afọ 2022.

Iwu ọhụrụ a kpọrọ 'Electoral Act' 2022 bụ iwu Inec gbasoro iji hazia ntulaiaka 2023.

Ya bụ iwu kwuru kpọmkwem ihe Inec ga-eme ma ọ bụrụ na e nwee ọnọdụ gbatagbata maọbụ enweghị udo.

Ngalaba 24, agba nke abụọ nke 'Electoral Act' kwuru na "ọ bụrụ na etinyela ụbọchị ntuliaka ga-adị, ma nwee ihe akaebe gbara ọkpụrụkpụ gosiri na ọgbaaghara nwereike ịda ma ọ bụrụ na ntuliaka gaa n'ihu n'ụbọchị ahụ, maọbụ na ntuliaka agaghị enwe isi n'ihi ọdachi sitere na chi (natural disaster) maọbụ kwanụ ọnọdụ gbatagbata ndị ọzọ, Inec ga-eyigharị ntuliaka ma kwuo ụbọchị ọzọ a ga-eme ntuliaka na mpaghara ebe ya bụ ọdachi metụtara, mana nyigharị ahụ ga-abụrịrị n'ihi ihe siri ike, doro onye ọbụla anya".

Electoral Act

Ebe foto si, Screengrab

Agba nke atọ nke ngalaba 24 nke 'Electoral Act' kwuru na "ọ bụrụ na ntuliaka amalitela tupu e nwee ihe merenụ iji kwụsị ya n'otu 'polling unit' maọbụ n'otu mpaghara, maọbụ ọ bụrụ na ntuliaka enweghị ike ịga n'ihu n'ihi ọgbaaghara maọbụ enweghị nchekwa metụtara ndịọrụ nakwa akụrụngwa e ji eme ntuliaka, Inec ga-eyigharị ntuliaka ahụ ma kwuputa ụbọchị ọzọ a ga emetọpụ ntuliaka na mpaghara ahụ".

Ọ bụrụ na e yigharia ntuliaka n'ihi ọgbaaghara maọbụ enweghị nchekwa, iwu 'Electoral Act' kwuru na agaghị akpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ ruo mgbe a ga-emecha ntuliaka na mpaghara niile ahụ ebe e yigharịrị ya.

Mana ọ bụrụ na ọnụọgụgụ ndị niile kwesịrị ịtụ vootu na mpaghara ebe ahụ e yigharịrị ntuliaka agaghị emetụta mpụtara ntuliaka ahụ niile, Inec nwere ikike ịkpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ, n'agbanyeghi ebe ndị ahụ eyigharịrị ntuliaka.

Ụdị ihe a o mebuola mbụ?

Attahiru Jega
Nkọwa foto, Na 2015, Attahiru Jega bụ onyeisioche Inec yigharịrị ụbọchị ntuliaka dịka ọ fọrọ naanị otu izuụka

N'afọ 2015, Inec kwuru na ntuliaka ga-abụ n'ụbọchị 14 na 28 nke ọnwa Febrụwarị afọ ahụ, mana n'ihi ọnọdụ nchekwa nke Inec kwuru na ọ gaghị enye ha ohere ịhazi ntuliaka nke ọma, onyeisioche Inec n'oge ahụ bụ Attahiru Jega, yigharịrị ụbọchị ntuliaka ka ọ bụrụzie ụbọchị 28 nke ọnwa Maachị na ụbọchị 11 nke ọnwa Eprel 2015.

Ọ bụ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Febrụwarị, oge ọ fọdụrụ naanị otu izuụka tupu ụbọchị ntuliaka, ka Jega kwuputara nyigharị a.

Jega kwuru na nyigharị ahụ bụ iji nye ohere ka ndịọrụ nchekwa gbasie mbọ ike iwulite ọnọdụ nchekwa iji nye ohere ka ntuliaka gaa n'ihu na-enweghị ọdachi ọbụla.

Ihe gọọmentị etiti na-ekwu banyere ntulaiaka 2023

Lai Mohammed

Ebe foto si, Lai Mohammed

Gọọmentị etiti na-ekwe nkwa na onweghị ihe ga-eme ka e yigharịa ụbọchị ntuliaka nke afọ a bụ 2023.

Mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Mohammed, n'ụbọchị Tuzde, Jenụwarị 10, kwuru na gọọmentị etiti ka kwudosiri ike na mkpebi ha nke bụ na ntuliaka 2023 ga-aga n'ihu etu e si hazie ya.

"Onwebeghị ihe ọbụla merenụ nke anyị ga-eji gbanwee mkpebi anyị," Lai Mohammed kwuru.

"Anyị ma na Inec na ndị ọrụ nchekwa dị icheiche na-arụsi ọrụ ike ịhụ na ntuliaka gara nke ọma na mpaghara Naịjirịa niile."

"Ndị ọrụ nchekwa na-ekwekwa ụmụ Naịjirịa nkwa na ha na-agba mbọ ole ike kwere ha ịhụ na udo ga-adị n'oge ntuliaka. Ya mere, ụjọ ọbụla adịghị."